Doyin Abiola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Doyin Abiola
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoDoyin Abiola Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
ụdị ọrụ yaprint media Dezie
Ọkwá o jimanaging director Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, New York University Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts, nzere masters, Doctor of Philosophy Dezie
Ebe ọrụȮra Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1969 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie

Doyinsola Hamidat Abiola onye nke eji Doyin Abiola mara bụ managing director na-achikwata ụlọ ọrụ Concord news agency. Doyin bụkwa nwaanyi izizi nwetara ọkwa onye nhazi akwụkwọ akụkọ nke Nigerian daily [1] [2]

Agụmakwụkwọ na Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Dọkịta Doyin Abiola nwetara nzere digiri na Asụsụ Bekee nakwa ihe gbasara mmepụta egwuregwu site na University of Ibadan n'afọ 1969. Ka Ọ gụsịrị akwụkwọ ,o bidoro ọrụ n;ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkụ a kpọrọ 'Daily Sketch' n'afọ 1969. N'oge a, ọ malitere ide ihe ederede nke a kpọrọ Tiro bụ nke na-egosipụta nsogbu na mmekpa ahụ metụtara ọha na eze,tụmadị ihe gbasara ịkpa oke n'etiti nwoke na nwaanyị. N'afọ 1970, ọ hapụrụ ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ nke Daily Sketch wee gaa Obodo oyibo ije gụ akwụkwọ maka nzere Mastas n'ihe gbasara ịchụ nta akụkọ. Ka ọ si obodo oyibo lọta e were ya ọrụ dika onye odee n'akwụkwọ akụkọ Daily Times. Ọ bụ nke a ka ọ megidere wee bụrụzie onye isi na-enyoche ihe akụkọ edere ede. O mechara gaa New York University ebe ọ nọ nweta nzere PhD n;ihe gbasara mgbasa akụkọ nakwa ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchichị n'afọ 1979. [3] Ka ọ lọchitere azụ Nigeria , ọ gakwara n'ụlọ ọrụ 'Dail Time ede o sonyeziri n'oyu bọọdụ ndị na-ahazi akụkọ ederede, ụfọdụ n'ime ha bụ Stanley Macebuh, Dele Giwa na Amma Ogan. Mana, ọ rụrụ ebe a obere oge n;ihi na ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkụ 'National Concord ebidoro ọhụụ nyere ọrụ dika onye izizi ga arụ dika onye isi n'ịhazi akụkọ. E mchara bugoo ya nọkwa dika 'Managing Director/Editor in Chief n'afọ 1986. Ọkwa a mere ya nwaanyị mbụ nọgoro n'ụdị ọkwa na Nigeria. [4] [5] Dr. Doyin Abiola bu kwa nwunye onye izizi bipụtara akwụkwọ akụkọ nke a kpọrọ 'National Concord Newspaper' Chief Moshood Abiola onye nke ọ lụrụ n'afọ 1981. [6] Doyin Abiola rụtere ọrụ aka n'ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ Concord. Ọ nọkwara n'ọkwa di iche iche na Nigeria. Ọ bụ onye isi oche na mmeme ihe onyinye nke mbụ emere na Nigeria nke a kpọrọ 'Nigerian Merit Award' . Ọ bụ onye otu kansulu ndụmọdụ nke Ngalaba Social and Management Sciences nke dị na Ogun State University. .

Onyinye na Ntube ugo[dezie | dezie ebe o si]

Ọnwetara nkwanye ugwu na ihe onyinye di iche iche dika 'Diamond Award maka Media Excellence' (DAME) maka mbọ niile ọ na-agba iji akụkọ ederede wee kọwapụta ụzọ ndozi na ọchichị obodo. Ndị Nlekọta nke DAME jikọtara aka wee nye ya onyinye nke a kpọrọ 'Lifetime Achievement Award na mmeme ha mere . Ọ bụ nwanyị nke abụọ natara Onyinye a onye nke mbụ bọ Oriakụ (Omobola Onajide). [7] [8] E nyekwara ya ikike iso n'otu ndi Felow nke Eisenhower Fellowship n'afọ 1986. [9]

Lee kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Moshood Abiola

Ebe nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. Buhari: God shamed enemies - Femi Adesina (2017-03-25).
  2. Citation of Dr. Doyin Abiola, Lifetime Achievement Awardee at the 24th Dame. Archived from the original on 2021-08-20. Retrieved on 2020-05-04.
  3. https://massmediang.com/dr-doyinsola-abiola-biography/
  4. https://punchng.com/buhari-congratulates-doyin-abiola-at-73/
  5. https://www.iol.co.za/news/africa/abiolas-wife-continues-the-struggle-alone-63335
  6. https://biography.yourdictionary.com/moshood-abiola
  7. https://massmediang.com/dr-doyinsola-abiola-biography/
  8. https://books.google.com.ng/books?id=xfHsJMBLWlsC&pg=PA101&lpg=PA101&dq=10+things+about+doyin+abiola&source=bl&ots=oGy8mjo0Nj&sig=ACfU3U1W2dmAlbwBF9_WAZLVik1d6JDZjA&hl=en&sa=X&ved=2ahUKEwjG2arStLbpAhUJ9IUKHQxdDpkQ6AEwEXoECBEQAQ#v=onepage&q=10%20things%20about%20doyin%20abiola&f=false
  9. https://www.efworld.org/efdirectory