Ganiyu Dawodu
Ganiyu Olawale Dawodu // i (1935-2006) nke a maara nke ọma dị ka G.O.D. na Lagos Steeti, bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria na onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụ onye isi otu National Democratic Coalition nke a maara dị ka NADECO na Naijiria n'oge ọchịchị Sani Abacha. Njikọ ahụ bụ òtù dị ike iji wepụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a tụrụ mkpọrọ M.K.O Abiola n'ụlọ mkpọrọ, n'ime usoro ahụ, a tụrụ ya mkpọrọ maka nkwunye ọ kwụnyeere Abiola.
N'afọ 2000, ọ nọ n'ọgụ maka ikike nke alaka Lagos nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Alliance for Democracy. Ọ megidere mepụta nke Gọvanọ Tinubu na 1998-1999 ma kwado onye nwụrụ anwụ Funsho Williams, onye mmegide Tinubu. Esemokwu ha gbasara n'afọ 2000, ka ọ na-erule afọ 2003, ọ hapụrụ pati ahụ gaa na Progressives Action Coalition ma bụrụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ Lagos nke pati ahụ.
A mụrụ Dawodu na Lagos Steeti ma gaa Ansar Ud Deen, elementri ụlọ Akwụkwọ, Okepopo, Lagos. Ọ gara Ahmadiya ụlọ akwụkwọ sekọndrị tupu ọ gaa St Gregory's College, Lagos.
N'oge Naịjirịa First Republic, ọ bụ onye otu kansụl obodo Lagos ma mesịa bụrụ onyeisi oche nke Lagos Town Council.