Gaa na ọdịnaya

Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọnọdụ ndụ dịka onwe onye si hụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọnọdụ ndụ dịka onwe onye si hụ (self-perceived quality-of-life scale) bụ ngwáọrụ nnyocha uche nke dabeere na echiche zuru oke nke ọnọdụ ndụ dịka onwe onye si hụ (Self-Percieved Quality of Life SPQL) ma na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ nwere ọtụtụ akụkụ nke akụkụ ọdịmma ndị metụtara ahụike na ndị na-emetụtaghị ya. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ aghọwo ngwáọrụ a na-ahọrọ maka nlekota ọnọdụ ndụ n'ime ụfọdụ ndị nwere nsogbu ahụike, dịka ọmụmaatụ, netwọk Positively Sound nabatara ya maka ụmụ nwanyị na-arịa HIV.

Ọganihu nke Nsogbu uche nwere ike inwe mmetụta na ọtụtụ ngalaba nke ndụ mmadụ nke enwere ike inweta naanị site na nnyocha zuru oke. Dịka ọmụmaatụ, ọgwụgwọ nke óké ịtụ ụ nwere ike belata egwu (nchịkọta ahụike uche), nke nwere ike iduga n'imeziwanye mmekọrịta mmadụ na ibe ya (nchịkọta mmekọrịta mmadụ na mmadụ) na, n'aka nke ọzọ, ịrụ ọrụ, na-akpata mmụba nke ụgwọ ọrụ (nchịkọta ego). Ya mere, iji chọpụta ihe niile ọgwụgwọ na-apụta (dịka, maka ịtụ egwu), a chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ zuru oke n'ọtụtụ ngalaba nke ndụ mmadụ. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ SPQL nwere ike inye ọ̀tụ̀tụ̀ zuru oke dị otú ahụ.

E mepụtara ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ n'ụdị ji latrik arụ ọrụ. Ngwá ọrụ ahụ na-agbakọ akara na-akpaghị aka; nke a na-enye ohere maka usoro ọnụọgụ dị elu. Usoro ngụkọta na ịgụ ọnụ a na-akpaghị aka nyere ohere isoro usoro zuru oke maka ịtụle SPQL site n'ọtụtụ akụkụ. Usoro nwere akụkụ dị iche iche, n'aka nke ya, nyere nnyocha zuru oke nke ịdị irè nke itinye aka na ahụike uche (site na ime nnyocha tupu nakwa mgbe e mechara).

Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ sitere na ngwakọta nke echiche ndị dị adị gụnyere: (a) ọdịmma onwe onye, (b) ógó dị iche iche nke ùtó, (c) ụdị dị iche iche nke mkpa mmadụ, (d) ógó ndụ, na (e) usoro nnyocha onwe onye gasị. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ nwere akụkụ atọ: ọdịmma onwe onye, mmetụta dị mma na nke na-adịghị mma, na mmezu nke mkpa. Lee ihe osise dị n'okpuru ebe a.

Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ nwere ike (a) ịchọpụta mmetụta ndị dị njọ ndị nwere ike ime site na ntinye aka n'ụdị mmetụta ụbụrụ maọbu mmetụta uche nke nwere ike ime n'ọtụtụ ngalaba nke ndụ mmadụ, (b) chọpụta ọbịbịa nke nzaghachi, (c) nye aka n'ịtụle ọganihu nke mgbake, (d) tụọ mmetụta nke ihe omume dị iche iche na-abụghị nke ụkpụrụ nke dị mma na nke na-adịghị mma (dịka, ịgba alụkwaghịm, mbuli-elu n'ọrụ, ịghọ nne maọbụ nna) na ndụ mmadụ n'òzùzù ya ma nyochaa usoro mmepe ha, (e) tụlee SPQL mmadụ n'oge ndụ ya, (f) ikwu maka ime n'ihu nke ịda mbà, nchegbu na ọnọdụ obi, yana (g) nwalee ịdị ìrè nke ntinye aka ga, ndị e bu n'obi na ha ga-emelite ọdịmma nakwa meziwanye ọnọdụ ndụ n'ógó otu onye

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ahụike uche nwere ike iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a nyochaa ọganihu nke ọgwụgwọ. Nke a bakwara uru maka ndị ọrịa kwa n'ihi na ha onwe ha nwere ike iji akara mbụ ha tụnyere akara ha nwetara mgbe e tinyechaara ha aka. N'ihi na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dị n'ịntanetị, ndị ọrịa nwere ike zazuo ajụjụ ndị ajụrụ ma oge ịnata ọgwụgwọ gachaa. A pụkwara iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ mee ihe na ntọala ahụike iji nyochaa otú ọgwụgwọ ahụ si emetụta ndụ onye ọrịa n'ozuzu ya nakwa n'akụkụ ụfọdụ ka oge na-aga, yana ikwe ka a chọpụta mmetụta na-adịghị mma nke uche. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ nwere ike ịba uru nye ndị na-ahụ maka ịnshọransị n'ihi na ọ ga-enye aka n'ịtụle ịdị irè nke itinye aka nke ahụike uche.

Faịlụ:Spql.jpg
Ihe nlereanya SPQL.

Ọ dị mma ikwu na mmadụ niile chọrọ ibi ndụ dị mma. Ọ bụ ezie na ihe "ezi ndụ" pụtara nwere ike ịdịgasị iche site na ọdịbendị gaa na ọdịbendụ nakwa site n'otu onye gaa n'onye ọzọ, mpụtara a dị na gburugburu otu akụkụ nke ndụ n'ófè ọdịbendị gasị. Ihe dị iche iche n'ezie n'etiti ọdịbendị na ndị mmadụ gasị bụ Ọdịdị nke akụkụ ụfọdụ nke ndụ dị mma, uru ndị mmadụ na-ekwu na akụkụ ndị a bara, na ụzọ ndị mmadụ si atụle akụkụ ndị a nke ndụ dị mma.