Essien Ayi
Essien Ekpenyong Ayi bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu na-anọchite anya Calabar South/Akpabuyo/Bakassi Federal Constituency na House of Representatives.[1][2]
Mmalite ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Essien Ayi na 14 Ọktoba 1956 ma si na Cross River State.[1][3]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2003, a họpụtara ya dịka onye omebe iwu gọọmentị etiti n'afọ 2003 n'okpuru Peoples Democratic Party (PDP) ma jee ozi ruo 2023. Joseph Archibong Bassey nọchiri ya. Ọ bụ onye isi oche, Calabar South Local Government Area site na 1995 ruo 2002. Ọ bụbu onye nchịkwa nke Rovers Football Club Calabar. Ruo mgbe a họpụtara ya dị ka Onye isi oche, Cross Riva Steeti Football Association na Cross River State Sports Commission, ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ, Cross River South Development Authority.[1][4].[5]
Okpukpe
[dezie | dezie ebe o si]Essien Ayi bụ Onye Kraịst.[5]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 "Citizen Science Nigeria". citizensciencenigeria.org (in Bekee). Retrieved 2025-01-02.
- ↑ "Legislator Details - ConsTrack Track and Report on Governement Funded Projects in Nigeria". constrack.ng. Retrieved 2025-01-02.
- ↑ "National Assembly | Federal Republic of Nigeria". nass.gov.ng. Retrieved 2025-01-02.
- ↑ Asare, Asare (2023-02-27). "Cross River PDP Reps member, Essien Ayi loses after 24 years". Daily Post Nigeria (in Bekee ndị America). Retrieved 2025-01-02.
- 1 2 "Hon. Essien Ayi biography, net worth, age, family, contact & picture". www.manpower.com.ng. Retrieved 2025-01-02.