Ebe Ụmụ nwanyị Epako
Ebe Ụmụ nwanyị Epako bụ ebe a na-enye nkwado obodo nke Mịnịstrị na-ahụ maka nha anya nwoke na nwanyị na ọdịmma ụmụaka nke Namibia rụrụ.
Ebe Ụmụ nwanyị Epako bụ ụlọ ọrụ echere ka ọ bụrụ ebe nhazi maka mmemme dị iche iche nwere ike inyere obodo ime obodo na obodo mepere emepe aka ịga n'ihu n'ọkwa nke akụ na ụba. Ọ nwere ụlọ ọrụ, ọnụ ụlọ obodo, ọnụ ụlọ ọzụzụ, ụlọ nchere, kichin na ụlọ ịsa ahụ, nke enwere ike ịgbazite obere ego. Ebe ahụ na-eje ozi dị ka ebe a na-azụ ndị otu obodo n'ịzụlite nkà, nzuko obodo na ịkesa ozi, ngosi na ịzụ ahịa ngwaahịa nke ndị obodo mere, yana mmemme na-eme ka ndị mmadụ mara maka okwu ndị dị ka ime ihe ana- akpo Gender-Based Violence (GBV) bụ ihe ike dabeere na nwoke na nwanyị na nlekọta na nchebe ụmụaka.
Akụkọ ihe mere eme
[dezie | dezie ebe o si]Ewubere Ebe Ụmụ nwanyị Epako n'afọ 2011 wee rụọ ọrụ n'afọ 2012.
Ọ bụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ịha nhatanha nwoke na nwanyị na ọdịmma ụmụaka, Honourable Rosalia Nghidinwa (MP)nwụrụ anwụ, Mpaghara Omaheke nke Namibia mepere ya.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọzụzụ mmepe nka gụnyere ọrụ agịga na ịkwa akwa, ọrụ bead, ọrụ akpụkpọ anụ na njikwa azụmaahịa bụ isi.
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]MGECW. (2015). Community Empowerment Centres Guideline.