Esther Agbarakwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Esther Agbarakwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEsther Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Julaị 1985 Dezie
Ebe ọmụmụCalabar Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist, climate activist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Calabar, The Robert Gordon University, University of Massachusetts Dartmouth Dezie
so naEarth Charter Dezie
ebeCalabar Dezie
Ihe nriteLEAP Africa Dezie
Esther Agbarakwe
Born
Esther Kelechi Agbarakwe

(1985-07-21) 21 Julaị 1985 (age 38)
Calabar, Nigeria
EducationUniversity of Calabar
Robert Gordon University
OccupationClimate Change Activist
Public Servant

Esther Kelechi Agbarakwe bụ otu n'ime ṅdị na-akwalite ma na-ezisa ozi ihe gbasara ihu igwe n' ala Naijirịa amara maka mmeri ya na LEAP Africa nke asaa; Emume a na-eme kwa afọ ịji kwadoo ndị ntorobịa na-agbali n'ọchịchị na ngalaba dị icheiche n'afọ 2010. [1] [2]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Agbarakwe gụrụ Chemistry na Mahadum Calabar . [3] Ọ na - aguzi Master ugbu a na Mmekọ Nkwukọrịta nke Ọha na Mahadum Robert Gordon . [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Agbarakwe chọpụtara ọgbakọ ndị 'Nigeria Climate Coalition [5] ma jee ozi dị ka onye isi oche nke General Assembly ndị ActionAid Nigeria . [6] Ọ bụ otu n'ime ụmụ Youngers anọ ahọrọla isonye na-arụmaka ndị Elders + Youngers tupu nzukọ Rio + 20. [7] O jeela ozi dị ka onye na - ahụ maka nkwado mba ụwa na Population Action International . [8] Agbarakwe sonyere na nzukọ Mịnịsta ndọrọ ọchịchị nke High-Level Political Forum (HLPF) na Sustainable Development. [9] Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ gwara Amina J. Mohammed n’afọ 2015 mgbe ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka Gburugburu ala Naịjirịa. [10] Agbarakwe na-arụ ọrụ ugbu a na Climate na SDG Action Office nke Secretary General Envoy on Youth . [11]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2009, Agbarakwe nwetara ihe nrita nke Dekeyser & Friends Foundation na Germany. [12] N’afọ 2010, Agbarakwe meriri na LEAP Africa 7th Annual Leadership Awards. [2] Ahọputara ya na 2010 dika otu n'ime ndị Women Deliver100 Young Leaders bịa bụrụ otu n'ime ndị Commonwealth Youth Climate Fellow na November 2010. Ahoputara Agbarakwe maka Future Awards maka ime ọfụma na mgbasa ozi na 2011/2012 wee bụrụ onye otu Atlas Corps na Septemba 2012. N’afọ 2017 na Barcelona, e nyere Agbarakwe akara Crans Montana nke Ndị isi Ọhụụ nke Echi maka ọtụtụ ọ rụzuru n’ọchịchị. [13]

Mgbalị ya maka mgbasa ozi Mgbanwe Ihu Igwe[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2012, Agbarakwe sonyere na arụmụka kwadoro na UNICEF banyere Mgbanwe ihu igwe ebe ọ na-akwado maka ikike ndị ntorobịa nwere ike itinye olu ha na mkparịta ụka ahụ. [14] N'afọ 2015, o sonyere na mkparịta ụka nke ndi Guardian banyere ụzọ iji nwee ike ikwusara ụzọ mgbanwe ihu igwe ike. [15] N'akụkụ nke nnọkọ nke ọgbakọ nke United Nations General Assembly, Agbarakwe na ndị ọrụ mgbanwe ihu igwe nke Nigeria dịka Hamzat Lawal, zutere Onye isi ala Nigeria, Muhammadu Buhari ebe ha mere ikpe maka uru ndị na-eto eto na-eweta na mkparịta ụka ahụ. [16]

Ṅrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]