Gaa na ọdịnaya

Jane Brotherton Walker

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Jane Brotherton Walker (n'ubochi ịrị atọ na otu n'ọnwa Jenụwarị 1925 - n'ubochi atọ n'onwa Eprel 2009) bụ onye ọkà mmụta mba Kenya-South Afrịka na ngalaba nke taxonomy tick, ọkachasị na Afrịka.

A mụrụ ya na Ụbọchị ịrị atọ na otu n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1925 na Nairobi, mba Kenya, Walker tolitere n'ugbo ma nne ya gụrụ akwụkwọ n'ụlọ n'oge ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị. Ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya na mba England ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na Retford High School for Girls na n'afọ 1944. N'oge ọ nọ n'England, ọ butere ọrịa poliomyelitis, nke ihe si na ya pụta ga-eji nwayọọ nwayọọ metụta ikike ya ịga ije, ọkachasị n'oge ọ na-etolite. O nwetara nzere Bachelor of Science (na Honours) n'afọ 1948 na nzere Master of Science n'afọ 1959, ma na Mahadum Liverpool. N'afọ 1983, Mahadum nke Witwatersrand, Johannesburg, South Africa nyere ya nzere Doctor of Science (Hon.).

Walker nwetara ọrụ mbụ n'afọ 1949 na Ngalaba Nnyocha nke His Majesty's Overseas Civil Service dị ka onye nyocha na East African Veterinary Research Organization na Muguga, Kenya, ebe ọ malitere ka onye isi sayensị tupu ọ banye n'ọkwa dị ka onye isi ọkachamara na Veterinary research Institute, Onderstepoort, n'afọ 1966 mgbe Gertrud Theiler lara ezumike nká. Ọ nọrọ ndụ ya fọdụrụ n'ọrụ n'ụlọ akwụkwọ ahụ, na-arịgo n'ọkwa Chief Veterinary Researcher, ma na-eje ozi dị ka Specialist Scientist ruo mgbe ahụike na-ada mere ka ọ laa ezumike nká n'afọ 1990. Mgbe ọ lara ezumike nká, ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ mgbe o nwere ike na Onderstepoort na ikike emeritus ruo n'afọ 1998. Ọ bụ ọkachamara na-eduga na ụdị Rhipicephalus na African Amblyomma ma jee ozi dị ka onye otu Kọmitii nchịkọta akụkọ nke Onderstepoort Journal of Veterinary Research site na afọ pụkụ na narị itoolu na ịrị isii na itọọlu ruo afọ pụkụ abụọ . N'oge ọ na-arụsi ọrụ ya ike, Walker dere ma ọ bụ soro dee akwụkwọ sayensị rụrụ ịrị ise na atọ na akwụkwọ ise, ma kọwaa ụdị akọrọ ọhụrụ dị na ọnụọgụgụ ịrị na asatọ. O nyekwara aka zụọ ndị nchọpụta ndị ọzọ, gụnyere Gertrud Theiler na Harry Hoogstraal.

Walker nwụrụ n'ụlọ ya na Pretoria n'ụtụtụ nke ụbọchị atọ n'onwa Eprel n'afọ pụkụ abụọ na itọọlu.

Nsọpụrụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

Na mgbakwunye na Doctor of Science nke Mahadum Witwatersrand nyere ya n'afọ 1983, ndị ọgbọ ya nabatara Walker na atọ n'ime ihe nrite kachasị elu na ngalaba sayensị nke ihe ndị dị ndụ na South Afrịka, 1988 Elsdon Dew Medal nke Parasitological Society of Southern Africa maka ọrụ pụrụ iche enyere Parasitology na Afrịka, Agricultural sayensị and Technology Woman of the Year Award maka 1998, na Theiler Memorial Trust Award maka ọrụ pụrụ ọnụ enyere Veterinary Science na Afrịka. argasid tick Argas walkerae Kaiser & Hoogstraal, 1969, "Walker's South African fowl argasid" na ixodid tick Haemaphysalis walkerae Apanaskevich & Tomlinson, 2019 ka akọrọ aha iji sọpụrụ onyinye ya na ahụ nke ihe ọmụma banyere ticks.[1]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Apanaskevich (2019-11-01). "Description of four new species of Haemaphysalis Koch, 1844 (Acari: Ixodidae) from the H. (Rhipistoma) spinulosa subgroup, parasites of carnivores and rodents in Africa" (in en). Systematic Parasitology 96 (8): 625–657. DOI:10.1007/s11230-019-09875-7. ISSN 1573-5192. PMID 31441012.