Destination Biafra
Destination Biafra bụ akwụkwọ akụkọ nke afọ 1982 nke onye edemede Naijiria Buchi Emecheta dere, nke Allison na Busby bipụtara na London. A na-ewere ya dị ka akụkọ nke onwe Emecheta, banyere Agha Biafra. E mechara biputakwa Destination Biafra ozo na 1 Machị 1994 site na Heinemann Educational Books dị ka akụkụ nke ndi odeakwukwo mbauwa Africa [1] [2] [3][4]
Atụmatụ
[dezie | dezie ebe o si]Debbie Ogedemgbe, nwa nwanyị nke minista gọọmentị Naijiria rụrụ arụ, Mara ndị mụrụ ya aka n’isi site n'ịbanye n'usuu ndị agha nke Naijiria. Nke megidere ihe ochere banyere onwe ya na banyere ọrụ ya dị ka nwanyị Naijiria ọdịnala na ọchịchọ ya isonye na agha Biafra gosiputara ọgụ na-aga n'ihu gburugburu ya.
Ihe Nketa
[dezie | dezie ebe o si]N'ịtụleghachi akwụkwọ akụkọ ahụ na 2023, Ijedike Jeboma kwubiri, sị: "Kemgbe e bipụtara Destination Biafra, ọtụtụ ndị edemede Naijiria enyewo aka na akwụkwọ Agha Biafra. N'afọ ndị na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị edemede a emeela ya na obere ahụmịhe onwe ha banyere agha Biafra, site na ebe obibi ha na mpụga Naijiria. Site na Chimamanda Ngozi Adichie ruo Uwem Akpan, igwupụta ihe ncheta nke ihe nketa niile eketa abụrụla isi na ịkọ akụkọ Biafra....[5]
Edensede
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Ryan. "Destination Biafra by Buchi Emecheta", Washington Post, 5 September 1982.
- ↑ Jilani (2021). "Gender and the politics of war historiography in Buchi Emecheta's Destination Biafra". The Journal of Commonwealth Literature. DOI:10.1177/00219894211031803.
- ↑ Adams (2001). "It's a Woman's War: Engendering Conflict in Buchi Emecheta's Destination Biafra". Callaloo 24 (1): 287–300. DOI:10.1353/cal.2001.0001.
- ↑ Unnithan (2018). "'The New African Woman': A Study on Buchi Emecheta's Destination Biafra as a Personal War for Womanhood". Journal of African American Studies 22 (2–3): 274–285. DOI:10.1007/s12111-018-9407-7.
- ↑ Writing from the collective memories of others. The Republic (20 July 2023). Retrieved on 24 March 2024.