Joanna Leunis
Joanna Leunis (amụrụ na ụbọchị ịrị abụọ na abụọ n'onwa Mee n'afọ pụkụ na narị itoolu na ịrị asatọ na otụ na Rocourt, Liège, Belgium), bụ onye na-agba egwú mba Latin. Ya na Michael Malitowski, ọ bụbu onye mmeri World Latin Dance [1] na onye mmeri International Latin American Dance ugbu a. Di na nwunye ahụ nọchitere anya Poland ruo n'afọ pụkụ abụọ na ịrị na otụ, wee họrọ ịnọchite anya England ruo mgbe ha lara ezumike nká n'afọ pụkụ abụọ na ịrị na ise.
Mgbe ọ dị afọ asatọ, ọ na-arịa ọrịa ọbara yiri leukemia na ólú bekee, mana ọ gbakere mgbe otu afọ gachara.[2] Joanna na-asụ ọtụtụ asụsụ, gụnyere French, English, Dutch na German, a na-ekwukwa na ọ na-amụta Italian. Egwú Joanna gụnyere ọzụzụ na ballet, tap na ballroom na ịgba egwu Latin America. Tupu ya na Michael Malitowski na-arụkọ ọrụ, Joanna nwere ọtụtụ mmekọrịta na-aga nke ọma. Mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, Joanna meriri World Amateur Latin Championship, ya na Slavik Kryklyvyy. Mgbe e mesịrị, ya na Malitowski, ọ meriri WDC World Professional Latin Championship na pụkụ abụọ na asatọ na pụkụ abụọ na itoolu. N'afọ pụkụ abụọ na ịrị na abụọ, Leunis na Malitowski ghọrọ ndị mmeri Open British.
Njikọ di na nwunye ahụ gụnyere mmeri na asọmpi ịgba egwú Latin niile kachasị ewu ewu. [3] Dị ka ndị na-agba egwú asọmpi, ha bụ ndị ọkachamara kpamkpam na ịgba egwú Latin.
Mgbe ha meriri Professional Latin Championship na Blackpool Dance Festival 2015 maka oge nke asatọ, Michael na Joanna kwupụtara ezumike nká ha na asọmpi asọmpi ahụ.
N'ọnwa Ọgọstụ pụkụ abụọ na ịrị na itọọlu, a mara ọkwa na Michael na Joanna ekpebiela ịhapụ. Ha anaghịzi ebi, na-arụ ọrụ ma ọ bụ na-agba egwú ọnụ.
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Result Service - Competition info. Danceplaza.com. Archived from the original on 2012-06-06. Retrieved on 2012-06-18.
- ↑ Joanna Leunis. Archived from the original on 2009-10-27. Retrieved on 2009-10-22.
- ↑ DancesportInfo.net. Archived from the original on 2009-03-28. Retrieved on 2009-10-22.