Farida Mzamber Waziri

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Farida Mzamber Waziri
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereFarida Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Julaị 1946 Dezie
Ebe ọmụmụGboko Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, Mahadum nke Ȯra Lagos, Mahadum nke Ibadan Dezie

Farida Mzamber Waziri (onye a mụrụ n'ụbọchị nke 7 n'ọnwa Julai nke afọ 1949) bu onye Naijiriabụ teknokrat, onye mmanye iwu na onye bụbu onye isi oche ndi Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) [1] nke Naijiria. Ọ nọchiri Nuhu Ribadu n'ọkwa a.

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Farida Mzamber Waziri n'ụbọchị nke 7 n'ọnwa Julaị n'afọ 1949 ma zụlite ya na Gboko,nke Benue Steeti . O nwetar nzere bachelọ nke iwu na Mahadum nke Legọs ma nweta nzere masta na Iwu na Lagos State University . N’afọ 1996, o nwetara nzere masta na Strategic Studies na Mahadum nke Ibadan . [1] Ọ bụ onye dere Advance Fee Fraud, National Security and the Law. [2]

Ọrụ ndị uwe ojii[dezie | dezie ebe o si]

Farida Waziri debara aha na ndị uwe ojii nke Naijiria n'afọ 1965 were rịgoro n'ọkwa osote onye isi ndị uwe ojii. O jibu ọkwa nke osote onye isi ndị uwe ojii (Ọrụ), nnyocha na nhọpụta, osote onye isi ndị uwe ojii CID Alagbon, Legọs, Kọmịshọna ndị uwe ojii, Nchọpụta izugbe na Kọmịshọna ndị uwe ojii na-ahụ maka X-Squad. N'ọkwa ikpeazụ a, ọ bụ ya na-ahụ maka ikpe iri ngo na nrụrụ aka n'ime ndị uwe ojii. O jekwara ozi dị ka Kọmishọna ndị uwe ojii (ngalaba aghụghọ pụrụ iche) bụ nke o dere ndekọ ikpe mmeri mbụ maka Advance Fee Fraud na Naijiria. [1]

O duru ndị nnọchi anya West Afrịka na Advance Fee Fraud na Lyons,nke Frans n'afọ 1996. O duru ndị nnọchi anya Naijiria gaa Dallas,na Texas maka nzukọ ọmụmụ nke United States Secret Service haziri n'afọ 1998.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Senator Ajuji Waziri, onye bụbu onye nnọchi anya gọọmentị Naijiria na Tọki nke nwụrụ n'afọ 2017. [3]

Onye isi oche EFCC[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ndị kọmitii Sineti na-ahụ maka nrụrụ aka na-enyocha ya maka ọrụ EFCC, ọ gọrọ na ya eguzola ka onye nchekwa gọvanọ chịburu Benue Steeti, bụ Sịnetọ George Akume mgbe e boro ya ebubo nrụrụ aka. [4] Onye isi ala Umaru Yar'Adua nabatara ya dịka onye isi oche EFCC n'ọnwa Mee afọ 2008, ma jụkwa ịnakwere ọkwa ya ahụ ruo mgbe ndị sịneti nabatara ya. [5] [6] [7] Nhọpụta n'ọkwa a butere esemokwu. [8] Obere oge a họpụtachara ya, Waziri nyochara ebe ndị EFCC na-akpọchị ndị mmadụ iji chọpụta ọnọdụ ndị a na-enyocha. [9] N'ọnwa Septemba afọ 2008, Waziri kwuru na e nweghị ike ịkwado ebubo nrụrụ aka onye bụbu onye isi ala Olusegun Obasanjo na ụfọdụ ndị bụbụ ndị gọvanọ steeti makana faịlụ ndị ahụ adịghị ma ọ bụ na ha efuola.

N’ọnwa Ọgọstụ n’afọ 2008, ndị EFCC nwụchiri onye osote onye isi nke PDP Bode George na Legọs ma kpụpụ ya na mmadụ anọ ndị ọzọ na ebubo 163 eboro ha maka ị gba izu, i nupụrụ iwu isi, i mebi ụlọ ọrụ na ị nye ọrụ kọntraktị ruru ijeri naira 84 n'ụzọ megidere iwu mgbe ọ bụ onye isi oche nke NPA. N’ọnwa Ọktọba afọ 2009, a mara Bode George ikpe ma maa ziga ya mkpọrọ ọnwa 30.

N’ọnwa Eprel afọ 2009, Waziri kwuru na ndị EFCC na-akwado ị wepụta onye bụbu Mịnịsta nke Federal Capital Territory bụ Mallam Nasir El-Rufai n’aka Amerịka ka ọ zaa ebubo. O kwukwara na Onyeisiala kwadoro mweghachi nke Nigeria Police Force Insurance Benefits nke so na ijeri naira 17 nke enwetara n'aka onye isi nke ndị uwe ojii bụ Mustafa Adebayo Balogun, n'agbanyeghị na Alhaji Tafa Balogun na-achọ ị weghachita akụ ndị a. O kwuru na ikpe ruru 200 na-echere maka nrụrụ aka, mpụ ego, igwu wayo, mgbochi mmanụ na-akwadoghị na mmebi nke okporo igwe mmanụ. [10]

N’ọnwa Juun afọ 2009, ka ọ na-ekwu okwu na nnọkọ ogbako iji gosi afọ mbụ ya n’ọchịchị, Farida Waziri kwuru na ndị EFCC na-aga n’ihu n’ịgba mbọ iji gbaa ndị bụbu gọvanọ akwụkwọ gụnyere Dọkịnta Peter Odili nke Rivas steeti, Sịnetọ Bola Tinubu nke Legọs Steeti, Ayo Fayose nke Ekiti Steeti, Joshua Dariye nke Plato Steeti, Saminu Turaki nke Jigawa Steeti, Jolly Nyame nke Taraba Steeti na Michael Botmang nke Plato Steeti . Ndị ọzọ a na-enyo enyo n'ọkwa dị elu gụnyere Sịnetọ Nicholas Ugbane na onye bụbụ Mịnịsta FCT bụ Nasir El-Rufai. O gosipụtara obi nkoropụ n' igbu oge nke n'ụlọ ikpe n'okwu ndị a. O kwukwara na ya ga-ebido ị gba mgbaba n'ikpe ị nwe akụnụba n'Abuja.

Na Mee 2009, e nwere akụkọ banyere mgba Daịrektọ nke Opụreshọns nke EFCC, Maazị Tunde Ogunshaki, bụ onye Waziri chụrụ n'ọrụ, o yiri ka ọ metụtara James Ibori, Atọnị Jenara nke Naijiria, Mike Aondoakaa na Inspekta Jenara nke ndị uwe ojii Mike Mbama Okiro . N’ọnwa Mee kwa, ndị EFCC nwudoro onye isi oche Kọmitii sịneti n'ọkụ, Sịnetọ Nicholas Ugbane, odeakwụkwọ izugbe nke mịnịstịrị na-ehụ maka ọkụ,bụ Alhaji Abdullahi Aliyu na ndị ọzọ, n’ihe gbasara aghụghọ ọrụ ijeri naira 6 maka ọkụ latrik ime obodo. Ka oge na-aga n’afọ ahụ, EFCC nyere ndị isi nke Nigeria Labour Congress ndepụta nke ndị a ma ama dị iri ise na isii bụ ndị Naijiria e boro ebubo na ha nọ na-ezu ego obodo nke ruru ijeri naira 243.

Nchụpụ na ọrụ ngwụcha[dezie | dezie ebe o si]

Onye isi ala Goodluck Jonathan wepụrụ Waziri n'ọkwa ya n'ụbọchị nke 23 n'ọnwa Nọvemba afo 2011 were tinye Ibrahim Lamorde n'ụbọchị nke 28 n'ọnwa Nọvemba afọ 2011 ka ọ nọchite anya ya dịka onye isi oche mgbe ahụ. [11] Nchụpụ ya nwere ike ịbụ maka ebubo na EFCC na-ahọrọ na nyocha ya, ma ọ bụ esemokwu ya na onye ọka ikpe-ukwu na Mịnịsta Ikpe nkwụmọtọ, Mohammed Bello Adoke maka ịkagbu ikpe a kpọtara n'ụlọ ikpe. E boro ebubo na Waziri nwere ike i mebi nyocha nke oshi ego megide onye bụbu gọvanọ nke Bayelsa steeti, Timipreye Sylva [12] N'ọnọdụ ụfọdụ, dịka ọ dị na ikpe megide onye bụbu gọvanọ Edo Steeti bụ Lucky Igbinedion, ụlọ ikpe ahụ nyere ntaramahụhụ na- ekwesịghị ekwesị . Mana, ndị EFCC nwere ike i meghe ụzọ maka nkea site na i kwere ị nabata arịrịọ. [13] Ka ọ hapụsịrị ọrụ, akụkọ dị na Waziri na-atụle i de akwụkwọ banyere ahụmịhe ya na EFCC. [14]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Executive Chairman, EFCC. Economic and Financial Crimes Commission (11 June 2008).
  2. Advance fee fraud: national security and the law. BookBuilders / Editions Africa. 
  3. "Former EFCC boss, Farida Waziri loses husband", Vanguard Media Limited, 19 April 2017. Retrieved on 11 March 2019.
  4. Nigeria: EFCC Chair – Farida Will Do Better. Leadership (Abuja) (7 June 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  5. Nigeria: Senate May Confirm Farida Today. Leadership (Abuja) (27 May 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  6. Yar'Adua Appoints Farida Waziri EFCC Chairman. Leadership (Abuja) (16 May 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  7. FG Returns Lamorde to EFCC. Leadership (Abuja) (30 May 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  8. Farida Waziri and the Anti-Graft War. ThisDay (23 June 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  9. Waziri Inspects EFCC's Detention Facilities. Vanguard (28 July 2008). Retrieved on 25 September 2009.
  10. EFCC Seeks El-Rufai's Extradition-Tafa Balogun Wants Back Assets. Daily Trust (16 April 2009). Retrieved on 25 September 2009.
  11. Farida Waziri hands over to Lamorde. P.M. News (28 November 2011). Retrieved on 22 December 2011.
  12. Waziri's Sack and the Future of EFCC. P.M. News (28 November 2011). Retrieved on 22 December 2011.
  13. FARIDA WAZIRI: The unfinished business. Vanguard (Nigeria) (27 November 2011). Retrieved on 22 December 2011.
  14. Ex-EFCC Chairman, Waziri goes on course in UK. Vanguard Nigeria (10 December 2011). Retrieved on 22 December 2011.