Gaa na ọdịnaya

Crispin Adeniyi-Jones

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Crispin Curtis Adeniyi-Jones (1876-1957) bụ dọkịta Naijiria nke nwere ihe nketa na Sierra Leone na onye isi nchịkwa mbụ nke ebe mgbaba dị na Yaba. Ọ ghọrọ otu n'ime ndị isi na-ahụ maka mba Naịjirịa dịka onye òtù, emesịa ọ bụrụ onye isi oche nke Nigerian National Democratic Party. Ọ bụkwa onye òtù kansụl omeiwu nke Naịjirịa ogologo oge ma jee ozi na kansụl ahụ site n'afọ 1923 ruo 1938. Ewezuga ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, ya na Winifred Tete-Ansa nke National Congress of British West Africa jikọrọ aka iji chepụta ụkpụrụ akụ na ụba iji belata ụfọdụ nsogbu akụ na ụba na-apụta na West Africa.

Mmalite Ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Crispin Adeniyi-Jones na Freetown, nne na nna ya bụ ndị Sierra Leone Creole. Ọ gara Sierra Leone Grammar School maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya wee nweta nzere mahadum ya na Mahadum Durham na Trinity College Dublin. Ọ malitere ịrụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ Rotunda Hospital, Dublin, ma mesịa bụrụ onye mmụọrụ n'okpuru Sir Rubert Boyce, onye dọkịta ama ama na Liverpool School of Tropical Medicine. Ọ hapụrụ Britain gaa Naịjirịa n'afọ 1904 wee rụọ ọrụ n'ụlọ ọrụ ahụike gọọmentị na Lagos. Otú ọ dị, iwu emebere nke sitere n'atụmatụ igbochi ọganihu nke ndị dọkịta si Africa n'ọrụ ahụike yana enweghị ego n'ọtụtụ ngalaba belatara ụfọdụ ịnụ ọkụ n'obi mbụ ya. Ka o sina dị, a họpụtara ya dịka onye nduzi mbụ nke ebe mgbaba dị na Yaba, otu n'ime ebe mgbaba abụọ dị na Naịjirịa n'oge ahụ. N'afọ 1914, ọ hapụrụ ọrụ gọọmentị wee malite ụlọ ọgwụ onwe onye na-aga nke ọma na Lagos.

Ịhụ mba n'anya

[dezie | dezie ebe o si]

NNDP na kansụl omeiwu

[dezie | dezie ebe o si]

Na 24 Jun 1923, Adeniyi-Jones, Eric Moore na Egerton Shyngle sonyeere Herbert Macaulay na Thomas Jackson iji guzobe òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigerian National Democratic Party, nke a makwaara dị ka NNDP. Òtù ahụ gbadoro ụkwụ n'atụmatụ ikwe ka a na-enwe ndị nnọchiteanya a họpụtara ahọpụta site n'ime ntuli aka banye na kansụl omebe iwu, zọọ ịbanye n'oche atọ emere makaNdị Afrịka na Lagos. Adeniyi-Jones zọtara otu oche na kansụl ahụ n'afọ 1923 ma jee ozi na kansụl ahụ ruo ihe dị ka afọ iri na ise. Dị ka onye òtù kansụl omebe iwu, ọ ňụrụ ya dịka iyi ịgbachitere ọdịmma nke ụmụ amaala Afrịka site n'isonye n'arụmụka ya na ndị òtù ndị ọzọ n'ihe gbasara atụmatụ iwu dị mkpa dị ka omume nke Ọchịchị na-apụtaghị ìhè na ịjụ ọtụtụ ajụjụ banyere iwu ọchịchị na uru ya nye ndị Afrịka. Mgbe ụfọdụ, ọ na-emegide iwu ọchịchị nke na-emetụta ndị Naijiria n'ozuzu. O wetara atụmatụ mba nke pati ahụ n'ebe ọha na eze nọ ma rụọ ụka maka uru nke ụkpụrụ na omenala ọdịnala karịsịa ndị na-emetụta nhọrọ nke ndị isi ọdịnala.

Dịka onye akaebe maka ụfọdụ n'ime iwu iji belata ọrụ ndị Afrịka n'ọrụ gọọmentị, ọ kwalitere nsonye ndị Afrịka n'ọrụ gọọmenti ma chọọ mmụba na ọganihu nke ndị Afrịka n'ọrụ ahụ. Ọ kwadokwara ka e mepụta ụlọ akwụkwọ praịmarị ndị ọzọ, mbelata nke enweghị nhata mpaghara na nhazi koko na mwepụ nke ọtụtụ ụlọ ikpe mpaghara.

Nnyocha na mmepe akụ na ụba

[dezie | dezie ebe o si]

Adeniyi-Jones rụrụ ọrụ dị mkpa dị ka onye mweta ego na onye isi oche nke ụlọ ọrụ ole na ole e guzobere na ngwụcha afọ 1920 na 1930. Ọ bụ onye isi oche nke Nigeria Mercantile Bank ma bụrụkwa onye isi mweta ego nke West African Co-operative Producers Limited. Ụlọ ọrụ abụọ ahụ bụ akụkụ nke usoro akụ na ụba siri ike, iji mepụta ọnọdụ dị elu maka ụmụ amaala Afrịka n'ime Alaeze Ukwu Britain. Tupu narị afọ nke iri abụọ, nnukwu ọrụ akụ na ụba nke ndị òtù amaala Naijiria dị iche iche ka echebere n'ebe ọ dị ukwu site na akụ na ụba ụwa. Mana site na mpụta nke usoro akụ na ụba nke ndị ọchịchị na West Africa, nsogbu ndị na-emetụta ndị na-emepụta ihe n'Africa malitere ịpụta. Winifried Tete-Ansa, nwoke Krobo sitere na National Congress of British West Africa, bụ otu nnukwu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Ghana, mere atụmatụ tara ọ̀chị̀chị̀ ime ihe iji gbochie ma kpochapụ nsogbu ndị ahụ. Ọ bụ nwoke maara nke ọma ụkpụrụ na ntọala nke ụlọ ọrụ akụ na ụba ụwa. Atụmatụ ime ihe ahụ bụ ịmepụta ụlọ ọrụ ndị Afrịka ka ha bụrụ ụlọ ọrụ azụmaahịa na-achịkwa n'Africa. Ụfọdụ n'ime ụlọ ọrụ ndị e guzobere bụ West African Co-operative Producers, nke Adeniyi-Jones na ụlọ akụ Nigeria Mercantile nke Adeniji-Jones bụ onyeisi ya kwadoro n'ego. Ụlọ ọrụ abụọ ndị ahụ erughị ebumnobi ndị guzobere ya mana ọ tọrọ ntọala siri ike maka ọrụ ndị ọzọ. Akinola Maja, T.A. Doherty na H.A. Subair, ndị bụcha ndị nduzi nke ụlọ akụ ahụ mechara pụọ iji guzobe ụlọ akụ mba nke Naịjirịa, ụlọ akụ mbụ nwere ihe ịga nke ọma na British West Africa.

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]