Gaa na ọdịnaya

Guy Spitaels

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Guy Spitaels
Minister-President of Wallonia
In office
7 January 1992  25 January 1994
Preceded byBernard Anselme
Succeeded byRobert Collignon
President of the Party of European Socialists
In office
February 1989  May 1992
Preceded byVítor Constâncio
Succeeded byWilly Claes
Personal details
Born(1931-09-03) 3 Sepụtemba 1931
Ath, Belgium
Died21 Ọgọstụ 2012(2012-08-21) (aged 80)[1]
Uccle, Belgium
NationalityBelgian
Political partySocialist Party
Alma materCatholic University of Leuven

Guy Gustave Arthur Ghislain Spitaels (French pronunciation: [ɡi ɡystav aʁtyʁ ɡilɛ̃ spitals]; 3 Septemba 1931 - 21 Ọgọst 2012) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Belgium nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Socialist Party. Ọ bụ Minista bụ onye isi ala nke asaa nke Wallonia site na 1992 ruo 1994 na onye isi oche nke pati ya ruo afọ iri na atọ, ruo mgbe Philippe Busquin nọchiri ya.

Spitaels gụsịrị akwụkwọ na 1957 n'isi ọmụmụ sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Universite Catholique de Louvain (UCL), wee gaa College of Europe na Bruges 1957-1958. Ọ hapụrụ Okwukwe Roman Katọlik wee ghọọ onye Freemason. Ọ ghọrọ prọfesọ na iwu ọrụ na Mahadum Libre de Bruxelles (ULB).

Na mbido afọ ndị 1970, Spitaels bụ onye isi ndị ọrụ nye ndị minista dị iche iche nke Belgian socialist. Mgbe ntuli aka nke afọ 1974 gasịrị, Spitaels ghọrọ onye omeiwu. Ọ ghọrọ onye isi obodo Ath na 1977, ọkwa ọ nọrọ na ya afọ iri abụọ. N'otu afọ ahụ, ọ ghọrọ minista na-ahụ maka ọrụ n'okpuru Praịm Minista Paul Vanden Boeynants. Site na 1979 ruo 1981 Spitaels bụ osote praịm minista n'okpuru ọchịchị Wilfried Martens. Ọ rụrụ ọrụ esepụ aka dị ka minista nke mmefu ego (1979-1980) na minista nke njem (1980-1981). Mgbe e meriri ya na ntuli aka nke afọ 1981, e wepụrụ PS ịbụzi de inndị mmegide ma Guy Spitaels ghọrọ onyeisi oche nke PS (1981-1992). Na ntuli aka nke afọ 1987 ọ duuru pati ya gaa mmeri na ntuli aka ahụ ma laghachi n'ọchịchị. ntuli Ebe ya na André Cools nọ ya, PS keere òkè dị mkpa n'ịgbanwe usoro otu nke steeti Belgium ka ọ bụrụ usoro gọọmentị etiti. A rụzuru mgbanwe ahụ n'ụzọ dị ukwuu na 1989 ma mee ka ọ bụrụ nke a kwadoro kpamkpam na 1993.

N'afọ 1992, Spitaels mere ndokwa na ọ ga-abụ Minista bụ onye isi ala nke Gọọmentị Walloon. No njikọ aka ya na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ si n'òtù ya, o tinyere aka na Agusta scandal, nke mere ka ọ gbaa arụkwaghịm na 1994. N'afọ 1995, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Walloon mana ọ ghaghị ịhapụ ọrụ a n'ihi ihe ihere ahụ mere n'afọ 1997. A mara Spitaels ikpe maka iri ngarị n'ụlọ ikpe Cassation n'afọ 1998. Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya agaghị agbake agbake site na ihe ihere a.

Tupu ihe ihere Agusta ahụ e mee, a na-akpọ ya Dieu (na French maka Chineke), na-arụtụ aka na nnukwu mmetụta ya n'ime Parti Socialiste, nke bụ òtù kachasị ike na Belgium na-asụ French n'oge ahụ.

Spitaels nwụrụ site na akpụ ụbụrụ o nwere mgbe ọ dị afọ iri asatọ na 21 Ọgọst 2012. [2]

  • 1960-61 Ịgba arụkwaghị m n'oge oyi

Ihe edeturu

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Guy Spitaels, Belgian Socialist Leader, Has Died - ABC News. Abcnews.go.com.
  2. Guy Spitaels, Belgian Socialist Leader, Dead at 80. AP. Archived from the original on 23 September 2022. Retrieved on 21 August 2012.

Ebe e si nweta ya

[dezie | dezie ebe o si]

Templeeti:Party of European Socialists