Gaa na ọdịnaya

Irene Muzás

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  

Irene Muzás Calpe (amụrụ n'afọ 1974) bụ onye ọkà mmụta asụsụ Spain. N'afọ 2022, a họpụtara ya ka ọ bụrụ nwanyị rabaị mbụ na Spain.

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ ya

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Muzás n'afọ 1974 na Barcelona, Spain.[1] Ọ gụsịrị akwụkwọ nke mmụta na ngalaba asụsụ Bekee na agụmagụ na Mahadum Autonomous nke Barcelona, ebe ọ gụchakwara nzere postgraduate na mmụta na ngalaba gaụmagụ Bekee, ma gaa n'ihu na-amụ Classical philology na Mahadum nke Barcelona na ọdịbendị na ọha mmadụ nke ọwụwa anyanwụ Eshia na Mahaduma Open nke Catalonia . [1][2] O nwetakwara nzere masta na agụmakwụkwọ na Mahadum International nke La Rioja . [3] Ọ rụbuola ọrụ dị ka onye ntụgharị na onye nkuzi asụsụ Bekee na Latin.[2][4]

Nhọpụta

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ tụgharịrị okpukpe ma ghọọ onye Juu n'afọ 2013, mgbe Okpukpe ndị Juu masịrị ya ruo ọtụtụ afọ, n'ịmụ Hibru ma na-aga ọmụmụ ihe gbasara akụkọ ihe mere eme na omenala ndị Juu na Mahadum Barcelona . [5][2] Ọ sonyeere ngalaba otu Atid nke Barcelona, site na okpukpe ndị Juu Conservative.[6][4]

N'abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2022, a họpụtara ya ka ọ bụrụ nwanyị rabaị mbụ nke Spain na Zacharias Frankel College nke Mahadum Potsdam, Germany, mgbe o mechara thesis ya na Lilith maka nzere masta nke nkà mmụta okpukpe ndị Juu. [6] [7][5][8] N'ọnwa Nọvemba nke afọ 2022, Muzás ghọrọ onye isi nke ụlọ nzukọ Atid na Barcelona mgbe onye rabaị Stephen Berkowitz lara ezumike nká.[9]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 "Rabinato". Atid synagogue (in Spanish). Archived from the original on 15 January 2026. Retrieved 4 May 2026.
  2. 1 2 3 Planes, Joan (22 October 2022). "La barcelonesa Irene Muzás Calpe será la primera mujer rabina en España". La Razón (in Spanish). Retrieved 4 May 2026.
  3. "Una barcelonesa de 48 años será la primera mujer rabina de España". The Objective (Spain) [es] (in Spanish). 22 October 2022. Retrieved 4 May 2026.
  4. 1 2 Montobbio Campa, Lucía (7 November 2022). "Irene Muzás, primera rabina catalana: "La principal lluita de la dona és normalitzar la seva presència"". Catalunya Religió [ca] (in Catalan). Retrieved 4 May 2026.
  5. 1 2 Martínez, David (13 November 2022). "El camino de Irene para convertirse en la primera mujer rabina de España: "En Barcelona hay que ir con cautela con un kipá"". El Español (in Spanish). Retrieved 4 May 2026.
  6. 1 2 "Irene Muzás, la primera rabina catalana i una de les poques d'Europa, ordenada a Alemanya". 3Cat (in Catalan). 24 October 2022. Retrieved 4 May 2026.
  7. "Lilith: la primera Eva, con Irene Muzas Calpe". Radio Sefarad. 13 January 2022. Retrieved 4 May 2026.
  8. Rourera, Mireia (22 October 2022). "Ordenen a Berlín la primera rabí catalana". El Punt Avui (in Catalan). Retrieved 4 May 2026.
  9. Rourera, Mireia (26 November 2022). ""M'ha sorprès l'expectació per la meva ordenació"". El Punt Avui (in Catalan). Retrieved 4 May 2026.