Ebonyi Saụt Senatorial District

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ebonyi Saụt Senatorial District
senatorial district of Nigeria
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaȮra Ebonyi Dezie

Ebonyi Saụt (bụ nke a maara dị ka Ógbè Afikpo ) bụ otu n'ime ụlọ ọgbakọ ndị anọrọ atọ na Ebonyi Steeti na Naịjirịa . [1]

Gọọmentị Obodo na Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Mpaghara Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ebonyi South nwere mpaghara gọọmentị ise (5):

  • Afikpo Nnọọtu
  • Afikpo Saa (Edda)
  • Ivo
  • Ohaozara
  • Onicha [2]

Ndi ochichi gọọmenti dị elu[dezie | dezie ebe o si]

Mpaghara ime obodo ise nke Ebonyi South mebere mpaghara gọọmentị dị elu abụọ bụ:

  • Mpaghara Afikpo - mebere Afikpo Nnọọtu na Afikpo Saụ. A maara Afikpo Saụt oge mgbe ochie dịka Edda
  • Mpaghara Ohanivo - nke Ohaozara, Onicha & Ivo mebere. Ohanivo bụ aha ịchafo enwetara site na jikọta aha obodo ndị mebere mpaghara ahụ.

Akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Ógbè Afikpo na Naijirịa emepụtara ọhụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ebonyi Saụt mepụtara Gọvanọ mbụ nke rijion nke Ọdịda anyanwụnnke aha ya bụ Akanu Ibiam, ebe nwunye onye isiala mbụ Naịjirịa bụ Uche Azikiwe, ebe onye minista izizi Naịjirịa bụ Aja Nwachukwu na ndị ọzọ.

Ógbè Afikpo n'okpuru Abia[dezie | dezie ebe o si]

N'oge Ebonyi Saụt (nke a na-akpọ mpaghara Afikpo n'oge ahụ) dị n'okpuru steeti Abia, mpaghara ahụ wepụtara Gọvanọ mbụ nke Abia Steeti, aha ya bụ Dr Ogbonnaya Onu, ọ bụ onye mpaghara Ohaozara nke dị na Area nke Ebonyi Steeti ugbua.

Ọzọkwa, ABIA bụ aha e jiri maka ebe anọ kachasị n'ọnụ ọgụgụ mmadụ na ụlọ ọrụ mepere emepe na steeti ahụ n'oge ahụ. Ebe ndị a bụ:

Afikpo dị ugbu a na Ebonyi Steeti.

Ọgbe Afikpo dị ka Ebonyi South[dezie | dezie ebe o si]

Ebonyi Saụt ewepụtala otu gọvanọ nke Ebonyi steeti kemgbe e hibere ya, aha ya bụ Gov. Dave Umahi . Onye omeiwu ugbu a na-anọchite anya Ebonyi Saụt ya na Michael Ama Nnachi nke ndị Otu Pati Nnoroonwe (PDP).

Ụlọ akwukwo di elu[dezie | dezie ebe o si]

  • Ulo akwụkwọ Nọọsụ Mater, Afikpo
  • Akanu Ibiam Federal Polytechnic, Unwana, Afikpo
  • Kolegi dị elu nke Ọrụ ugbo , Ishiagu, Ivo
  • Mahadum Ebonyi steeti nke ndị nọọsụ na ndị na-aṅa nwa, Uburu, Ohaozara

Ndị Ebonyi ama ama si na Ebonyi Saụt[dezie | dezie ebe o si]

  • Anyim Pius Anyim, onye bụbu onye isi oche ndị isi ala nke Naịjiria na onye bụbu onye isi ọdee akwụkwọ na ala Naịjirịa
  • Uche Azikiwe, ọsụ ụzọ nwanyị izizi nke Naịjiria na nwunye onye isi ala Nigeria Nnamdi Azikiwe
  • Akanu Ibiam, Gọvanọ mbụ nke mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naịjiria na onye bu Chukwuemeka Ojukwu onye buru ụzọ
  • Samuel Eto'o, onye egwuregwu futu bọọlụ na Cameroon, nwa nke nna Afikpo kwagara mba ọzọ na nne onye Cameroon
  • Tekno, onye na-agụ afropop, onye na-abụ abụ, onye na-edekọ ihe, onye na-eme ihe
  • Andy Chukwu, onye na agbazi ihe nkiri, onye na-eme ihe nkiri
  • Ogbonnaya Onu, onye mbụ Gọvanọ nke Abia Steeti, onye ozi nke Sayensi na Teknụ ugbu a
  • Priscilla Ekwere Eleje, nwanyi izizi nke bịanyere aka n'akwụkwọ nkwado ego Naira
  • Patoranking, onye na-agụ egwú reggae, onye na-agụ abụ
  • Sinach, onye na agụ egwu ụka
  • Chris Abani, onye edemede Naịjirịa na onye na-eme ihe nkiri na mba America
  • Nwali Sylvester Ngwuta, Justice nke Ụlọ Ikpe Kasị Elu nke Naịjiria
  • Igwe Aja Nwachukwu, onye bụbu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa site na Julaị na afọ puku abụọ na asaa rue na afọ puku abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba
  • John Ogbu, onye Amerịka anthropologist, "onye na-eme ọcha" theorist
  • Michael Nnachi Okoro, onye Bishọp nke Roman Catholic Diocese nke Abakaliki
  • Michael Ama Nnachi, Senator na-anọchite anya Ebonyi South Senatorial District na ọgbakọ 9th nke Naijiria
  • Angela Okorie, omee ihe nkiri
  • R
  • Francis Otunta, osote onye isi na Michael Okpara Universnke uỌrụugbok dị na e
  • Anyimchukwu Ude, bụ Senator na-anọchite Ebonyi Saụt constituency nke Ebonyi Steetinna Nigeria, na ndị omebe iwu Naịjirịa site na ụbọchị ịrị abụọ na itoolu na ọnwa Mee nke afọ puku abụọ na asaa ruo ụbọchị iri abụọ na itenanị nke ọnwa Mee na afọ puku abụọ na iri na otu
  • Dave Umahi, onye isi ochichi ugbua nke Ebonyi Steeti
  • Sonni Ogbuoji, onye isi na-anọchite anya Ebonyi Saụt site na onwa Mee afọ puku abụọ na asaa ruo na Mee afo pụku abụọ na iri na otu

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. PDP sweeps all National Assembly seats in Ebonyi. Retrieved on 5 September 2019.
  2. About Ebonyi State | Ebonyi Online. Retrieved on 5 September 2019.