Gaa na ọdịnaya

Dolly Nwaduba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Dolly Nwaduba, a makwaara dịka Dolly Ifeyinwa Nwadialo (amụrụ 4 Ọ̀gọst 1988),[1][2] bụ nwanyị Naijiria na-eme ihe nkiri, onye ji olu ya emepụta ihe mgbasa ozi, na onye na-emepụta ihe nkiri.[3][4][5] Ọ bụ onye isi nchịkwa nke Dolly's Signature Limited yana Nollyplug TV.[6] Nwaduba gụrụ akwụkwọ na New York Film Academy.[7] O so na ndị tozuru inweta ihe nrite African Entertainment Awards, USA (2024)[8] yana onye ritere asọmpi ide fim nke Nollywood (2022) maka ihe nkiri o dere, M.O.R.E.M.I.[9][10] A makwa ya maka ide ihe nkiri Ndị ọcha, Riverside. Kemgbe ọ laghachịrị Naijiria n'afọ 2017, Nwaduba emepụtala ihe dịka ihe nkiri iri atọ.[7][11] Ụfọdụ n'ime ihe nkiri o dere mere gụnyere One Wish (2019), Drawn to You (2024) yana, Serendipity (2021) nke ndị so mee ya bụ Frederick Leonard na Monalisa Chinda, nke Tchidi Chikereduziri.[12]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nwaduba na 4 Ọgọstụ 1988 dịka naanị otu nwa na Ogwashi dị na Delta State. [2] Ọ si okpuru ọchịchị Aniocha South na Delta State. [11] Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na Seta International. Mgbe ahụ, ewee nabata ya ịmụ Diplomacy na International Studies na Mahadum Benin. Nwaduba mechara gaa New York Film Academy ebe ọ mụtara edemede ihe nkiri, mmepụta ihe nkiri, na nka olu. [2]

O tinyere aka na ime ihe nkiri ruo otu afọ na United States, na-eme ihe nkiri Riverside (2016), Nick And Ice (2016), yana Invitation (2017), tupu ọ laghachi Naịjirịa mgbe afọ 2017 gwụwara.[11] Kemgbe o mepụtara ihe nkiri Naijiria mbụ ya bụ Lights Out (2017), o meela ọtụtụ ihe nkiri ndị ọzọ na Naịjirịa. Nwaduba bụ onye natara onyinye "Onye mmepụta kacha mma nke Afọ" site na Sabistation Business Owners Awards 2024 . [13][14][15]

Ihe nkiri ndị O mere

[dezie | dezie ebe o si]
  • Riverside (2016)
  • Nick And Ice (2016)
  • Invitation (2017) as Attendant #1
  • Lights Out (2017)
  • Arinze (2019)
  • Distance Between (2019)
  • One Wish (2019)
  • Serendipity (2021)
  • Beguiling [4]
  • Chasing Dreams ween rọ (2023) [16]
  • Poetic Justice (2023) [16]
  • Tainted Feeling (2023)
  • Dawn (2023) [16]
  • Perfect Love (2023) [16]
  • The Grand Stand (2023) [16]
  • Sinister Visit (2023)
  • Drawn to you (2024)
  • A Star in the Dark

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Dolly Nwaduba | Actress, Producer, Writer (en-US). IMDb. Retrieved on 2024-10-18.
  2. 1 2 3 DOLLY.pdf. Sentry News. Retrieved on 2024-10-18.
  3. Okoye (September 3, 2024). How Dolly Nwaduba is making waves in Nollywood. Vanguard (Nigeria).
  4. 1 2 Nigeria (2024-08-26). Nollywood producer, Dolly Nwaduba talks future of African Storytelling (en-US). Guardian Nigeria. Retrieved on 2024-10-18.
  5. Telegraph (2024-09-03). Nollywood Powerhouse, Nwaduba Shares Her Journey To Success (en-US). New Telegraph. Retrieved on 2024-10-18.
  6. Dolly Ifeyinwa Nwaduba Launches Charity Drive Amidst Film Promo. Vanguard (Nigeria) (August 13, 2024).
  7. 1 2 Dolly Nwaduba: The Visionary Shaping the Future of Nollywood – Sun News (en-US). Archived from the original on 2024-12-26. Retrieved on 2024-10-18.
  8. AEAUSA 2024 Nominees. AEAUSA.
  9. Nnah. Cosmos Abasi Wins Aforevo Nollywood Screenwriting Contest – THISDAYLIVE. ThisDay. Retrieved on 2024-10-18.
  10. Overall winner of Nollywood screenwriting contest gets N1m reward (en). News Express Nigeria. Retrieved on 2024-10-18.
  11. 1 2 3 All I want in my husband is high intelligence level — Actress, Dolly Nwaduba. Medium.
  12. Rapheal (2024-08-17). Why I’m giving back to families with school children – (en-US). The Sun Nigeria. Retrieved on 2025-06-30.
  13. 2024 Winners – Sabistation Business Owner's Awards (en-US). Retrieved on 2024-10-24.
  14. Ihesiulo. Sabistation Business Owners Awards 2024 Celebrates 110 Nigerian Entrepreneurs and Business Leaders. Daily Times.
  15. Nigeria (2024-10-23). Aliko Dangote emerges Entrepreneur of the Year at 2024 Sabistation Business Owners Awards (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2024-10-24.
  16. 1 2 3 4 5 Admin (2024-03-11). MOVIES VERIFIED AND APPROVED BY NFVCB IN SEPTEMBER 2023 (en-US). NFVCB | National Film And Video Censors Board. Retrieved on 2024-10-18.