Funmi Iyanda

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Funmi Iyanda
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereFunmi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Julaị 1971 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụtalk show host, Onye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, International School Ibadan Dezie
Ihe nriteBBC 100 Women, OkayAfrica 100 Women Dezie
blọọgụ gọọmentịhttp://fiyanda.blogspot.com/ Dezie

 

Olufunmilola Aduke Iyanda (a mụrụ n'ụbọchị nke 27 n'ọnwa Julaị nke afọ 1971), onye a mara nke ọma dịka Funmi Iyanda [1], bụ onye Naịjirịa na-ahazi mkparịtaụka n'onyonyo, onye mgbasa ozi, onye nta akụkọ na onye na-ede blọọgụ. [2] [2] O weputara ma kwado ngosi mkparịtaụka a, New Dawn with Funmi, [4] nke gosipụtara na netwọkụ Naijiria ihe karịrị afọ asatọ. Funmi bu onye isi ndi Ignite Media. N’afọ 2011 ka a kwanyere Funmi Iyanda ugwu maka usoro weebụ ya [3] nke World Economic Forum [4] were kpọọ aha ya n'otu n'ime Forbes “20 Youngest Power Women in Africa” [5]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Funmi Iyanda na Legọs n'ezinụlọ Gabriel na Yetunde Iyanda. Nna ya si n'obodo Ogbomoso, ma nne ya si n'obodo Ijebu-Ode . O tolitere na mpaghara Legọs Menlandị; kosiladị, nne ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ asaa. Ọ gara ụlọ akwụkwọ African Church Princess Primary School, nke Akoka, yana Herbert Macaulay School na Legọs, nke Naijiria maka agụmakwụkwọ praịmarị ya na International School Ibadan maka agụmakwụkwọ sekọndịrị ya. O mechara gaa Mahadum nke Ibadan ebe ọ gụsịrị akwụkwọ ma nweta nzere bachelọ na Jiogụrafi. [6]

Good Morning Nigeria na akwụkwọ akụkọ egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

Funmi i me ihe ngosi mkparịtaụka onyonyo bidoro mgbe ọ malitere ma na-ahazi Good Morning Nigeria, ihe ngosi ụtụtụ nke televishọn. Mpaghara "Heroes", nke buliri mmeta nke ndị kwesiri ekwesi nye ọhaneze, na "Street Life", nke na-a dịghị ka ọtụtụ ihe ngosi oge ahụ, gara n'okporo ámá ịchọ akụkọ ndị na-akpali mmasị ndị mmadụ na Naijiria. [7]

Ihe ngosi a lekwasịrị anya na ikpe na-ezighị ezi nke ndị Naijiria tara ahụhụ, ọkachasị ndị otu ndị na-adịghị ike dịka ụmụ nwanyị na ụmụaka. E gosipụtara ihe ngosi a na telivishọn Naijiria. [8]

Ihe ngosi izizi ọ haziri bụ MITV Live, nke Segun Odegbami na Tunde Kelani rụpụtara . [9] Ọ sorokwara agụụ miri emi o nwere n'egwuregwu site na ị banye na akwụkwọ akụkọ nke egwuregwu. Ọ rụrụ ọrụ na akwụkwọ akụkọ nke 2006 Africa Cup of Nations ma kpuchie 1999 World Football World Cup, All Africa Games na Zimbabwe, yana Olympic Games na Sydney na Athens n'afọ 2000 na 2004. [10] [11]

New Dawn with Funmi[dezie | dezie ebe o si]

New Dawn with Funmi bidoro n’afọ 2000 ma na-aga kwa ụbọchị na NTA 10 Legọs. Ihe ịga nke ọma nke ihe ngosi ahụ mere ka ọ bụrụ ihe ngosi kachasị ogologo oge arụpụtara n'onwe ya na NTA. [12] [13] [14]

Funmi dekwara kolum oge nile na Tempo Magazin. N'oge ụfọdụ, ọ ka na-eje ozi dị ka onye ode akwụkwọ nke <i id="mwRg">Farafina Magazin</i> . O dekwara akwụkwọ akụkọ nye PM NEWS, The Punch, Daily Trust, na akwụkwọ akụkọ Vanguard . [15]

Talk With Funmi[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2010, mgbe ezumike afọ abụọ ya gasịrị, ọ laghachiri na ihuenyo site na Talk with Funmi ( TWF ), ihe ngosi telivishọn nke Chris Dada duziri. Talk With Funmi na- ejegharị na Naịjirịa niile, site na steeti ruo na steeti, na-ejide ndị mmadụ ma na-akparịta ụka na mba dum. [16] [17]

My Country: Nigeria[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2010, Funmi Iyanda rụchara ihe omume My Country: Nigeria, nke nwere akuko akwukwo ato nke na-eme emume ncheta afọ iri ise nke nnwere onwe obodo a, nke e wepụtara na BBC World Service. Lagos Stories, otu n'ime ngosipụta nke ihe nkiri ahụ ka a họpụtara na katigori maka "Best News Documentary" na Monte Carlo Television Festival na Monaco n'afọ 2011. [18] [19] [20]

Chopcassava[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2012, Funmi Iyanda na onye otu ya Chris Dada rụpụtara Chopcassava.com, [21] [22] websaịtị nke na-ede akwụkwọ ngosiputa ngaharị iwe enyemaka mmanụ ọkụ nke Jenụwarị afọ 2012 e mere na Legọs, [23] nke Naijiria. E nweghi ike i gosipụta ya n'ihe onyonyo Naijiria, usoro ịntanetị a na-enye echiche nke ime maka ngaharị iwe nke Legọs a, bụ nke ndị mmadụ niile gara n'okporo ámá na-achọ ka a gbanwee ntụgharị nke pasentị 117 na ọnụahịa mmanụ ụgbọ ala. A hoputara ya na akwukwo ndi ozo mere eme na 2012 BANFF World Media Festival, na Alberta,nke Kanada. [24] [25]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Funmi bụ onye otu African Leadership Institute, Tutu Fellow, na onye sonyere na ASPEN Institute's Forum for Communications and Society. [26]

N’afọ 2012, onye Gọvanọ Legọs Steeti, Babatunde Raji Fashola kwanyeere ya ugwu maka mbọ ọ gbara maka ị kwado ihe gbasara nwoke na nwanyị ka ọ laghachitere ụbọchị ise nkwado UN advocacy trek n’ugwu Kilimanjaro . Ọ bụ UN haziri ọrịrị a iji bulite mmata ụwa niile na mgbasa ozi ya iji kwụsị ihe ike megide ụmụ nwanyị na ụmụaka nwanyị, were mee ka ndị na-arị elu si mba karịrị 32 nke Afrịka gaa njem akụkọ ihe mere eme n'ugwu Kilimanjaro. [27] [28] [29] [30]

Funmi na-eje ozi n'otu bọọdụ nke Farafina Trust nakwa Positive Impact Youth Network. O sonyere na usoro ngagharị iwe nke Occupy Nigeria na Jenụwarị afọ 2012. Ngagharị iwe ndị a bụ iji gbochie atumatu nke mwepu enyemaka mmanụ ọkụ nke gọọmentị. [31] [32] [33]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Funmi Iyanda discusses beauty with John Maclean (en-US) (2017-06-20).
  2. "Sharing a dawn with Funmi", The Guardian Life, 26 October 2009.
  3. ASK, FUNMI (en-US).
  4. World Economic Forum as a Young Global Leader (YGL), Funmi Iyanda Chief Executive Officer, (en). Archived from the original on 2020-11-27. Retrieved on 2020-11-19.
  5. "Funmi Iyanda: ‘I’m Not Competing With Mo’ Abudu’", 21 February 2010.
  6. Group Patron | Africa Research Group | University of Leicester. le.ac.uk. Archived from the original on 2020-10-26. Retrieved on 2020-11-19.
  7. editor (2019-09-21). Funmi Iyanda Comes Out ‘Walking with Shadows’ (en-US).
  8. Nkem-Eneanya (2014-05-19). Funmi Iyanda; The Multi-Talented Media Personality and TV Icon (en-GB).
  9. Jumoke Giwa, "Conversations: Meet Funmi Iyanda 'Nigeria's queen of talk'", Nigeria Village Square, 26 August 2006.
  10. Funmi Iyanda, Olumide Makanjuola, Kunle Afolayan, Others, Witness ’Walking With Shadows’ Premiere (See photos) (en-US) (2019-11-16).
  11. Funmi Iyanda: The Legend Of A Woman.
  12. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  13. Archive copy. Archived from the original on 2016-08-26. Retrieved on 2020-11-19.
  14. Archive copy. Archived from the original on 2019-06-16. Retrieved on 2020-11-19.
  15. Funmi Iyanda Comes Out ‘Walking with Shadows’. THISDAYLIVE (2019-09-21).
  16. Oya Media UK Announces Season 2 Of ASK Funmi Series | CR (en-GB).
  17. Funmi Iyanda Comes Out 'Walking with Shadows' (en-US).
  18. Funmi Iyanda Dazzles At Monte Carlo Television Festival (en-US).
  19. Occupy Nigeria (en-US).
  20. Funmi Iyanda: Blazing a Trail as a Debutante Movie Producer (en-US).
  21. Funmi-iyanda Chop Cassava - FabWoman | News, Style, Living Content For The Nigerian Woman (en-US).
  22. Chopcassava - Documenting Nigeria's Fuel Subsidy Struggle - Video Blog (en).
  23. Funmi Iyanda has a bold new movie out. But don’t call it a comeback. (en-GB).
  24. World Economic Forum names Funmi Iyanda Young Global Leader (en-US).
  25. What’s Not To Love About Media Activist- Funmi Iyanda (en-US). Archived from the original on 2023-07-26. Retrieved on 2020-11-19.
  26. writer, Staff (2015-05-07). Nigeria’s Funmi Iyanda, Appointed UN Women Gender Equality Champion [@Funmilola] (en-US).
  27. ‘I Was the First Person to Come Out as Gay on Live TV in Nigeria’. Retrieved on 2020-05-02.
  28. Voices and profiles .:. Gender equality champions. Retrieved on 2020-05-02.
  29. Fashola Receives Funmi Iyanda On Return From Mt. Kilimanjaro In Aid Of Women’s Cause. Retrieved on 2020-05-02.
  30. Funmi Iyanda To Climb Mt. Kilimanjaro (2012-02-28). Retrieved on 2020-05-02.
  31. NIGERIAN WOMEN SAY ABSOLUTE NO TO FUEL SUBSIDY REMOVAL (en) (2012-01-10).
  32. About (en-US).
  33. Is Funmi Iyanda staging a comeback? » Tribune Online (en-GB) (2019-03-02).

Ọgụgụ ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Oyeleye, Albert (2012). "Interaction Management in Nigerian Television Talk Shows". International Journal of English Linguistics. 2. doi:10.5539/ijel.v2n1p149.
  • Nsehe, Nfonobong. "The 20 Youngest Power Women In Africa", 1 August 2011.
  • Makwemoisa, Anthonia (2006). Women of valour. 

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]