Ibrahim Magu
Ibrahim Magu | |
|---|---|
| Former Acting chairman of Economic and Financial Crimes Commission | |
| In office 9 November 2015 – 7 July 2020 | |
| Preceded by | Ibrahim Lamorde |
| Succeeded by | Muhammed Umar |
| Personal details | |
| Born | 5 Mee 1962 |
| Nationality | Nigerian |
| Alma mater | Ahmadu Bello University |
| Occupation | Police officer |
Ibrahim Magu (amụrụ n'abali ise nke ọnwa Mee n'afo 1962) bụ onye uwe ojii Naijiria nke jere ozi dị ka onye isi oche nke Economic and Financial Crimes Commission, EFCC site na 9 Nọvemba n'afọ 2015, ruo mgbe a kwụsịrị ya ọrụ na n'abali asaa nke ọnwa Julaị n'afọ 2020. [1] Muhammed Umar nọchiri ya dị ka onye isi oche EFCC.[2]
A họpụtara Magu dị ka onyeisi oche EFCC mgbe Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari chuturu Ibrahim Lamorde, onye jere ozi ugboro abụọ.[3][4] Ma Lamorde ma Magu jere ozi n'oge Nuhu Ribadu na ụlọ ọrụ mgbochi aka na-emegide ma bụrụkwa ndị kwadoro na ha bụ akụkụ nke ihe ịga nke ọma Ribadu dekọrọ n'oge ya.[5]
Mmalite ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Magu na 5 Mee n'afo 1962 na Maiduguri, Borno Steeti. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Maiduguri (bido n'afọ 1969 ruo n'afọ 1975), Waka Biu's Secondary School site n'afo1975 ruo n'afọ 1980, na Ahmadu Bello University, Zaria bido n'afọ 1982 ruo n'afọ 1986, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nweta B.Sc na Accounting.[6] Mgbe ọ gasịrị National Youth Service Corps, ọ rụrụ ọrụ na Ministri dịgasị iche iche na Ngalaba dị iche iche dị na Gọọmentị Steeti Borno dị ka onye na-ahụ maka ego tupu ọkwa ya arigbo dika onye na-edekọ ego na mpaghara tupu ya ejiri aka ya gbaa arụkwaghịm iji sonye na Ndị uwe ojii Naịjirịa dị ka onye enyemaka onye isi ndị uwe ojii na'afọ 1990. Ọ bụ onye nhazi maka ndị uwe ojii Naịjirịa tupu ọ gaa na Special Fraud Unit (SFU) nke Ngalaba Nnyocha Mpụ nke Ndị uwe ojii Naijiria (CID) ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ndú otu na-ahụ maka mpụ ego, ịsa ego na nyocha nke ịghọ aghụghọ.[7][8]
Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu kọmitii nyocha nke onye ndụmọdụ nchekwa mba (NSA), Babagana Monguno kpọrọ na iwu nke Onye isi ala Muhammadu Buhari iji nyochaa ịzụta ngwá agha na ndị agha site n'afọ 2007 ruo n'afọ 2020.[9]
Magu nọgidere bụrụ onye a na-ekwetaghi dị ka Onye isi oche nke EFFC [10] nke bụ otu n'ime ihe ịma aka na esemokwu ndị ọchịchị nke Onye isi ala Muhammadu Buhari" na-ahu na nhọpụta na nkwenye.[11][12][13] Kọmitii Ọrụ Ndị Uwe Ojii (PSC) n'ụbochi Fraịde, 28 n'ọnwa Eprel n'afọ 2018 kwupụtara nkwalite nke ndị isi iri na asatọ mgbe Nzukọ zuru ezu nke iri abụọ na asaa nke gwụchara na Abuja ebe e buliri Magu ka ọ bụrụ onye kọmishọna zuru ezu site na osote kọmishọna.[14]
Na ngwụcha Regional Conference nke asatọ ndị Anti-Corruption Agencies did na Commonwealth Afrịka nke emere na Transcorp Hilton (Abuja, Naijiria) n'ụbọchị 19 n'ọnwa Mee n'afo 2018, Magu pụtara dị ka onyeisi oche ọhụrụ ha. Nhọpụta ya bụ isi ihe nke nzukọ mpaghara ụbọchị ise nwere isiokwu: "Partnering Towards Assets Recovery and Return". [15] [16] [17][18][19]
N'abalị iri abụọ na itoolu n'ọnwa Mee afọ 2018, EFCC kwupụtara na a mara ndị Naijiria nari isii na atọ ikpe maka ebubo nrụrụ aka ebe ọ bụ na Buhari na Magu malitere ọrụ ha n'afọ 2015.[20] EFCC kwupụtakwara na nke mbụ n'akụkọ ihe mere eme nke Naijiria, a gbara ndị ọkàikpe na ndị ọrụ agha akwụkwọ.[20]
Njide
[dezie | dezie ebe o si]N'abalị isii n'ọnwa Julaị n'afọ 2020, e jidere Magu maka ebubo nrụrụ aka metụtara ego o kwuru na ọ na-emefu ego, n'etiti ihe ndị ọzọ, na-akwado ndụ ya na mmefu njem ya.[21] A kọkwara ebubo iri abụọ na abụọ megide Magu n'ọnwa June n'afọ 2020.[22] Mgbe e jidere ya, Magu nọgidere n'ụlọ mkpọrọ.[21]
N'abali asaa nke ọnwa Julaị n'afọ 2020, a kwụsịtụrụ Magu dị ka onye isi oche nke Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) n'ihi ebubo nrụrụ aka e boro ya. [23] [24][25]
Kọmitii ahụ tụrụ aro kpọmkwem na a ga-ewepụ Magu "maka ịghara ịkọwapụta nde narị anọ na iri atọ na otu vootu nchekwa / ego ozi nke e wepụtara n'ọfịs onye isi oche nke EFCC n'etiti ọnwa Nọvemba n'afọ 2015 n'ọnwa Mee n'afọ 2020". Kọmitii ahụ tụkwara aro ka a kpọga Magu onye nyocha-ọchịagha nke ndị uwe ojii maka "omume ịdọ aka ná ntị dị oké mkpa".
N'izu ahụ, Onye isi ala Buhari kpọkọtara otu nyocha nke Justice Ayo Salami duziri.[26] Na ngwụcha ọnwa Nọvemba, kọmitii ahụ gosipụtara akụkọ ya (nke a kpọrọ "Salami Report") na nzuzo nye Onye isi ala Buhari.[26] Izu abụọ ka e mesịrị, Onye isi ala Buhari wepụtara akụkọ ahụ nke wepụrụ Magu na ebubo ahụ, ma gosipụta na e nwere atụmatụ imebi aha Magu iji kwụsị ọrụ mgbochi nrụrụ aka ya.[27] A na-atụ aro [27] na Attorney General Abubakar Malami tinyere aka na atụmatụ ahụ, n'otu akụkụ n'ihi ibu iro ọ gosipụtara n'ebe Magu nọ, na omume ya kpọmkwem na-edetara Onye isi ala Buhari akwụkwọ ozi na'abali ise nke ọnwa June n'afọ 2020 nke isiokwu ya bụ "Origbo mmetọ nke ọrụ ọha na eze na mmebi iwu ndị ọzọ nke Maazị Ibrahim Magu, onye na-anọchite anya onyeisi oche nke Economic and Financial Crimes Commission mere. "[28][22]
A tọhapụrụ Magu n'abali anọ nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2022 n'ihi nkwupụta ụgha nke Pastor Emmanuel Omale nke Divine Hand of God Prophetic Ministry na nwunye ya, Deborah, agbaala ya nde narị naịra ise na iri asaa na atọ.[29] E hotara Magu ka ọ na-ekwu "Abụ m onye nrụrụ aka na onye aja na-alụ ọgụ, mana enwere m obi ụtọ na ihe ndị mere n'oge na-adịbeghị anya na-ekpughere ndị Naijiria eziokwu".[30]
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Buhari 'suspends' EFCC chair, Magu. Daily Trust Newspaper (7 July 2020). Retrieved on 7 July 2020.
- ↑ "After EFCC chairman, Umar na di most senior cop for Nigeria corruption police", BBC News Pidgin. Retrieved on 2020-07-11.
- ↑ "Buhari Sacks EFCC Boss, Appoints Magu As Chairman", Channels Television. Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Ogala. "Updated: Buhari removes EFCC chairman, Ibrahim Lamorde, appoints replacement". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Nuruddeen. "EFCC: Why Buhari fired Lamorde". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Andrella. "New EFCC Chairman appointed by Buhari". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Alkasim. "Profiling New EFCC Boss Ibrahim Magu". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Executive Chairman. Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ Temi. "[Photo, Profile Meet Ibrahim Magu, The New EFCC Chairman]". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ PROFILE: Abdulrasheed Bawa to make history as EFCC chairman (en-GB) (2021-02-16). Retrieved on 2022-03-03.
- ↑ Tonye. "Again, Senate rejects Magu as EFCC boss". Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ "Senate Rejects Magu's Confirmation As EFCC Boss Again", Channels Television. Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ Hassan. "Updated: How Senate rejected Magu as EFCC Chairman". Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ Samuel. "Police promote EFCC Chairman Magu, 17 others". Retrieved on 18 May 2018.
- ↑ 8th Commonwealth Conference of Heads of Anti-Corruption Agencies in Africa. The Common Wealth (9 May 2018). Archived from the original on 22 May 2018. Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ Commonwealth fights back against 'tsunami of global corruption'. The Commonwealth (14 May 2018). Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ "Nigeria appointed chairman of Commonwealth Africa anti-corruption agencies", TheCable, 19 May 2018. Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ Raphael. "Magu emerges Chairman of Commonwealth Anti-Corruption Agencies in Africa", The Sun NewsPaper. Retrieved on 21 May 2018.
- ↑ "Magu now leads Commonwealth Africa anti-corruption agencies", The Nation. Retrieved on 21 May 2018.
- 1 2 Nigeria: EFCC Secures 603 Convictions in Three Years - allAfrica.com. Archived from the original on 2018-05-29.
- 1 2 Adeoye. "Nigeria's anti-corruption boss arrested for corruption", Mail & Guardian, 9 July 2020.
- 1 2 Onwuamaeze. "Malami Writes President, Seeks Removal of Magu", This Day, 19 June 2020.
- ↑ Presidency suspends acting EFCC boss Ibrahim Magu (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2020-07-07). Retrieved on 2020-07-07.
- ↑ Buhari 'suspends' EFCC chair, Magu (en-GB). Daily Trust (2020-07-07). Retrieved on 2020-07-07.
- ↑ Breaking: Presidency Suspends Acting EFCC Chairman, Magu. Sahara Reporters (2020-07-07). Retrieved on 2020-07-07.
- 1 2 Agboola. "Salami Report: Why the silence on findings against Magu", The Nation, 27 November 2020.
- 1 2 Tijjani. "Salami panel's report on Magu: A glaring case of miscarriage of justice", The Cable, 10 December 2020.
- ↑ "Magu: Kebbi Monarch Accuses Malami Of Witch-hunting Ex-EFCC Boss", Sahara Reporters, 14 November 2020.
- ↑ Nwafor (2022-10-05). Court clears Magu of money laundering (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-11-23.
- ↑ I'm a victim of corruption fighting back –Magu (en-US). Punch Newspapers (2022-10-10). Retrieved on 2022-11-23.