Egwu ogbongelege

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwu Ogbongelenge
type of dance
obere ụdị nkeite egwu Dezie
omenalaNdị Igbo Dezie
mba osiNaijiria Dezie
WikiProject na-elekọta yaWikiProject Intangible Cultural Heritage Dezie

Ogbongelenge[1] bụ egwu ejiri mara ndi Ụmụohuo Mpam Ekwerazu Ahiazu n'Imo steeti. Ejị yá eme ihe gbasara ọmụgwọ ya bụ mgbe nwaanyị mụrụ nwa. Nke ọzọ bụ mgbe ọbụla nwaanyi mụkwara nwa mụruo ihe dịka iri na abụọ, eji ya e  gburu ya ewu. A na- akụrụ ya egwu a mgbe di otu a, nke nwoke na nwanyị na-agba.

A na ejikwa egwu a eme mmemme ncheta ọmụmụ Christi n' oge Desemba nakwa ana-eme Isita. A na eji ya kwa eme mmemmé iri ji Ọgostu [2]

Ejiji Egwu ogbongelenge[dezie | dezie ebe o si]

Ejiji Egwu Ogbongelenge

E nwere ojiji eji mara Ogbongelenge. Ọ bụ akwa Jọọji, a na-ama, ma yikwasa ya polo. Bia nwekwe ọja a na- eji ekebishi n’ ụkwụ eji agba ya.

Ndi nwe egwu a na eji aka ha eme otu n'ime akwa ejị aku ya nke aha ya bu Ogbongelenge nke bukwa aha egwu a .

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]


Ngwa Egwu[dezie | dezie ebe o si]

Ngwa egwu a bụ ogbangelenge, bụkwa nke kacha mkpa ma nye ya ọdịdị ya di iche. Ha na-eme nke a site na- igbute ụịi ọsịsi ọ bụ n’ ime ọhịa. Ha wee gbubisie ya, kpọwasị ya, mee ya, hazie ya, tunuo ya, ya enwe ụda otu o kwesiri ísí adị dịka ụda olu.

Ihe egwu ndi ozo bu ọsha, ọkwa, na udu.

Vidio[dezie | dezie ebe o si]

Egwu ogbongelenge








Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:OGBOGELENGE_DANCE.ogg
  2. AID project (2023-02-04). Audiovisual of Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-12.