Gaa na ọdịnaya

Ibironke Akinsete

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ibironke Akinsete (amụrụ n'afọ 1938) bu onye Naijiria prọfesọ gbasara Hematology na mmịnye ọbara na onye na-akwado ahụike ụmụ nwanyị.[1][2]O mere nhọrọ nke Hematology dị ka ụzọ ọrụ ya n'ihi na ọbara masịrị ya na otú e si emepụta ahụ mmadụ.[3]

Agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Ibironke Akinsete nwetara akara mmụta ahụike na Mahadum Aberdeen, Scotland. Ọ nwetakwara ntozu ndị ọzọ dị mkpa na ọmụmụ Hematology na Mahadum Aberdeen.[1]

Ibironke Akinsete rụrụ ọrụ na Mahadum Lagos, ebe ọ jere ozi ma laa ezumike nka dịka onye ndụmọdụ na ngalaba hematology, na College of Medicine.[2] Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi oche na-ahụ maka mịnye ọbara na steeti Lagos. Ọ bụkwa onye nlekọta nke AIDS Prevention Initiative na Naịjirịa na onye nlekọta ndụ nke Society for Women & AIDS in Africa, Nigeria (SWAAN), Prof. Akinsete bụ onye ọsụ ụzọ onyeisi oche nke National Action Committee on AIDS-NACA. [3]

Ihe nrite na mmara

[dezie | dezie ebe o si]

Ibironke Akinsete nọ na 2017 nyere onyinye nrite Lifetime Achievement Awards na Nigerian Healthcare Excellence Award (NHEA) maka ntinye aka ya maka ịdị mma na nlekọta ahụike dị mma.[1][4]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 "Bot Verification". nigeriahealthcareawards.com.ng. Archived from the original on 2024-04-24. Retrieved 2025-08-11. {{cite cite web}}: Cite uses generic title (help)
  2. 1 2 "Nigeria: HIV-Aids Prevalence Is Stabilising in Nation - Professor Akinsete".
  3. 1 2 joseph (2010-04-10). "A Woman must be able to manage and co-ordinate her family and work life - Prof. Ibironkae Akinsete". Vanguard News (in Bekee ndị United Kingdom). Retrieved 2025-08-11.
  4. ↑ "Bot Verification". nigeriahealthcareawards.com.ng. Archived from the original on 2024-07-13. Retrieved 2025-08-12. {{cite cite web}}: Cite uses generic title (help)