Fatima Akilu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fatima Akilu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụpsychologist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Reading, Beechwood Sacred Heart School Dezie
academic thesisA multimethod investigation into the experience of single homelessness Dezie

Fatima Akilu bu onye Naijiria bụ ọkà mmụta n'akparamàgwà mmadụ, bụrụkwa onye na-ekwu okwu n'ọhaneze n'ihe gbasara Preventing and Countering Violent Extremism (CVE) and Counter-Terrorism. [1] Ọ bụ Ezekutiv Daịrektọ nke Neem Foundation ugbua, [2] na onye bụbu ntụzịaka gbasara nnyocha akparamaagwa na nkwukọrịta okwu n'ụlọ ọrụ nke National Security Adviser na Naịjirịa, ebe ọ rụrụ ọrụ na Countering Violence Extremism Programme n'afo 2014. Ọ bụkwa onye otu Global Strategy Network ya na ọkachamara ụlọ ọrụ Richard Barrett na ndị ọzọ. [3]

Fatima bụkwa onye na-ede akwụkwọ ụmụaka, yana onye mmekọ nke Women Alliance for Security Leadership (WASL). [4]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya nye Ali Akilu (onye ugwu bụ ode akwụkwọ nwụgoro nke ngwụcha ugwu) na Hajia Astajam. Dr. Akilu gụrụ akwụkwọ na Beechwood Sacred Heart School, Tunbridge Wells . O nwere nzere Ph.D na MRes na Psychology na Mahadum nke Reading, dị na United Kingdom na nzere BA na Bekee na Psychology sitere na Mahadum nke Mount St. Mary (Los Angeles) . [2] [5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Fatima Akilu bu onye oka mmuta nke NHS na fọrịnzik saịkọlọji, bu onye okacha amara n’agwo ndi dara iwu nwe oria mmepe na oria isi mgbaka, o nwere ihe kariri afọ iri abuo n'ihe gbasara ahụ ike ọgụgụ isi n'akparamagbwa mmadụ. Dịka onye ọrụ ndị ntorobia na Lọndọn, Fatima nyere ndị na-eto eto na-enweghị ebe obibi ndụmọdụ,ma mgbe ọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ ndị isi mgbaka na Washington ọ dụrụ John Hinckley Jr ndụmọdụ, nwoke ahụ nwara i gbu Ronald Reagan . [6]

Ọ bụkwa onye nkụzi mahadum na onye na-akwado ndị a na-emegbu, na-arụ ọrụ na ngalaba nke akparamaagwa na ahụike ruo ihe karịrị afọ iri abụọ. [7] Na-arụ ọrụ dịka Ajọnkt Prọfesọ nke General Psychology na SUNY Broome Community College (USA) ihe karịrị afọ 12. Ọ kuziela ma dee ọtụtụ akwụkwọ nyocha metụtara enweghị ebe obibi, agbụrụ na mmekọrịta ha na ahụike ọgụgụ isi. [2]

Ọ bụbu onye isi kọmụnikeshọn nke onye Ọkachamara ukwu pụrụ iche nke Onye isi ala na Millennium Development Goals, ọ bụ Onye isi oche Editorial Board nke akwụkwọ akụkọ Leadership. [7] Akilu bụbu onye ntụzịaka gbasara nyocha akparamaagwa na nkwukọrịta okwu n'ụlọ ọrụ nke National Security Advisor na Naịjirịa, ebe ọ rụrụ ọrụ Countering Violent Extremism Programme n'etiti afọ 2012 na 2015. [1] Ihe omume CVE bụ otu atụmatụ gọọmentị ga-adị ogologo oge iji gboo Boko Haram ; otu ndị agha ntịịkpọ kpatara ọnwụ nke ihe karịrị mmadụ 20,000 na Naijiria. [8] N'ịkọwa dịka nnwale siri ike na nnyocha iji ghọta ma lebara ihe kpatara mbuso agha a anya, emume CVE nke Naijiria bụ ịdọ aka na ntị dị iche iche na-eleba anya na ndị otu Boko Haram, ndị ntorobịa, na ndị ọzọ na-adịghị ike site na mmemme mmekọrịta na-enye ha uzo ozo karịrị i sonye ndị agha ntịịkpọ. Mmemme ndị a lebara anya na mmekọrịta dị n'etiti mmepe na nchekwa n'ọkwa obodo. [4] Akilu e sorola nwunye nke ndị ọchịagha Boko Haram gbapụrụ agbapụ, bụ ndị na-eweta ihe ịma aka pụrụ iche ebe ọ bụ na ha na-enwetakarị ọnọdụ nkwanye ùgwù na ikike dị n'etiti ọha mmadụ na-enupụ isi na-achọkarị ịlaghachi [9]

Akilu bu onye isi Ezekutiv Daịrektọ nke Neem Foundation, otu na- abụghị nke gọọmentị e hiwere ka nzaghachi nye nsogbu nke enweghị nchekwa na Naijiria. [2]

Ide ihe[dezie | dezie ebe o si]

Akilu bụkwa onye edemede akwụkwọ ụmụaka, onye dere akwukwo umuaka iri na asaa. O deela akwukwo asato na Millennium Development Goals maka ụmụaka iji kuziere umuaka ihe banyere otutu omenala tinyere okwu mmepe mba uwa. Ọ na-edu ugbu a mgbasa ozi iji mee ka ụmụ Naijiria gụọ akwụkwọ 100 n'otu afọ.

Ọrụ e bipụtara[dezie | dezie ebe o si]

  • Ngozi Comes to Town ( Cassava Republic Press, 2008)
  • Timi's Dream Comes True (Cassava Republic Press, 2008)
  • Ketwa Plays the Drum (Cassava Republic Press, 2011)
  • Yinka Washes His Hand (Cassava Republic Press)
  • The Red Transistor Radio (Cassava Republic Press)
  • The Yellow Mosquito Net (Cassava Republic Press)
  • Preye and the Sea of Plastic (Cassava Republic Press)
  • Aliyah Learns a New Dance (Cassava Republic Press)
  • Zahra and Coco Alphabet (Mockingbird Publishers)
  • Ashraf: Flying Saucer (Mockingbird Publishers, 2011)

Onyinye na nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • Zahra and Coco Alphabet, 2012 Winner of Moonbeam Children's Book Award's Gold prize in the Alphabet/ Counting Book category.[10]
  • ‘Preye and the Sea of Plastics’ by Fatima Akilu and ‘Mayowa and the Masquerade’ by Lola Shoneyin: Joint Winners for the ANA/Atiku Abubakar Prize for Children's Literature.

Nrụtụka[dezie | dezie ebe o si]