Fidelis Wainaina
Fidelis Wainaina (1962 – 5 Maachị 2008) bụ onye guzobere Maseno Interchristian Child Self Help Group (MICH), otu nzukọ na-agba mbọ maka nkwado onwe ya site na ọrụ ugbo, maka ndị ime obodo ọdịda anyanwụ Kenya. Ọ meriri ihe nrite Yara na 2006 yana Celina Cossa nke Mozambique. [1]
Onye bụbu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ, Wainaina gbahapụrụ ọrụ nkụzi ya mgbe iwesasịrị ya na usoro ọmụmụ nke na-akwadebe ụmụ akwụkwọ karịa maka ihe ndị bụ eziokwu nke ndụ n'èzí klas. Ọ rụrụ ọrụ ikpochapụ ịda ogbenye na agụụ site n'inyere ezinụlọ ndị dara ogbenye aka ịkọ ala ha nke ọma.[1] Ndị Luo nke ọdịda anyanwụ Kenya mara amara dị ka Nyar Okuyo (ada ndị Kikuyu), Wainaina bụ onye mmeri nke "mgbanwe okike" n'ịkwado maka inye ụmụ nwanyị ike. Ndị otu ya lekwasịrị anya na mmepe bụ ọkachasị ụmụaka n'okporo ámá na ndị inyom di ha nwụrụ, ọkachasị ndị ọrịa nje HIV na AIDS mebiri.[2]
Ọ nwụrụ na 5 Machị 2008 mgbe ọ dị afọ 46, [3] mgbe a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa kansa. [4]
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ The Yara Prize laureates. Yara (2006). Archived from the original on November 29, 2014. Retrieved on November 14, 2014.
- ↑ Woman tills tiny piece of land to fame. Archived from the original on 2008-05-03. Retrieved on 2008-04-02.
- ↑ "Obituaries 2008".. Archived from the original on 2020-02-24. Retrieved on 2017-12-23.
- ↑ Untimely loss of Fidelis Wainaina. Archived from the original on 2008-11-21. Retrieved on 2008-04-02.