Hauwa Ibrahim

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Hauwa Ibrahim
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereHauwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Jenụwarị 1968 Dezie
Ebe ọmụmụGombe Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
ụdị ọrụ yaonye ọka iwu Dezie
onye were ọrụSaint Louis University Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ihe nriteSakharov Prize, Knight of the Order of Merit of the Italian Republic, honorary citizen of Paris, Margaret Brent Award Dezie

Hauwa Ibrahim (a mụrụ n'afọ 1968) bụ nwaafọ Naijiria bụọkàiwu maka oke mmadụ,onye nke ritere European Parliament's Sakharov Prize n'afọ 2005.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ibrahim na Gombe n'afọ 1968. Ọ gara ọzụzụ ị bụ onye ọka iwu ma e were ya dị ka nwanyị Alakụba mbụ na Naijiria iji nweta ọdịiche a. [1]

Ibrahim ama maka ọrụ ịgbachitere ndị mmadụ na-anaghị ego ikpe n'okpuru iwuSharịya nke islam ndị dị ire ná mpaghara ugwu nke Naijiria. Ọ gbachitere Amina Lawal, [2] Safiya Hussaini na Hafsatu Abubákar . N’afọ 2005 e nyere ya Sakharov Prize maka ọrụ a. [3]

Hauwa a bụrụla Prọfesọ na-eleta Mahadum Saint Louis University of Law na Stonehill College, World Fellow na Mahadum Yale, Radcliffe fellow, ya na onye otu na Human Rights Programme na Islamic Legal Studies Program na Mahadum Harvard. Hauwa bụzi onye nkuzi na onye nyocha na Mahadum Harvard. [4] Ọ bụkwa otu n'ime ndị isi iri abụọ na ise na Information and Democracy Commission nke ndị Reporters Without Borders malitere . [5]


Mgbe ọ bụ Radcliffe fellow, Ibrahim bidoro usoro ị dọ aka na ntị iji banye na usoro ntọala e dere ede nke iwu Sharịya ma nyochaa etu ha siri metụta ọrụ ọkaiwu, nke, n'aka nke ya, metụtakwara ikike ụmụ mmadụ nke ụmụ nwanyị na West Afrịka. Nchọpụta ya mepụtara akwụkwọ Practicing Shariah Law: Seven Strategies for Achieving Justice in Shariah Courts, nke e bipụtara n'ọnwa Jenụwarị afọ 2013. " [6]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ụmụ nwanyị ndị ọka iwu izizi gburugburu ụwa

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]