Dachung Musa Bagos

Dachung Musa Bagos (amụrụ na 4 June 1977) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụ onye otu Peoples Democratic Party si Plateau State, Naijiria. Ọ bụ onye otu ulo omebe iwu etiti Naijiria [1] si Jos South / Jos East federal constituency nke Plateau State na 9th National Assembly. A họpụtara ya n'ụlọ 2019.[2][3] A họpụtara Bagos ọzọ n'ime Ụlọ Ndị Nnọchiteanya nke Federal maka oge nke abụọ na ntuli aka nke afọ 2023. [4][5]
Mmụta
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Ekan Primary School, ọ nwetara agụmakwụkwọ ukwu na Jos Development Enterprise Commercial School ebe ọ natara diplọma na Secretariat Administration.[6] Dachung garakwara na Mahadum nke Jos ebe ọnwetara diplọma na ihe mgbasara iwu ma mechaa, Jos ECWA Theological Seminary iji gbasaa ụdị agụmakwụkwọ na ihe ọmụma ya. [7]
Ndụ onwe onye na ọrụ ebere
[dezie | dezie ebe o si]Iji melite ogo agụmakwụkwọ nke ndị otu ya, Honorable Dachung Musa Bagos enyewo ụlọ klas abụọ nke oge a nwere ọfịs, ụlọ ahịa na ike anyanwụ maka ụmụ akwụkwọ nke Gwandang LEA Primary School, Bukuru-Gyel nke Jos South LGA nke Plateau State.[8] Ọ kwụrụ ụgwọ ụlọ akwụkwọ maka ụmụ akwụkwọ nwanyị nke Government Technical College Bukuru ma kesaa ọtụtụ narị akwụkwọ mmega ahụ nye ụmụ akwụkwọ nke ụlọ ọrụ ahụ. [9] Ntọala ya, Dachung Musa Bagos Foundation enyewo ụmụ akwụkwọ 598 nke Government Secondary School Godong na Jos East LGA, na Government Secondary school Chugwi na Jos South LGA.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- People's Democratic Party (Nigeria)
- Steeti Plateau
- Nzukọ Mba (Nigeria)
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ National Assembly Federal Republic of Nigeria (en-GB). nass.gov.ng. Retrieved on 2021-07-16.
- ↑ Dachung Bagos Makes it to Reps (en-GB). orderpaper.ng (22 April 2019). Archived from the original on 13 July 2021. Retrieved on 2021-07-14.
- ↑ Nigerian House of Representatives, Members of House of Representatives in Nigeria :: Nigeria Information & Guide. www.nigeriagalleria.com. Retrieved on 2021-03-05.
- ↑ Nseyen (2023-02-27). Election results: PDP’s Bagos wins Jos South/Jos East Federal Constituency seat (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2023-06-29.
- ↑ Nseyen (2023-02-27). Election results: PDP’s Bagos wins Jos South/Jos East Federal Constituency seat (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2023-07-07.
- ↑ Dachung Musa Bagos (en-GB). sunnewsonline.com. Retrieved on 2021-07-14.
- ↑ Dachung Bagos Profile (en-GB). accountablenigeria.org. Archived from the original on 2021-07-13. Retrieved on 2021-07-14.
- ↑ Lawmaker Commissions 2 Modern Classrooms In Jos South.
- ↑ Plateau House of Rep. Member, Hon. Bagos Dachung Pays School Fees for All Female Students of BUTECH, Distributes Books to Students (21 March 2020). Archived from the original on 8 December 2022. Retrieved on 17 July 2025.