Isabel Casimiro
Isabel Maria Cortesão Casimiro | |
|---|---|
| Born | Iapala, Nampula Province, Mozambique |
| Occupation | Sociologist, Women's Rights Activist, Professor |
| Academic background | |
Isabel Maria Cortesão Casimiro (amụrụ na 14 Jenụwarị 1955) bụ onye Mozambik na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya, onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru ụmụ nwanyị, na onye bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ prọfesọ na Centre of African Studies, na Edurado Mondlane University, nọ na Maputo,Mozambique . [1] Ọ bụ onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị na onye na-agbachitere ikike ụmụ nwanyị, na onye guzobere Fórum Mulher and Women and Law in Southern Africa Research and Education Trust. Ọ bụbu onye otu FRELIMO site n'afo 1995 ruo n'afo 1999.
Ndụ mbido
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Isabel Maria Casimiro na 14 Jenụwarị n'afo 1955 na Iapala, obere obodo dị na Nampula Province, n'ụsọ oké osimiri nke Mozambique.[2] Nna ya bụ dọkịta na-ahụ maka ahụike na ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Iapala.[2] Nne na nna ya kwagara Mozambique n'afọ 1952, n'ihi na ha bụ ndị otu Portuguese Communist Party, nke gọọmentị kwupụtara na iwu akwadoghị, n'ihi ya, a "chụgara" ha n'ụzọ dị irè n'ihe bụ otu n'ime mba ndị Portugal na-achị n'oge ahụ.[2]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Site n'afo 1995 ruo n'afo 1999, Casimiro bụ buru onye otu ndi omeiwu, na-anọchite anya FRELIMO, Mozambique Liberation Front . [3]
Casimiro bụ onye guzobere, na onye isi oche nke Fórum Mulher site n'afo 2006 ruo n'afo 2015. [3]
Casimiro bụ onye guzobere na onye nhazi mba mbụ nke Women and Law in Southern Africa Research and Education Trust (WLSA), nke dị na Mozambique, ma kemgbe afo 2015 ọ bụkwa onye isi oche WLSA nke Mozambique.[3]
Casimiro bụ prọfesọ na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Centre of African Studies, Eduardo Mondlane University dị na Maputo, ebe ọ bụ ọkachamara na ikike nke ụmụ nwanyị na nke ndi mmadụ, òtù ụmụ nwanyị, nsogbu mmepe, na ọchịchị onye kwuo uche ya.[1]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 Isabel Maria Alçadra Padez Cortesao Casimiro / CODESRIA. www.codesria.org. Archived from the original on 18 January 2021. Retrieved on 10 November 2017.. www.codesria.org. Archived from on 18 January 2021. Retrieved 10 November 2017.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 isabel. www.universitadelledonne.it. Retrieved on 10 November 2017.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 Casimiro. Criminalization of feminist activists and social movements in Mozambique. www.vidc.org. Archived from the original on 30 August 2019. Retrieved on 10 November 2017.