Gaa na ọdịnaya

Jean Leclercq (politician)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Jean Lerclercq bụ onye otu Conseil économique wallon mgbe ọ sonyeere Walloon Rally n' afo 1968 na ntọala nke atụmatụ mpaghara. Ọ ghọrọ olu a ma ama, a họpụtakwara ya na ntuli aka nke ụbọchị 31 ọnwa Machị afọ 1968. Ọ bụ otu n'ime ndị mbụ nke Walloon Rally a họpụtara ka ọ bụrụ onye omeiwu. Ọ ghọrọ onye otu komikion nke Ọrụ ugbo na Ezinụlọ mana ọ nwụrụ na Krismas afọ 1970. Paul Van Damme nọchiri ya.

Na nzuko Walloon Rally nke 22 n' ụbọchị 23 Maachị afọ 1969, ọ siri ọnwụ na Mouscron na Comines bụ 100% French, na maka mmekọrịta siri ike n'etiti Walloon na France . Na ntuli aka obodo nke Tournai na Oktoba afọ 1970, ọ megidere ndị ọzọ na pati ya, ma guzobe ndepụta nke ya, aha ya bụ Rénovation tournaisienne . A họpụtara ya onye kansụl ọgbakọ, mana ọ nwụrụ tupu ọ were oche ya.

Ntụaka

[dezie | dezie ebe o si]