Ekwentị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ekwentị rotary ochie

Ekwenti bụ igwe okwu nkwukọrịta nke na-enye mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa ohere ịme mkparịta ụka mgbe ha anoghi ibe ha nso ka anụ olu ha ozugbo. Ekwenti na-agbanwe ụda, nke a na-ahụkari na nke kachasi mma n'olu mmadu, n'ime akara eletrọniki nke a na'agbanwe site ná eriri ọwa kebụlụ na nkwukọrịta chanielu ndị ọzọ na ekwenti ọzọ nke na-emegharị ụda ahụ nye onye ọrụ na-anata ozi ahu. Okwu a sitere na Grik: τῆλε (tēle, anya) na φωνή (phōnē, olu), ha niile pụtara olu tere aka. Ihe eji marakarisia ya bụ ekwentị, nke malitere ọrụ kamgbe mmalite histiri ekwenti.

[1]

N'afọ 1876, Alexander Graham Bell bụ onye mbụ e nyere ikike ikike United States maka ngwaọrụ nke mepụtara ụda olu mmadụ nke ọma na ngwaọrụ nke abụọ.[2] Ọtụtụ ndi ọzọ mechara mepụtaba ngwá ọrụ a, ma ghọọ ngwa ngwa na azụmaahịa, gọọmenti, na ezinụlọ.

Ihe ndi di mkpa nke ekwenti gunyere igwe okwu (tiransimita) iji kwuo okwu na ịyefonu (resiva) nke na-emepụta olu na ebe tereaka.[3] A na arunye onye nnata na onye nzipụ ozi n'ime otu ekwenti nke a na-eweli elu na nti na ọnụ n'oge mkparịta ụka. Onye na-ezipụ ozi na-agbanwe ebili anụmihe nyegara mgbaàmà eletrik nke a na-eziga site na usoro mkpakọritaụka sistem gaa na ekwenti na-anata anata, nke na-agbanwere mgbaàmà ahụ ka ọ bụrụ ụda a na-anụ ọfụm na aka onye nnata ozi ma ọ bụ ọkà okwu dalụ-ụda. Ekwenti na-enye ohere izipu ozi n'akụkụ abụọ n'otu oge.

Ọtụtụ ekwenti nwekwara ihe na-adọ aka ná ntị, dị ka mgbịrịgba ma ọ bụ ihe ngosi anya, iji kpọsaa oku ekwenti na-abata. A na-amalitekari oku ekwenti na kiibọdụ ma ọ bụ mpinye, nke a na-etinye na ekwenti, iji tinye akara ekwenti, nke bụ adiresi ekwenti onye na-anata oku na sistemụ mkpakọrita, mana ụzọ ndi ọzọ di na akụkọ mmalite mgbe ekwenti bidoro.

  1. phone | Etymology, origin and meaning of phone by etymonline. www.etymonline.com. Archived from the original on 2020-10-27. Retrieved on 2020-10-15.
  2. Who Is Credited With Inventing the Telephone. Library of Congress. Archived from the original on 2020-10-18. Retrieved on 2020-10-14.
  3. United States Coast Guard Sound-Powered Telephone Talkers Manual, 1979, p. 1. Archived from the original on 2018-05-14. Retrieved on 2018-05-13.