Gaa na ọdịnaya

Dimitrie Ralet

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dimitrie Ralet

 

Dimitrie Ralet (a na-akpọkwa Rallet, Ralett, Ralleti maọbu Raletu; Cyrillic: Дімітріє Ралєт, Раллєтȣ, or Раллєтi; c. 1816 – 25 October 1858) bụụrụ onye a ma ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Moldavia nakwa onye a na-asọpụrụ maka ntinye ya na akwụkwọ ọgụgụ Romania. Onye so na ndị nwe obodo na boyardom, o si n'agbụrụ Phanariote na Aromanian, nwee ike ọ bụrụ na amụghị ya na Moldavia; akụkọ ihe mere eme gbasara ezinụlọ ya, ọbụnadị ihe ndị megasịrị n'oge ọmụmụ ya na mgbé ọ bụ nwata, ka na-agbagwojukwa anya ma bụrụ nke a ka na-agbagha. Nna ya, Alexandru Ralet nke Spatharios, bụụrụ onye ọkaiwu n'obodo Moldovia dị na mgbago ugwu mepere emepe bụ Botoșani, nakwa onye nwe Bucecea town. Bụ onye ọ dịka ọ gara akwụkwọ na mba ofesi, onye na-asụlarị ọtụtụ asụsụ mgbe ọ ka dị n'afọ ndị iri abụọ ya, Dimitrie nọchiri nna ya n'ọrụ n'ụlọ ikpe na 1841— ma rụọ ọrụ naanị nwa obere oge, na-enwekwa ọtụtụ ihe mkpọbi ụkwụ. O bipụtara akwụkwọ mbụ ya dịka onye nsụgharị asụsụ n'afọ 1837, tupu o bipụta akwụkwọ mbụ e ji mara ya n'afọ 1840, yana edemede mkpirisi ndị ọzọ gbasara social satire nke na-agba àmà na ọ maara Akwụkwọ ọgụgụ France nke narị afọ iri na asatọ nke ọma. Ralet bụ onye isi-ekwe-ọnwụ na mgbago ụkpụrụ Romanticism, onue ihe ntinye ya niile dịka okorọbịa nyèrè áká iguzobe ndekọaha deadpan na Romanian humor nke oge a.

Ọ bụ ezie na Prince Mihail Sturdza kere ya ka Aga, Ralet nabatara nnwere onwe nnupụisi, na-agba mbọ ịmachibido Ịgba ohu iwu, ma na-ekpughe Sturdza dị ka onye ndú nke òtù ndị boyar rụrụ arụ. Ọ ruteziri n'ịkwado ịhụ mba Romania n'anya, nke ebumnuche ozugbo ya bụ ịdị n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Moldavia na Wallachia". N'ịkwado National Party na nnupụisi kụrụ afọ n'ala nke 1848, o doro anya na ọ gbanahụrụ ntaramahụhụ, ma soro ndị ọzọ na-emegide Sturdza si n'ụlọ ya na Botoșani. Ralet sonyeere ndị òtù National-Party nke Prince Grigore Alexandru Ghica guzobere na 1849, mgbe o nyere aka n'iwepụ ịgba ohu, iwebata mgbanwe n'agụmakwụkwọ, na nzọụkwụ mbụ maka ịnapụ ndị mọnk obosara ala ha. N'oge Agha Crimea, dị ka onye nnọchi anya Ghica, ọ kwalitere isi ihe nke iwu nke mere ka Moldavia bịarukwuo na ndị na-achị n'ọdịda anyanwụ nso, ma pụọ na ọnọdụ ya dị ka steeti na-akwado Alaeze Ukwu Ottoman. Mgbalị ya na Costache Negri gbara iji gbaa akwụkwọ n'ihe gbasara ebe obibi ndị mọnk mere ka ha gaa ogologo njem gaa Istanbul.

Ralet bụ onye mgbasa ozi maka ikpo okwu unionist n'ihu ntuli aka iwu na July 1857, na-emegide ndị na-achọghị ikewapụ onwe ha nke e guzobere gburugburu Caimacami Teodor Balș na Nicolae Vogoride. Ọ kpughere ịkpa ókè na aghụghọ ntuli aka nke Vogoride nye mba ụwa ndị ọzọ, na-abụkarị onye na-ahụ maka ntuli aka ugboro ugboro na Septemba. O mechara bụrụ onye a ma ama na Ad-hoc Divan nke Iași, ebe, dị ka onye dị nro, o nyere aka iwebata ndị na-agbaso omenala maka ebumnuche unionist. Ọrụ edemede ikpeazụ ya gụnyere ihe nkiri na-atọ ọchị nke a na-eto n'ọtụtụ ebe, gụnyere dịka ndị nkatọ nke oge a kpọrọ ya, nsụgharị Hora Unirii n'ụdị nke ya, yana Akụkọ njem nke njem ọwụwa anyanwụ ya - otu n'ime ederede mbụ dị otú ahụ sitere n'aka onye Moldavia, yana ịbụ otu n'ime ọrụ nkà nke ụdị ahụ na Romania ya. Ralet nọrọ ụfọdụ n'ime ọnwa ikpeazụ ya na Alaeze Ukwu France, na-agbalị inweta nkwado maka njikọ ahụ, yana ilekọta ọrịa ụkwara nta ya dịrịla njọ. Ọ nwụrụ mgbe ọ laghachiri, n'enweghi ike ịhụ nguzobe United Principalities, nke mere naanị ọnwa ole na ole ka e mesịrị.

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Mbido ndụ na mmalite

[dezie | dezie ebe o si]
Otu ụdị nke ogwe aka Rallet, dị ka Emanoil Hagi-Moscu sụgharịrị na 1918

Nna Ralet bụ Alexandru ma ọ bụ Alecu Ralet, onye Spatharios nke Botoșani, nakwa onye isi oche mbụ nke ụlọ ikpe obodo ahụ. Moldavia na Wallachia (Danubian Principalities) dị ya nso n'oge ahụ bụ ndị na-akwado na ndị na-akwụ ụgwọ nke Alaeze Ukwu Ottoman; n'okpuru ọchịchị a, ha natara ọtụtụ ndị si Gris bia biri, gụnyere ezinụlọ Rallet. Onye na-ahụ maka usoro ọmụmụ Octav-George Lecca kwenyere na ha guzobere alaka dị iche iche nke Rallis, mere na ha bụ ụmụ nke ọchịchị aka ike Byzantine; onye na-akọ akụkọ ihe mere eme Gheorghe Sibechi na-arụ ụka na nkọwa a, onye na-ekwu na ndị ọ bụ ha bụ Rallis kpọmkwem na ezinụlọ Rallet ọzọ nwere ndị nnọchi anya ha na Principalities, o yighị ka ndị ikwu Alexandru à na-azọrọ na ha ịbụ ndị ikwu. Nnyocha nke onye ọkà mmụta akwụkwọ Mircea Anghelescu malitere, nke ọkọ akụkọ ihe mere eme Andrei Pippidi rụzuru, na-egosi njikọ chiri anya n'etiti Rallis na Rallet. Pippidi na-ekwu na Dimitrie bụ nwa nwa Dragoman Christophoros Rallis, na nwa nwanne Isaac Ralet, onye nwere ọkwa dị elu na Wallachia n'afọ ndị 1820. Nna Alexandru ma ọ bụ nwanne ya nwoke nke okenye, nke a na-akpọkwa Dimitrie, rutere Moldavia n'ime ndị Phanariote. Dimitrie a sonyeere Prince Alexander Ypsilantis na njem ya gaa na Europe n'oge Ndị Russia bịara biri na 1788, ma nabata ụfọdụ àgwà maọbu omume ndị ọwụwa anyanwụ - gụnyere uwe agha nke gosipụtara Igbe Noa na njirimara onwe onye dị ka "ọnụ ọgụgụ ".[1]

Dị ka onye na-ede usoro ọmụmụ nke Boyar Constantin Sion si kwuo, Dimitrie nke ukwu bụbụ onye odeakwụkwọ nke Alexander Mourouzis, na 1790s, tupu e mee ya Vornic n'okpuru Scarlat Callimachi, ma kpọọ Alexandru n'ime mba ahụ, ka ọ sonyere ya. Obere ihe ka a maara banyere afọ ndị mbụ nke Dimitrie nke nta, gụnyere kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya - ebe isi nnweta ihe nke abụọ na nke atọ na-atụ aro "ma eleghị anya n'afọ 1816", kamakwa 1815 na 1817. A mụrụ onye edemede ahụ site n'alụmdi na nwunye Alexandru yana Maria (nke a makwaara dị ka Marghioala), nwa nwanyị nke Baron Teodor (Tudori) von Mustață, onye ọ̀zụ́ahịa bara ọgaranya si Bukovina District (nke bụbu akụkụ nke Moldavia, dị n'okpuru Alaeze Ukwu Austria mgbe ahụ). [2] Akụkụ a nke ezinụlọ ahụ nwere mmalite na nso nso a n'etiti Ndị Aroman, ndị na-asụ Eastern Romance nke Dimitrie nke nta maara dị ka Tsintsari. A nabatara ndị Mustață n'ime Ndị isi Austria na 1794, mana ha nọgidere na-enwe njikọ na Epirus (Ioannina Eyalet), ebe ndị ikwu ha ka bi na Tsepelovo n'afọ ndị 1830.

Ihe ndekọ nke 1825 nke ndị ọchịchị Austria nyere na Sadagora kwuru na Alexander bụ Nwa amaala Venetian, ma na-edepụta "Moldavia" maka nwunye ya na ụmụ ya niile. Okwuchukwu n'olili ozu ya sitere na Moldavian Metropolitan Neofit Scriban kọrọ na "a mụrụ Dimitrie nke nta dị ka onye Moldo-Romania", ọ bụ ezie na mkpebi ikpe dị otú ahụ nwere ike iduhie eduhie: Pippidi na-ekwu na, maka ịnakwere ọdịmma obodo ya niile, onye edemede ahụ "a bụdịghị na Moldavia ka a mụrụ ya." Onye ọkà mmụta Ionel Bejenaru na-ahụta ya dị ka onye Bukovinan site na ọmụmụ, ebe ọ na-ekwu na ịchọpụta kpọmkwem ebe ọbụ bụ isiokwu na-akpata ọtụtụ arụmụka. Sion na-ekwu na "ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị" niile nke Alexandru bụ ụmụ amaala Istanbul, isi obodo Ottoman, ma bụrụ ndị rutere na Botoșani na 1819 . Sibechi kọwara nkwupụta a dị ka "ihe siri ike ịnwapụta", ọ bụ ezie na ọ kwetara na ndị edemede dị iche iche na-emeso ya dị ka eziokwu, karịsịa ebe ọ bụ na, na ngwụcha ndụ ya, e kewara Dimitrie dị ka onye na-abụghị nwa amaala. Ọ na-ekwukwa na Dimitrie bụ n'ezie nwa mbụ n'ime ụmụ anọ - o nwere nwanne nwoke, Iancu, yana ụmụnne nwanyị abụọ, Catinca na Elencu. Iancu ọzọ, onye bụ nwa nwanne nna onye edemede ahụ, bụ Spatharios na 1822, ma dịrị ndụ ruo 1854.

A nabatara ndị Ralet n'ime ọkwa dị elu nke Moldavian boyardom, na-eme ka Dimitrie nke nta bụrụ onye natara agụmakwụkwọ dị elu, nke malitere site na ikuziri ya ihe n'ụlọ. Mgbe nna ya nwụsịrị na 1825, Maria ketara obodo nta Bukovinan bụ Nicșeni, ala Bucecea dị na Moldavia kpọmkwem, na ọtụtụ ụlọ na Botoșani; E kenyere di ya Bucecea, eruo na Jenụwarị 1828, Prince Ioan Sturdza ebulie ya ka ọ bụrụ obodo ahịa Moldavia. Dị ka nwatakịrị, Dimitrie biri nwa oge n'obodo ahụ, yanakwa na Botoșani na Nicșeni. Anghelescu na-ekwusi ike na Ralet mgbe ọ na-eto eto maara nke ọma akụkọ ọdịnala na uri Moldavia, na-ekwu na akwụkwọ ya bụ otu n'ime "ndị na-aga n'ihu" yana nke Dosoftei na Dimitrie Cantemir. Ọ mụtara ma Grik ma French site n'iso ndị ikwu ya kwurịta okwu; o mechaa mụta German (ya mere na e weere ya dị ka onye ọkachamara n'ime àlà German bi na Moldavia), Latin, yana isi asụsụ Itali, Bekee, na Russia.[3] A kọrọ na ọ gụsịrị akwụkwọ na Poland nke Austria. [3] [4] Akụkọ ndụ ụfọdụ na-akọ na o mere njem ọmụmụ dị ogologo na German Confederation na Alaeze nke France, ma ọ bụ n'asụsụ doro anya "na mba ofesi". [4]

Ọrụ mbụ Ralet bipụtara bụ mpịakọta dị mkpirikpi nke nsụgharị sitere na Alphonse de Lamartine, nke ebiputara na 1837 dị ka Plăcerea sâmțirei. Pippidi na 1980 kọwara aha ya, nke a ga-asụgharịkarị ugbu a ka ọ bụrụ "Obi ụtọ nke Mmetụta" dịka "Obi Ụtọ nke Mmetụ". Nke sochiri ya na 1840 bụ nchịkọta Scrieri ("Ihe odide"). Ndị ọkà mmụta nke oge a kewara n'ihe gbasara ọnụ ahịa nkà Pippidi nke ikpeazụ: Paul Cornea na-ahụ ya dị ka "ihe na-adọrọ mmasị", "bụrụ ihe ijuanya na ịdị nhụta ya", na nke dị n'ụdị "ọgbara ọhụrụ dị egwu", bụrụ nke tozuru n'ozuzu iňomi ndị nlereanya ndị France ọ na-eṅomi (François de La Rochefoucauld, Luc de Vauvenargues, Nicolas Chamfort); n'ụzọ dị iche, Mihai Zam na-ekwu na ọ bụ "nke na-adịghị mma nwere obere mmetụta". Onye na-ede akwụkwọ akụkọ ihe mere eme Maria Frunzã bụ onye ọzọ kwuru ihe dị mma maka ya, onye na-arụ ụka na Scrieri na-arụ aka na onye ọgụụ nke narị afọ nke iri na asatọ bụ Philosophes, onye, ya onwe ya nwere "nka ịchọpụta ihe, amamihe mara mma na inwe agụụ satire". Na nnyocha ya nke akwụkwọ ọgụgụ Romania, Nicolae Manolescu kọwara Ralet dịka "otu n'ime ndị na-ede uri na-egosi mmetụta ịhụnanya kacha nwee nkà", Scrieri ya bụrụ nke a ga-agụnwu, "nwere ntụpọ ole na ole", dịka ụkpụrụ nke narị afọ iri abụọ na otu si dị. Ọ hụtakwara Ralet dịka "ọpụrụiche a na-agaghị echefu echefu", dịka otu n'ime mmadụ ole na ole na-echebara onwe ha echiche, na-eleda onwe ha anya, onye Romanian na-ede uri ịhụnanya, na "onye nwe litotes".

Ihe Ncheta Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka Pippidi kọwara, ndụ onwe onye Ralet nọgidere bụrụ ihe omimi, naanị ihe na-egosi ya bụ akụkụ dị mkpirikpi nke testament ikpeazụ ya. N'ebe a, Vornic ahụ kwuru banyere "ihe e kere eke m hụrụ n'anya, nke nyere nzube maka ndụ mwute nke m a". N'ọnwa Ọgọstụ 1907, ọkọ akụkọ ihe mere eme Nicolae Iorga dere dị ka akụkọ na: "Nwunye D. Ralet nke di ya nwụrụla, onye edemede ahụ na onye agha maka Union, anwụọla na Iași. " Ralet hapụrụ obosara ala ya ka gọọmentị were ya, maka ọrụ ebere. O kwukwara na akụkụ nke ego ya kwesịrị ịga n'ihu na agụmakwụkwọ nke ụmụ agbọghọ Iași dara ogbenye. Ili ya dị n'ebe a na-eli ozu nke e kenyere Dormition Church nke Botoșani. [5] N'ụbọchị mbụ n'ọnwa Nọvemba, na Chọọchị Saint Spyridon dị na Iași, Metropolitan Scriban raara Ralet nye okwuchukwu ya na ncheta ya, na-akpọ ya "enyi anyị nke ụkpụrụ na ọrụ, nke omume na nke iru uju", yana "onyeozi mbụ nke mmeghari [mba anyị]". " Ụfọdụ otuto ozugbo gụnyekwara edemede nke onye na-ede uri Gheorghe Sion, nke edere na akwụkwọ akụkọ Bolintineanu, Dâmbovița, na Nọvemba 1858. Uru nka ya mepụtara njikọ dị n'etiti Bolintineanu na Sion.

Akụkọ Ion Ralet nọgidere na-agbasa n'oge 1880s na '90s, mgbe G. S. Petrini na Theodor Speranția tinyere ha na nchịkọta isiokwu. N'ide akwụkwọ na 1882, mgbe Agha Nnwere Onwe nke Romania gasịrị, na mgbe ejikọchara òtù ahụ iso n'ime Alaeze nke Romania, Alecsandri kwuru banyere Suvenire dị ka "nke kwesịrị inwe ọnọdụ dị iche na ọbá akwụkwọ ọha na nke onwe". N'afọ ahụ kwa, o bipụtagharịrị România după Tractat, nke ọ kpọrọ ihe dị ka nkwupụta megide "ntinye aka nke ndị mba ọzọ". Oge alaeze ahụ hụrụ nkwuputa nke nwa nwanne Dimitrie, bụ Ion Ralet - onye, ruokwa mgbe ọ nwụrụ na January 1916, bụ ọkammụta mgbakọ ma mwepụ bụ ọpụrụiche n'a lasi, nakwa onye nhazi nke òtù Conzavetiv. N'agbanyeghị mgbalị niile nke Alecsandri, onye edemede ahụ nwụrụ anwụ na-apụ n'anya n'uche ọha na eze. Cornea, mgbe ọ na-ede ihe na 1966, kpọrọ ya "otu n'ime ndị kachasị amasị n'etiti mmadụ iri anọ na asatọ", na-agbakwụnye, sị: "ihe kpatara amaghị aha ya [bụ] n'ihi nsogbu nke akara aka." Ka ọ na-erule oge mbipụta ọhụrụ nke Suvenire pụtara na 1979, echefuola ya nke ukwuu, dị ka onye dere ya.

Ihe edeturu

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ Pippidi, p. 390
  2. ↑ Aurel Sasu (ed.), Dicționarul biografic al literaturii române, Vol. II, p. 453. Pitești: Editura Paralela 45, 2004. ISBN 973-697-758-7
  3. 1 2 (in Romanian) Mihai Zamfir [ro], "Îndrăgostitul de Stambul: Dimitrie Ralet", in România Literară, Issue 35/2008
  4. 1 2 Ionel Bejenaru, "Dicționarul botoșănenilor. Dimitrie Rallet (1815—1858)", in Caiete Botoșănene, Vol. 3, Issue 12, December 1985, p. 4
  5. ↑ Sibechi, p. 109

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]