Gorgo, Eze Nwanyị nke Sparta
Ọdịdị
Gorgo bụ nwaanyị Sparta ma bụrụkwa nwunye Eze Leonidas I (onye chịrị malite n'afọ 489–480 BC). Ọ bụ nwa nwanyị na naanị nwa Cleomenes I mụrụ, onye bụ nwanne nna Leonidas nke nne ha na-amụghị ma bụrụkwa Eze Sparta (onye chịrị malite n'afọ 520–490 BC).[1] Gorgo bụkwa nne Eze Pleistarchus, naanị nwa nwoke ọ mụọrọ Eze Leonidas I.[2] Ọ bụ otu n'ime ụmụ nwaanyị ole na ole n'akụkọ ihe mere eme nke Herodotus kpọrọ aha ha, akwụkwọ dị iche iche gosikwara na ọ bụ nwaanyị nwere ọgụgụ isi na amamihe.[3][4] E doro anya ụbọchị a mụrụ ya, mana dabere na ngụkọ oge Herodotus, ọ ga-abụ na a mụrụ ya n'agbata afọ 518 na 508 BC.
Ebe nsidebiri
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Herodotus, The Histories, Book 5, chapter 48, section 1". www.perseus.tufts.edu. Retrieved 1 November 2021.
- ↑ Rahe, Paul Anthony (1994). Republics Ancient and Modern. UNC Press Books. p. 318. ISBN 978-0-8078-4473-1.
- ↑ Herodotus (2007). The Landmark Herodotus: The Histories. New York: Pantheon Books. pp. 735–736. ISBN 978-0-307-53654-9. OCLC 464268448.
- ↑ Lightman, Marjorie (2008). A to Z of Ancient Greek and Roman Women (in English). New York: Facts on File, Inc. pp. 148. ISBN 978-0816067107.
{{cite cite book}}: CS1 maint: unrecognized language (link)