Ebere Orji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ebere Orji
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaOrji Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Disemba 1992 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuRivers Angels F.C. Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

Ebere Orji (a mụrụ n'ụbọchị nke 23 n'ọnwa Disemba nke afọ 1992) bụ nwaafọ Naijiria n'agba bọọlụ na mba ụwa [1] nke na-agbara ndi Linköpings bọọlụ ugbu a na Damallsvenskan nke mba Swidin . Ọ gbabuuru ọtụtụ klọb bọọlụ na Naijiria, Swidin na Họngarị [2] mana nke a kachasị mara bụ Ferencváros na Női NB I nke mba Họngarị na Rivers Angels na Nigeria Women Premier League nke obodo ya. Ọ nọchitekwala anya Naijiria n'ọkwa mba ụwa dịka akụkụ nke otu egwuregwu n'agba nke ikpezụ 2011 FIFA Women's World Cup, yana Under 20 na Under 17 World Cup.

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

Ya na ndị Rivers Angels, otu mgbe o meriri site n'inye goolu ugborougboro megide COD United Ladies na mmeri 6-1 n'ụzọ ha i ji merie Federation Cup n'afọ 2014. [3] [4]

N'afọ 2015 ya na Ferencváros, o nwetere mmeri n'asọmpi nke Họngarị ( Női NB I ) na Hungarian Cup. N'oge a gbara agba nke afọ 2016-17, Orji mechara bụrụ onye kachasị nye goolu na Női NB I site n'inye goolu iri abụọ na asaa. [5]

N'afọ 2019, Orji nwetara ihe nrite Elitettan na Umeå IK, site n'inye goolu iri na otu n'ime egwuregwu iri abụọ na isii. [6]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ dị afọ 15, Orji mere bidoro asọmpi ya na mba ụwa na Nigeria women's under-17s na mmepe U-17 Women's World Cup n'afọ 2008 na mmeri 1-2 nke Saụt Koria n'egwuregwu nke otu. Orji nyere goolu mbụ ya na mba na Under-17s na otu ndorondoro a na goolu 2-2 ha na Brazil ., ma "o wutere ya" ka e mesịrị chụpụ ya n'otu egwuregwu ahụ. Ka ụbọchị iri na asaa a chụpụchara ya na egwuregwu ha na mba Brazil gasịrị, Orji nọchitekwara anya Naịjirịa ọzọ, na nke ugbu a ọ nọ n'ogo Under-20 na 2008 under-20 Women's World Cup. Orji nyere goolu na mpụta mbụ ya, ha na ndị Ingland gbara 1-1 ma nyekwazie goolu abụọ karịa dịka Frans mechara gbapụ ndị Falconets na nkeji nke atọ site na mmeri 2-3. Àtụ:Quote boxN'afọ abụọ ka nke a gasịrị, a kpọghachiri Orji ka o soro ndị otu Under-20 maka asọmpi 2010 U-20 Women's World Cup were hụ ihe ịga nke ọma dị ka otu n'ime nke otu ahụ meriri ndị na-agbachitere Amerịka na nkeji nke atọ ma mesịa ruo na ngwụcha nke asọmpi a, jiri obere dapụ site na mmeri 2-0 Jamini ndị a sọrọmpi na be ha meriri ha. [7] Orji nọ n'otu egwuregwu a mgbe niile,ma nyekwa goolu abụọ n'asọmpi ahụ, otu mgbe bụ naanị goolu ya nyere Naijiria mmeri na nkeji ha meriri Kolombia tupu nkeji ikpeazụ asọmpi ahụ .

Orji pụtara otu sinio mbụ ya n'asọmpi enyi na enyi Naịjirịa gbara megide Jamini, kosiladị a gbanwere ya mgbe nkeji iri abụọ na iteghete gachara, were merie Naịjirịa 8-0. [8]

Orji so na ndị otu Naịjirịa nke meriri n'asọmpị2010 African Women's Championship. [9] O pụtakwara na 2012 African Women's Championship. [10]

Oge mbu ọ pụtara na World Cup bụ na 2011 Women's World Cup, bido na egwuregwu atọ nke ndị otu. Naịjirịa emerighị n'egwuregwu ndị otu a.

N'afọ 2012, Orji nọchitere anya ndị na-erubeghị afọ iri abụọ na 2012 U-20 Women's World Cup, nke pụtara dịka onye nnọchite n'egwuregwu niile nke Naịjirịa ruo mgbe Amerịka chụpụrụ ha n'ọkara nke ikpeazụ. Orji chịkọtara egwuregwu iri na ise na Naijiria n'okpuru otu ndị na-erubeghị afọ 20 n'etiti afọ 2008 n'afọ 2012, ma nye goolu 5.

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Delta Queens
Rivers Angels
Ferencváros
• Női NB I: Onye mmeri 2015–16
• Női NB I: Onye na-esote onye mmeri 2016–17
• Nöi Magyar Kupa: Onye mmeri 2015–16, 2016–17
Umeå IK
• Elitettan : Onye mmeri 2019

Mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Nigeria U-20s
• U-20 World Cup : Onye na-esote onye mmeri 2010
Naijiria

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

1. Falcons not scared of Germany – Ebere Orji – Vanguard News. Vanguard News. Retrieved on 7 December 2014.
2. Ebere Orji :: Ebere Orji :: Umea IK. www.playmakerstats.com. Retrieved on 3 November 2019.
3. MERCILESS ANGELS THRASH SORRY C.O.D BABES (en) (11 July 2014). Retrieved on 3 November 2019.
4. Rivers Angels Lift FA Cup With Falcons Players – The Newswriter. Retrieved on 3 November 2019.
5. A Női Labdarúgó Bajnokságok oldala. Retrieved on 31 October 2019.
6. Players – Elitettan – Sweden – Results, fixtures, tables and news – Soccerway. Retrieved on 3 November 2019.
7. FIFA U-20 Women's World Cup 2010 – News – Germany triumph on home turf – FIFA.com.
8. Germany – Nigeria 8:0 (Women Friendlies 2010, November).
9. Wayback Machine (28 September 2012). Archived from the original on 28 September 2012. Retrieved on 3 November 2019.
10. Wayback Machine (22 February 2013). Archived from the original on 22 February 2013. Retrieved on 3 November 2019.