Gaa na ọdịnaya

Dianne Edwards

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Prọfesọ Dianne Edwards CBE, FRS, FRSE, FLS, FLSW (amụrụ n'afọ 1942 ) bụ palaeobotanist, onye na-amụ banyere ịchịkọta ala site na osisi, yana mmekọrịta osisi nke ala mbụ.

Oge ọ malitere

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Edwards na Swansea, South Wales, ma nọrọ ọtụtụ oge ya na bungalow nne na nna ya na Gower Peninsula.[1]

Ọrụ Edwards lekwasịrị anya na fossils mbụ nke osisi, nke a chọtara ọtụtụ n'ime ha na UK. Mmasị ya na ihe ọkụkụ ndị mbụ malitere mgbe ọ mụchara ihe ọkụkụ nke echekwara na akụkụ atọ na mineral pyrite (ọlaedo ndị nzuzu).

Mmasị ya na ihe ọkụkụ ndị mbụ malitere mgbe ọ mụchara ihe ọkụkụ nke echekwara na akụkụ atọ na mineral pyrite (ọlaedo ndị nzuzu)

Edwards bụ Prọfesọ Nnyocha A Ma Ama, na onye bụbu Onye isi ụlọ akwụkwọ n'ime School of Earth and Ocean Sciences, na Mahadum Cardiff . [2][3]

Ọ bụkwa Fellow nke Royal Society, Fellow nke Royal Society nke Edinburgh, onye na-asọpụrụ na Mahadum Wales, Swansea, onye nnọchi anya nke Botanical Society of America, ma nwee njikọ na China, na-enye ndụmọdụ maka Beijing Museum of Natural History, ma na-arụ ọrụ na fossils sitere na mba ahụ.

Ihe ndị a chọpụtara

[dezie | dezie ebe o si]

  N'etiti ọrụ Edwards kachasị ama, bụ nchọpụta nke anụ ahụ vascular na Cooksonia, [4] nkọwa na nyocha nke stomata na osisi ala mbụ, [5] na osisi ndị yiri liverwort. [6] Ọdịdị nke ọtụtụ n'ime ọkpụkpụ ya enyerela ya aka igosi na ọkụ ọhịa mere n'oge Siluruan.[7] Ọ rụkwara ọrụ n'ọtụtụ fossils dị omimi dịka Nematothallus, Tortilicaulis na Prototaxites.[8][9][10]

Ọ bụ onye edemede ma ọ bụ onye edemedo nke ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke aha osisi nke fossil, dị ka Danziella D.Edwards (2006) na Demersatheca C.-S. Li & D.Edwards (1996) .

Ihe ndị e ji mara ya

[dezie | dezie ebe o si]
  • A họpụtara ya ka ọ bụrụ Onye otu Royal Society na 1996.
  • Onye isi oche nke Palaeontological Association, 1996-1998.[11]
  • E nyere ya CBE maka Ọrụ na Botany na 1999. [12]
  • Onye nlekọta nke Natural History Museum, London.
  • 2004 onye mmeri nke Lyell Medal. [13]
  • Onye guzobere Fellow nke Learned Society of Wales na July 2010 a họpụtara ya dị ka osote onye isi oche ya maka sayensị, teknụzụ na ọgwụ.[14]
  • Onye isi oche nke Linnean Society nke London, 2012-2015.
  • PhD honoris causa na Faculty of Science and Technology na Mahadum Uppsala, Sweden, kemgbe afọ 2014.[15]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Walton (27 March 2012). Prof. Dianne Edwards. BBC – Wales – Radio Wales – Science Cafe. Retrieved on 29 October 2015.
  2. "Professor Dianne Edwards - People - Cardiff University", Cardiff University. Retrieved on 2018-09-11. (in en)
  3. Professor Dianne Edwards CBE PhD, ScD(Cantab) FRSE, FLS, FLSE, FLSW, FRS. WISRNet, Women in Science Research Network (2015).
  4. Edwards, D. (1992). "A vascular conducting strand in the early land plant Cooksonia". Nature 357 (6380): 683–685. DOI:10.1038/357683a0. 
  5. Edwards, D. (1998). "Stomata in early land plants: an anatomical and ecophysiological approach". Journal of Experimental Botany 49 (Special Issue): 255–278. DOI:10.1093/jexbot/49.suppl_1.255. 
  6. Edwards, D. (1995). "Hepatic characters in the earliest land plants". Nature 374 (6523): 635–636. DOI:10.1038/374635a0. 
  7. Glasspool, I. J. (2004). "Charcoal in the Silurian as evidence for the earliest wildfire". Geology 32 (5): 381–383. DOI:10.1130/G20363.1. 
  8. Edwards, D. (1984). "Cuticles of Nematothallus: a further enigma". Botanical Journal of the Linnean Society 88 (1–2): 35–54. DOI:10.1111/j.1095-8339.1984.tb01563.x. 
  9. Edwards, D. (1979). "A late Silurian flora from the Lower Old Red Sandstone of south-west Dyfed". Palaeontology 22: 23–52. 
  10. Burgess (1988). "A new Palaeozoic plant closely allied to Prototaxites Dawson". Botanical Journal of the Linnean Society 97 (2): 189–203. DOI:10.1111/j.1095-8339.1988.tb02461.x. 
  11. (2017) PalAss at 60. The Palaeontological Association, 34. 
  12. "No. 55513", The London Gazette (Supplement), 12 June 1999, p. 8.
  13. Lyell Medal winners. The Geological Society.
  14. Founding Fellows. Learned Society of Wales. Retrieved on 15 July 2015.
  15. Hans Rosling one of four new honorary doctors at Faculty of Science and Technology – Uppsala University, Sweden. uu.se. Retrieved on 3 February 2016.