Gaa na ọdịnaya

Condoleezza Rice

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Condoleezza Rice
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha n'asụsụ obodoCondoleezza Rice Dezie
Aha enyereCondoleezza Dezie
Aha ezinụlọ yaRice Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Novemba 1954 Dezie
Ebe ọmụmụBirmingham Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish, Russian, French, Spanish, Latin Dezie
Asụsụ ọ na-edeEnglish Dezie
Ụdị ọrụ yapolitical science, Pọlitiks, diplomacy Dezie
Onye were ọrụStanford University Dezie
Ọkwá o jiUnited States Secretary of State, United States National Security Advisor Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Denver, University of Notre Dame, Josef Korbel School of International Studies Dezie
PrọfesọDenning Professorship in Global Business and the Economy Dezie
Ogo mmụtaPh.D. Dezie
Ebe ọrụStanford Dezie
MmekoStanford University Political Science Department, Stanford Graduate School of Business Dezie
Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịRepublican Party (United States) Dezie
AgbụrụNdi Afrika nke Amerika Dezie
Okpukpere chi/echiche ụwaProtestantism Dezie
Ngwa egwuPiano Dezie
Onye òtù nkeAmerican Academy of Arts and Sciences, Phi Beta Kappa Society Dezie
Webụsaịtịhttps://profiles.stanford.edu/condoleezza-rice Dezie

Condoleezza "Condi" Rice (amụrụ na November 14, 1954) bu onye omekorita America na onye sayensi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke jere ozi dị ka odeakwụkwọ steeti 66th United States site na 2005 ruo 2009. Kemgbe 2020, ọ na-eje ozi dị ka onye isi 8th nke Hoover Institution nke Stanford University [en]. Onye so na Republican Party, Rice bụ nwanyị mbụ onye Afụrịka-American odeakwụkwọ nke steeti. Tupu mgbe ntuli aka nke Barack Obama dị ka onyeisi oche na 2008, Rice na onye bu ya ụzọ, Colin Powell, bụ ndị Africa America kachasị elu na akụkọ ihe mere eme nke ngalaba gọọmentị etiti.

Ndụ mbido ya

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Rice na Birmingham, Alabama [en] nye ndị nkuzi, a na kowa n'usoro ọmụmụ ya bụ Cameroon.[1]

Na 1967, ezinụlọ ya kwagara Colorado wee malite ịgụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ Katọlik wee gaa na University of Denver [en]. Ọ gụsịrị akwụkwọ na 1975 na University of Notre Dame [en] na MBA na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị wee malite ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya.[2]

Ọ rụrụ ọrụ na State Department n'okpuru ọchịchị Carter wee jee ozi na National Security Council n'oge ọchịchị George H. W. Bush [en]. [3]

Rice mechara gbasoo mkpakọrịta agụmakwụkwọ na Mahadum Stanford, ebe ọ jere ozi dị ka provost site na 1993 ruo 1999.[4]

Na Disemba 17, 2000, ọ sonyere na nchịkwa George W. Bush [en] dị ka onye ndụmọdụ nchekwa obodo. N'okwu nke abụọ Bush, ọ nọchiri Colin Powell dị ka Secretary nke State, si otú ahụ ghọọ nwanyị mbụ Afrika-American na nwanyị nke abụọ mgbe Madeleine Albright gachara n'ọkwa a.[4]

N'ịgbaso nkwenye ya dị ka odeakwụkwọ nke steeti, Rice sụrụ ụzọ n'iwu nke Transformational Diplomacy na-eduga n'ịgbasa ọnụ ọgụgụ ndị ọchịchị onye kwuo uche ya na ụwa na karịsịa na Middle East.[5][6]

Rice laghachiri na Mahadum Stanford dị ka onye prọfesọ sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na na Septemba 2010, ọ ghọrọ onye nkuzi nke Stanford Graduate School of Business na onye nduzi nke Global Center for Business and the Economy. Na Jenụwarị 2020, a mara ọkwa na Rice ga-anọchi Thomas W. Gilligan [en] dị ka onye isi na-esote Hoover Institution na Septemba 1, 2020. Ọ nọ na Board of Directors of Dropbox na Makena Capital Management, LLC.[7][8][9][10]

Ndụ nke onwe na ihe nketa

[dezie | dezie ebe o si]

Forbes họọrọ Rice na 2005 dị ka nwanyị nke abụọ kachasị ike n'ụwa mgbe Angela Merkel gasịrị, a na-akwanyere ya ugwu n'etiti ndị isi ojii na ndị Afụrịka-America.[11][12]

Rice alụbeghị di ma ọ nweghịkwa nwa.N'afọ ndị 1970, ọ gbara akwụkwọ ma soro onye egwuregwu bọọlụ America nwee obere oge mana o mechara hapụ ya.[13]

Nne Rice, Angelena Rice, nwụrụ n'ọrịa ara ara na 1985 mgbe nna ya, John Wesley Rice nwụrụ na 2000.[14][15]

Ntụaka

[dezie | dezie ebe o si]