Egwu Abianshị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
EGWU ABIANSHỊ
type of dance
obere ụdị nkeite egwu Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie

Abianshị[1] bụ egwu ndi obodo a na-akpo Eke. Ọ bụ egwu éjị echeta aṅụrị maka mmeri e meriri n’agha. O bidoro site n' akụkọ otu nwoke hapụrụ ụmụnwanne ya maka ọ bụ nwa etiti wee jee ịchọọ ego, ebe ezumuike, na ebe ọ ga- anọ mụọ ụmụ wee zụokwa ha. Ebe ahụ ọ gara, ndị bụ ndị gbara okirikiri wee fụ na ọ kọọ ugbo, na ihe ndị ọzọ na ọ na-emeta. Ha wee chọọ ịchụpụ ya. Mana o wee jee n’ obodo ọzọ wee kpọta dibia. Aha obodo ọ jee ị kpọta dibie bụ Igala. Dibia wee bịa, wee bulu ma ngwa egwú, bulu ịgba, bulu ekwe wee bịa.

Mgbe dibia a bịara, o wee kpota ụfọdụ ụmụ ikorobia na-a ka nye ha ọgwụ n’ahụ, agwọlụ ha ọgwụ. O siri ụfọdụ kụwala égwu ka ya nwee ike na-emekwa ọgwụ ya. Mgbe ọ na-akwado ọgwụ a, o wee si ha, kwe ya nkwa, si ọgwụ ya ree ire, na ha ga na-eme egwu a n’afo n’afo. Ya mere ha ji wee, wee kwado ọgụ, wee jewe agha a, wee nwete mmeri. Mmeri a wee buruzie ihe ha ji wee welu ngwa egwú na-eme emume ncheta mgbe ha meriri n’ agha. Ihe kpatara eji wee kpọọ egwu a Abianshị bụ maka ịgba onye dibia ahụ si igala bu wee bịa. Nshi n’ asụsụ be anyị bụ ọgwụ onye dibia merụ ha eji merie n’ agha. Ọ bụ egwu a na-eme n’ ọkara awa. Mgbe gboo, ụmụagbọghọ na-awa ọgọdọ, yiri jigida, gbaa akwa n’ obi, wee na-agba ya bụ egwu. Mana kitaa, dika obodo si emepe, a na-eyi ihe ọbụna mana iji gwa gị na ọ ihe omenani, ịga egbo akwà n’ ukwu, ma ị bụ nwoke ma ị bụ nwanyị. Ihe eji akụ egwu a bụ abia, ekwe, kpọmkpọ, na ọsụ.[2]

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]



Ngwa Egwu Abianshị[dezie | dezie ebe o si]

Vidio[dezie | dezie ebe o si]

Egwu Abianshi







Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:ABIANSHI_DANCE.ogg
  2. https://meta.wikimedia.org/wiki/Audiovisuals_of_Igbo_Dances_(AID)_Project