Deola Sagoe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Deola Sagoe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdeola Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaỌgọọst 1966 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ondo Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye mmebe ejiji Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, University of Miami Dezie
ogo mmụtabachelor's degree Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1989 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
webụsaịtịhttp://deolasagoe.co/ Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Deola Sagoe bụ nwaafọ Naijiria na-ewu ewu bụ onye na-emepụta eyimeyi,nke si Ondo Steeti, na Naịjirịa.

Mbido ndụ na Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adeola Sagoe (nke a mụrụ dịka Ade-Ojo) n'afọ 1966 [1] dị ka nwa mbụ nke Chief Micheal Ade-Ojo, onye guzobere Mahadum nke Elizade na nwunye mbụ ya, Mrs. Elizabeth Wuraola Ade-Ojo. Ndị mụrụ ya sitere n’obodo Ilara-Mokin,dị na Ondo Steeti . Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Miami na Mahadum nke Legos ma nweta nzere masta na ego na njikwa.  [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (June 2018)">see okwu dị mkpa</span> ]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Sagoe malitere i mepụta eyimeyi n'afọ 1989 ma nweta mmata mba ụwa maka ụdị ọmarịcha eyimeyi dị icheiche o mepụtara. N'oge na-adịbeghị anya, a họpụtara ya ị nọchite anya Naịjirịa na kampeenu mba ụwa ọhụrụ nke United Nations World Programme haziri. Mgbasa ozi a, nke akpọrọ “Catwalk the World: Fashion for Food.”, bidoro na Naịjirịa n’ọnwa Eprel afọ 2006 were mee mmemme na Gana n’oge na-adịbeghị anya nke wetara ndị a ma ama dịka Damon Dash, nwunye ya, onye mmepụta aha ya bụ Rachel Roy, na onye mmepụta a mụrụ na Gana bi na Lọndọn bụ Ozwald Boateng . Ebumnuche kampeenu a bụ ị kpata ego i ji belata ọnụ ọgụgụ ndị agụụ na-agụ n'ụwa, ọkachasị ụmụaka, tupuu afọ 2015 eruo. Sagoe na-egosiputakrị nchịkọta eyimeyi ya na Cape Town Fashion Week ma bụrụ onye ọbịa a kpọrọ na New York Fashion Week n'oge gara aga. Sagoe kpughere mkpokọta Komole ya n'afọ 2018, ọ bụ nhọrọ nke agbamakwụkwọ na uwe nke oge na-adọrọ n'ọnọdụ na nkwenye nke sitere n'ezinụlọ eze. [2] Sagoe e ritela “Africa Designs” na MNET / Anglo Gold African designs 2000 nke Andre Leon Tally, onye editọ US Vogue họpụtara y<i id="mwIQ">a</i> [3]

Ọrụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Deola pụtara n'ihe nkiri nke afọ 2014 bụ October 1 ebe e gosipụtara ya dị ka Funmilayo Ransome-Kuti[ <span title="This claim needs references to reliable sources. (June 2018)">see okwu dị mkpa</span> ]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Deola Sagoe lụrụ Kofi Sagoe n'agbanyeghị na di na nwunye ahụ kewara n'ihi esemokwu na-ekweghị mkpezi. O nwere ụmụ nwanyị atọ, Teni, Aba na Tiwa.  [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (June 2018)">see okwu dị mkpa</span> ]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Official website