Gaa na ọdịnaya

Esther Gottesman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Esther G. Gottesman

Esther G. Gottesman (née Garfunkel; 1898-October 1, 1997) bụ onye America na-enyere ndị mmadụ aka na onye Zionist.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Gottesman bụ nwa nwanyị nke Aaron na Sarah Garfunkel.[1] Nna ya bụ onye guzobere Federation of Jewish Philanthropies . [2] Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum New York n'afọ 1921, afọ ọ lụrụ onye ọrụ ụlọ akụ na onye nchịkwa ntinye ego bụ Benjamin Gottesman; ọ nwụrụ n'afọ 1979.

Ọrụ Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Gottesman bụ onye nnọchiteanya na Nzukọ Zionist nke mbụ na-esote Agha Ụwa nke Abụọ, nke emere na Basel, Switzerland, n'afọ 1946. [1] Ọ bụụrụ onye òtù World Zionist Organization Action Committee n'afọ ndị mbụ nke mba Israel.[1]

Ọ nọ na-arụsi ọrụ ike na Board of Jewish Education (New York) . [1] Ọ bụ onye òtù bọọdụ nke Hadassah Women's Zionist Organization of America site n'afọ 1946 ruo mgbe ọ nwụrụ. [1][2]

A na-ekwu na Gottesman mepụtara akwụkwọ akụkọ ụlọ Hadassah la ọ ghọọ Hadassah Magazine. [1][2]

Gottesman rụgidere nwanne di ya Samuel Gottesman zụta Akwụkwọ Mpịakọta Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ ma nye ha Israel; ezinụlọ ahụ wuru Shrine of the Book na ọ́báǹkà Israel iji jide akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ.[1][2]

Ndụ onwe onye Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Gottesman nwere ụmụ nwoke abụọ, David S. Gottesman na Milton M. Gottesman. [1]

Gottesman na di ya bụ ndị nyere onyinye na Mahadum Yeshiva, ebe a kpọkwasịrị Ọ́bá Akwụkwọ Mendel Gottesman aha nna di ya.[1]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 4 5 6 7 8 9 Nemy. "Esther G. Gottesman, 98, Zionist With Role in Scrolls Acquisition", New York Times, 2 October 1997. Retrieved on 11 June 2019.Nemy, Enid (2 October 1997). "Esther G. Gottesman, 98, Zionist With Role in Scrolls Acquisition". New York Times. Retrieved 11 June 2019.
  2. 1 2 3 4 Greenberg. "Esther Gottesman: For 50 years a variety of hats for Hadassah", New York Jewish Week, 8 April 1983.Greenberg, Eric (8 April 1983). "Esther Gottesman: For 50 years a variety of hats for Hadassah". New York Jewish Week.