J. W. B. Gunning

Jan Willem Boudewijn Gunning (3 Septemba 1860 na Hilversum, North Holland - 26 Jun 1913 na Pretoria), bụ dọkịta onye Dutch, onye jere ozi dị ka onye nduzi nke ọ́bankà Staats na ihe a maara mgbe ahụ dị ka Pretoria Zoological Gardens (nke bụzi National Zoological Gardens of South Africa).
Gunning bụ nwa nwoke nke abụọ nke ọkà mmụta okpukpe Dutch a ma ama Johannes Hermanus Gunning (1829-1905) yana Johanna Jacoba Gunning-Hoog. Ọ gara Mahadum Amsterdam, Mahadum Leiden na Mahadum Jena, na-etozu dị ka dọkịta nke ọmụmụ ọgwụ. N'afọ 1884 ọ kwagara South Africa wee malite ọrụ na Orange Free State. N'otu afọ ahụ, ọ zutere ma lụọ Susanna Neethling (26 Eprel 1862 - 14 Mee 1889) na 10 Nọvemba 1884. Site na Free State, ọ kwagara na Cape Colony ma rụọ ọrụ n'ebe ahụ ruo 1897 mgbe a họpụtara ya dị ka onye nduzi mbụ nke Staatsmuseum (Ọbaṅkà steeti) dị na Pretoria, nke e mechara kpọwa Ọbaṅkà Transvaal. Ọ nọgidere bụrụ onye nduzi ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 1913. Gunning bụ onye guzobere National Zoo dị na Pretoria n'afọ 1899.
Mgbe a tụrụ Winston Churchill mkpọrọ na Pretoria n'oge Agha Boer, ọ matara Gunning nke ọma, onye bụ otu n'ime ndị nduzi ụlọ mkpọrọ ahụ. O kwuru banyere ya, sị:
"Dọkịta Gunning bụụrụ onye Hollands dị ntakịrị a na-ahụ n'anya, buru ibu, dị mụrụmụrụ ma gụọ akwụkwọ nke ọma. Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị uchu ma nwee njikọ ofụma yana gọọmentị Boer, nke kwụrụ ya ụgwọ ọnwa mara mma nke ukwuu maka ilekọta ọ́bankà steeti. O nweekwara nchịkọta stampụ mara mma, ma sorokwa n'iguzobe ogige Nlekọta ụmụ anụmanụ. Ebumnobi ikpeazụ a dubara ya, naanị ntakịrị oge tupu agha ebido, n'ime nsogbu kacha sie ike, n'ihi na onwenwughị ike iguzogide ọdụm nke Maazi Rhodes nyere ya. Ọ gwara me na ntukwasi obi na onye isi ala gwara ya okwu n'ólú kacha dị ike n'ihi nkea, ma tiekwa íwú maka mweghachi ozugbo nke nwa anụ ọhịa ahụ n'okpuru iyi egwu nke ịchụ n'ọrụ ozugbo"
Capt. Aylmer Haldane, onye mkpọrọ ọzọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ahụ nwere ihe ndị a ikwu:
"Onye nọ n'isi nlekọta anyị bụ ndị ọrụ abụọ, otu onye, onye nchịkwa ndị agha Boer, onye nke ọzọ, onye Holland dị jụụ, Dọkịta Gunning, onye, n'otu oge ahụ na-arụ ọrụ abụọ bụ onye nchịkwa Ogige ụmụ anụmanụ na onye nlekọta ọ́bankà. Onye nchịkwa ndị agha ahụ abụghị onye nwere akparamagwa niile a chọrọ, ma dọkịta ahụ nwere agwà mmadụ ma.mee ihe niile I nwere ike ịme ka ọnụnọ anyị na mkpọrọ dị otu a ga-anagidenwu.
Mgbe nwunye mbụ ya nwụrụ, ọ lụrụ Ellen Elizabeth Dobbin (amụrụ na 30 Disemba 1867) nke Bethulia na 19 Nọvemba 1889. Ọ bụ nwa nwanyị nke William Rouse Dobbin na Emma Elizabeth Kirkham.
Ya na Alwin Karl Haagner chịkọtara A Checklist of the Birds of South Africa n'afọ 1910. Ụdị nnụnụ Sheppardia gunningi, nke a na-akpọkwa east Coast akalat nke ma ọ bụ akelat nke Gunning, ka a kpọrọ aha ya.
Ihe edeturu na ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Biography of J. W. B. GunningnaS2A3Biographical Database nke Southern African Science
- Johannes Hermanus Gunning
- Johannes Willem Gunning