ELDee

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
eLDee
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụLanre Dabiri Dezie
aha pseudonymeLDee The Don Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Mee 1977 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-ese ụkpụrụ ụlọ, odee egwu, onye na-emeputa ihe ndeko, recording artist, rapper Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1998 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
ngwa egwurapping Dezie
diskografieLDee discography Dezie
webụsaịtịhttp://www.tryberecords.com/ Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ eLDee na 23 Mee 1977, na Kaduna steeti bụ mpaghara ugwu nke Naijiria. Ọ bụ onye Lagos Island na Lagos Steeti nke Naịjirịa.

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ gara Command Children School kaduna na Essence International School tupu ọ kwaga Lagos maka agụmakwụkwọ dị elu. O nwere nzere masta na Architecture na Mahadum nke Lagos, Nigeria n'afọ 2001.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

E kwuru na eLDee bụ otu n'ime ndị ọsụ ụzọ nke ụdị egwu afrobeats. N'afọ 1998, ọ malitere otu egwu a na-akpọ Trybesmen nke gara n'ihu bụrụ otu n'ime ndị otu egwu nke mere ka ejikọta Hip-hop, highlife, pop na egwu ọdịnala afrobeat. Trybesmen bụ ndị na-eti egwu na kọntinent site n'afọ 2000 ma rụọ ọrụ dị mkpa n'ịkpụzi ụdị egwu ọhụrụ.

eLDee webatara ndị na-agu egwu iri na isii na akara Trybe Records ya, ma kpọọ mmekorita nke ndị omenkà niile kwuru Da Trybe. Ha mepụtara egwu "Work it out" na "Oya" na 2002, na abọm BIG Picture na 2005.

Mgbe ọ kwagara United States n'afọ 2002, eLDee dekọrọ abọm nke akpọrọ Long Time Coming (2004). Ọ gbasoro ya na Return of the King (2006), nke nwere otu "I Go Yarn". Return of the King meriri "Best International Album" na 2007 Nigeria Entertainment Awards na New York City.[1] Abọm ya ndị sochirinụ bụ Big Boy (2008), nke akpọrọ Evolution, Is it your money Vol.1 (2010) na Undeniable (2012).

eLDee arụla ọrụ dị ka onye na-ese ihe, onye na-emepụta ihe, onye nduzi na onye ndụmọdụ mgbasa ozi mmekọrịta.

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

"Lanre" bụ ihe sitere na aha Yoruba "Olanrewaju" (nke pụtara "Akụ na ụba na-aga n'ihu").[2]

eLDee na enyi ya ogologo oge, Dolapo Latinwo-Bello lụrụ di na nwunye ma ha nwere ụmụ nwanyị abụọ, Temi, na Toke. Ọ nọ na Atlanta, USA kemgbe 2002.

N'ọnwa Disemba afọ 2013, o biputere ozi na ibe Twitter ya iji kwupụta nkwado ya maka ikike nwoke idina nwoke na nwanyị idina nwanyị, na-ekwu na enwere olileanya na otu ụbọchị n'oge na-adịghị anya, Afrịka ga-aghọta na mmegide nwoke na nwanyị adịghị iche na ịkpa ókè agbụrụ ma ọ bụ okpukpe.[3]

Discography[dezie | dezie ebe o si]

Abọm[dezie | dezie ebe o si]

  • 2004: Long Time Coming
  • 2006: Return of the King
  • 2008: Big Boy
  • 2010: Is It Your Money
  • 2012: Undeniable

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

  • 2000: L.A.G Style nke Trybesmen dere
  • 2004: The Big Picture (Trybe Records Album)
  • 2009: The Champion: The Hits

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Hip hop nke Afrịka
  • Hip hop nke Naijiria
  • Egwú nke Naịjirịa

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Eldee. afrobios.com. Archived from the original on April 30, 2020. Retrieved on May 25, 2020.
  2. Olanrewaju - Nigerian.Name. Nigerian.name. Retrieved on May 21, 2018.
  3. Rapper Eldee advocates for gay rights, as fans go wild! – Vanguard News. Vanguardngr.com (December 26, 2013). Retrieved on May 21, 2018.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Eldee