Hanan Mohamed Abdelrahman
Hanan Mohamed Abdelrahman bụ onye Egypt-Norway na-akụzi mgbakọ na mwepụ, onye nwetara ihe nrite Holmboe Prize na 2017 [1] [2]
Ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Hanan Mohamed Abdelrahman bụ onye Ijipt, ebe nna ya bụụrụ onye njinia, nne ya bụrụ onye ọrụ ụlọakụ. Ya na di ya bụ onye si mba Sudan bịara mba Norway, n'afọ 2002. [3] O nwetara nzere Masta ya na mgbakọ na mwepụ na ngalaba agụmakwụkwọ,[2] ma bụrụ onye nkụzi na Lofsrud Skole, ụlọ akwụkwọ sekọndrị nọ nso Oslo.[1][2]
Ihe Ntinye ya Ga
[dezie | dezie ebe o si]Ụlọ akwụkwọ Abdelrahman nwere ọtụtụ ụmụ akwụkwọ si mba ọzọ bịa ndị nwere ntọala dị iche iche. Abdelrahman na-enye ha egwuregwu mgbakọ na mwepụ, egwuregwu mgbagwoju anya, vidiyo yana ọrụ ọdịnala nke mgbakọ na mwepụ. Echiche ya bụ na site n'ilebara ụmụ akwụkwọ ya niile anya n'ọrụ n'otu na ha kwesịrị inwe ike ịmụta mgbakọ na mwepụ, [1] nakwa na ha niile kwesịrị ịbụ ndị a Na-Enye ihe ịma aka n'otu ụdị. [4]
}}
Abdelrahman bụ onye dere akwụkwọ dị n'asụsụ Norway, Mattehjelperen - Leksehjelp for foreldre og elever på ungdomsskolen nke e mere iji mee ka ndị nne na nna na-enyere ụmụ akwụkwọ aka na mgbakọ na mwepụ,[1] na onye guzobere ebe nrụọrụ weebụ n'ịntanetị maka inyere ụmụ akwụkwọ aka na mgbakọ na mwepụ. [5]
Ọ bụkwa onye òtù kọmitii mba iji nyochaa mmetụta nke ọdịiche dị na nwoke na nwanyị na nsonaazụ ụlọ akwụkwọ. [6]
Ihe nrite
[dezie | dezie ebe o si]Ihe nrite Holmboe, nke Abdelrahman ritere n'afọ 2017, [1][2] bụ ihe nrite kwa afọ maka ndị nkuzi mgbakọ na mwepụ kachasị elu na ọkwa ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na mba Norway, nke Kansụl mgbakọ na mwepụ mba Norway na-enye. A na-enye ya n'aka n'aka yana ihe nrite Abel, nke onye ritere ya n'afọ 2017 bụ Yves Meyer.[4] A kpọkwasịrị ihe nrite Holmboe Prize aha onye nkuzi mgbakọ na mwepụ nke mba Norway bụ Bernt Michael Holmboe, onye nkuzi nke Niels Henrik Abel. {{R|ap [7]
Ọ na-enye ihe nrite nke 100,000 Norwegian krone nke a ga-eke n'etiti onye ritere ya na ụlọ akwụkwọ onye ahụ ritere ya.[1]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si].mw-parser-output .reflist{margin-bottom:0.5em;list-style-type:decimal}@media screen{.mw-parser-output .reflist{font-size:90%}}.mw-parser-output .reflist .references{font-size:100%;margin-bottom:0;list-style-type:inherit}.mw-parser-output .reflist-columns-2{column-width:30em}.mw-parser-output .reflist-columns-3{column-width:25em}.mw-parser-output .reflist-columns{margin-top:0.3em}.mw-parser-output .reflist-columns ol{margin-top:0}.mw-parser-output .reflist-columns li{page-break-inside:avoid;break-inside:avoid-column}.mw-parser-output .reflist-upper-alpha{list-style-type:upper-alpha}.mw-parser-output .reflist-upper-roman{list-style-type:upper-roman}.mw-parser-output .reflist-lower-alpha{list-style-type:lower-alpha}.mw-parser-output .reflist-lower-greek{list-style-type:lower-greek}.mw-parser-output .reflist-lower-roman{list-style-type:lower-roman}
- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Hanan Mohamed Abdelrahman tildeles Holmboeprisen (in Norwegian), Abel Prize foundation, May 22, 2017
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Kristiansen, Cornelia (April 27, 2017), "Vinner av Holmboeprisen 2017: - Hanan Mohamed Abdelrahman (36) får superlærerpris", Dagbladet (in Norwegian)
- ↑ Skjong, Hans (November 19, 2017), "Abdelrahman: - Jeg prøver først og fremst å få elevene til å tenke selv", Utdanning (in Norwegian)
- ↑ 4.0 4.1 Dundas, Bjørn Ian; Skau, Christian (September 2017), "Interview with Abel Laureate Yves Meyer", EMS Newsletter: 14–22. Reprinted in Notices of the American Mathematical Society, Vol. 65, No. 5, May 2018, pp. 520–529.
- ↑ Ekeland, Eli (January 3, 2019), Mattehjelperen (in Norwegian), Lunde skole, retrieved 2019-02-25
- ↑ Katrine Løken appointed member of expert committee on gender differences in school, NHH Centre for Experimental Research on Fairness, Inequality and Rationality, August 31, 2017, retrieved 2019-02-25
- ↑ Manne, Per (May 21, 2004), Holmboeprisen (in Norwegian), Norwegian Mathematics Council, archived from the original on 2024-05-13, retrieved 2025-12-03