Gaa na ọdịnaya

Eva Ahnert-Rohlfs

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Eva Ahnert-Rohlfs (11 ọgọọst 1912 - 9 Maachị 1954) bụbu onye na-enyocha mbara igwe nke German.[1] O mere nkena anya n'ihe gbasara kpakpando na-agbanwe agbanwe.[2]

A mụrụ Eva Ahnert-Rohlfs na Coburg (Duchy Saxe-Coburg-Gotha). Ọ gụrụ akwụkwọ na Würzburg, Munich na Kiel site na afọ 1931 ruo afọ 1933. Mgbe afọ itoolu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndụ ezinụlọ gasịrị, ọ gụrụ akwụkwọ site na afọ 1942 ruo na njedebe nke Agha Ụwa nke Abụọ na Mahadum Göttingen. Site na afọ 1945, ya na prọfesọ Cuno Hoffmeister rụkọrọ ọrụ dị ka osote onye na-enyocha mbara igwe na Sonneberg Observatory. N'afọ 1951, ọ nwetere akara ugo mmụta doctorate na astrophysics na Mahadum Jena. Na Sonneberg Observatory Eva Rohlfs zutere onye na-enyocha mbara igwe Paul Oswald Ahnert ma ha lụrụ na afọ 1952. [3]

Site na Sonneberg observatory o mere nchọpụta dị mkpa nke kpakpando agbanwe agbanwe nke ọ kọwara n'isiokwu ahụ "Na nhazi na mmalite nke Perseid ugbu a" (German: Zur Struktur und Entstehung des Perseidenstroms) gụnyere na Observatory Publications Sonneberg Astronomical . [4]

Eva Ahnert-Rohlfs nwụrụ mgbe ọ dị afọ 41 na Sonneberg . [5]

Akwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]
  • "Strahlungsdruck, Poynting-Robertson-Effekt und interstellare Materie". Mitteilung der Sternwarte Sonneberg 43 (1953)
  • ""Vorläufige Mitteilung über Versuche zum Nachweis von Meteoritischem Staub." Mitteilung der Sternwarte Sonneberg 45 (1954)
  • "Zur Struktur der Entstehung des Perseidenstroms". Veröffentlichung der Sternwarte Sonneberg (akụkụ 2, peeji nke 5-38) (1956)  

Akụkọ ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]
  • AN 281 (1954) 284 (otu ahịrịokwu)
  • Cuno Hoffmeister: "Eva Ahnert-Rohlfs" (Die Sterne mbipụta 5/6, 1954, peeji nke 103-105)  

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Ahnert-Rohlfs (1957). "Die Säkularstörungen des Scorpius-Sagittarius-Stroms" (in de). Astronomische Nachrichten 284 (1): 27–30. DOI:10.1002/asna.19572840108. ISSN 1521-3994. 
  2. Women in Astronomy Bibliography – Library of Congress, Science Reference Services. Library of Congress. Retrieved on 2019-06-29.
  3. Kopff (1954-09-01). "Franz Karl Zweck". Astronomische Nachrichten 281 (13): 284. DOI:10.1002/asna.19522811315. ISSN 0004-6337. 
  4. Eva Ahnert-Rohlfs, estrella variable del firmamento | (es). Principia (2017-03-09). Archived from the original on 30 November 2023. Retrieved on 2021-10-26.
  5. Eva Ahnert-Rohlfs, astrónoma | Efemérides (es). Mujeres con ciencia (2015-08-11). Retrieved on 2019-06-29.