Gaa na ọdịnaya

Inweta Ikpe Ziri Ezi (Access to Justice)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Access to Justice
non-governmental organization
Oge/afọ mmalite1999 Dezie
Mba/obodoNaijiria Dezie
Ọdịdị isi ụlọ ọrụLagos Dezie
Isiokwu nlebanyaAccess to justice Dezie
Webụsaịtịhttps://www.accesstojustice-ng.org Dezie

Access to Justice (AJ) bụ òtù na-ahụ maka Ihe ndị ruuru mmadụ na Naịjirịa nke dị na Lagos. Dị ka ebe nrụọrụ weebụ ha si kwuo, "ọ bụ òtù na-akwado ikpe ziri ezi na-arụ ọrụ iji chebe ikike nke inweta ohere n'ụzọ dị nhatanha na nke na-enweghị ịkpa ókè n'ụlọ ikpe gasị, gbasaa inweta ohere nke ndị a na-akpapụ n'akụkụ inweta ikpe ziri ezi dị nhatanha na nke na-adịghị eke anya n'iru, lụso nrụrụ aka dị na nchịkwa na inye ikpe ziri ezi، ịkwado ịlụso ọgụ iwu kwadoro maka nkwanye ùgwù dịịrị mmadụ ma gbasaa ihe onwunwe iwu kwadoro nke na-enye aka iru ebumnuche ndị a". [1] Bụ nke e hiwere n'afọ 1999, AJ na-achụso ebumnuche ha site na mmemme atọ metụtara ya: Ikpe na Nnwere Onwe; Usoro Nnweta Iwu; na Usoro Nnweta Ihe onwunwe Iwu. Ha na-ebipụta akwụkwọ, akwụkwọ akụkọ, na akwụkwọ nkọwa isiokwu dị iche iche iji kwado ọrụ ha.

Ndị Ha na Ha Na-ejikọ aka n'ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Access to Justice na-ejikọtaala aka ugboro ugboro ha na òtù ndị ọzọ na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ n'ịchụso okwu ụfọdụ. Na Jun 2010, Access to Justice sonyeere Amnesty International, Human Rights Watch, na ọtụtụ òtù ndị ọzọ na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na Naijiria n'ịkpọ gọọmentị steeti ka ha ghara ịmaliteghachi igbu ndị mkpọrọ.[2] N'ọnwa Eprel afọ 2009, ha sonyeere Amnesty International na ọtụtụ ndị NGO ndị ọzọ dị n'Afrịka n'inye nkwupụta, na-akpọ gọọmentị Sudan "ka ha kwụsị ịkpasu ndị na-agbachitere ikike mmadụ egwu na ndị ọrụ nke mba na mba ụwa na ndị na-ahụ maka ikike mmadụ".[3]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù

[dezie | dezie ebe o si]

Access to Justice bụ otu n'ime ndị mmeri nke 2009 MacArthur Award for Creative & Effective Institutions. A na-enye onyinye a nye obere ụlọ ọrụ ndị na-eweta ụzọ ọhụrụ iji gboo nsogbu ndị na-adịte aka. Ihe nrite nke MacArthur Foundation bụ iji kwado oh ọrụ Access to Justice iji mee ka usoro ndị na-eme nchọpụta dịghachi ndụ ọzọ na usoro iwu Naijiria, na-enyocha ọnwụ ndị a na-enyo enyo.

Access to Justice bụkwa onye mmeri nke 2010 Gani Fawehinmi prize maka Ikike ndị mmadụ na inweta ikpe ziri ezi ọhaneze. Òtù ndị ọka iwu Naịjirịa, bụ ndị kwadoro ihe nrite ahụ, toro Access to Justice maka inye nnọchiteanya iwu, yana maka ikpe na ọrụ nkwado ha.[4][5]

  • Ihe ndị ruuru mmadụ na Naịjirịa

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Access to Justices - Home. Accesstojustice-ng.org. Archived from the original on 2 September 2010. Retrieved on 2010-09-16.
  2. Access to Justices - Home. Accesstojustice-ng.org. Archived from the original on 2 September 2010. Retrieved on 2010-09-16.
  3. Nigerian, Kenyan rights groups deplore harassment of Sudan aid - Sudan Tribune: Plural news and views on Sudan. Sudan Tribune. Archived from the original on 2012-12-09. Retrieved on 2010-09-16.
  4. Access to Justices - Home. Accesstojustice-ng.org. Archived from the original on 2 September 2010. Retrieved on 2010-09-16.
  5. Access to Justices - Home. Accesstojustice-ng.org. Archived from the original on 2 September 2010. Retrieved on 2010-09-16.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Official website