Gabriel Toby
Gabriel Toby | |
|---|---|
| Deputy Governor of Rivers State | |
| In office 1999–2007 | |
| Governor | Peter Odili |
| Succeeded by | Tele Ikuru |
| Constituency | Rivers State |
| Personal details | |
| Born | Gabriel Tamunobiebere George Toby |
| Nationality | Nigerian |
| Political party | People's Democratic Party |
| Spouse | Christie Toby |
| Children | Sotonye Toby, Abinye Toby, Ibim Semenitari |
| Alma mater | University of Nigeria, Nsukka |
| Profession | Economist, Politician |
Gabriel Tamunobiebere George Toby bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria nke People's Democratic Party, onye na-ahụ maka akụ na ụba na onye bụbu onye ọrụ gọọmentị nke jere ozi dị ka osote Gọvanọ nke Rivers Steeti n'okpuru Gọvanụ Peter Odili site na afọ 1999 we ruo 2007. [1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]O sitere na Opobo, Toby bụ onye gụchara akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa, Nsukka. Ọ gụrụ Economics ma nweta nzere bachelọ na afọ 1963.[2]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Toby rụkwara ọrụ dị ka onye ọrụ gọọmentị na ụlọ ọrụ gọọmentụ dị iche iche, na-arịgo n'ọkwa Director General tupu ọ laa ezumike nká na afọ 1994. Ọfịs ndị ọzọ ọ jere ozi gụnyere Pro-Chancellor, na Chairman Governing Council, Mahadum Benin, Pro-Chancelor na Chairman, Governing Council، Mahadum Port Harcourt na Chairman of Council, Rivers State Polytechnic, Bori. Na afọ 1999, a họpụtara Toby dị ka onye nnọchiteanya nke People's Democratic Party maka osote Gọvanọ. A họpụtara ya n'ikpeazụ ma jee ozi n'okpuru Gọvanọ Peter Odili. Na afọ 2006, ọ ghọrọ onye Naijiria mbụ nwetara National Merit Award of Accomplished na onye osote gọvanọ kachasị mma na mba ahụ.[3][4]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta nke ndị si Rivers State
- Onye osote Gọvanọ nke Rivers State
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "2015: Deputy Governors That May Not Succeed Their Bosses", Leadership, 4 October 2014. Retrieved on 3 March 2015.
- ↑ "RSG donates 10 computers to UNN", BiafraNigeria World News, 10 October 2003. Retrieved on 3 March 2015.
- ↑ "Toby Emerges Best Deputy Governor", Thisday, 16 May 2006. Retrieved on 3 March 2015.
- ↑ District Leadership. Rotary International District 9140. The Wayback Machine. Archived from the original on 19 July 2011. Retrieved on 3 March 2015.