John Chizoba Vincent
John Chizoba Vincent (a mụrụ ya na 18 Mee 1990) bụ onye Naịjirịa na-emepụta ihe nkiri [1] na onye edemede[2][3]. A mụrụ ya ma otoo na Aba, Steeti Abịa. Edemede na uri o dere apụtala na Poemhunter, Poetrysoup, AfricanWriter, Punocracy, Afrocritik, Vanguard, Pu
John Chizoba Vincent | |
|---|---|
| Born | Aba |
| Other names | J.C.V |
| Citizenship | Nigeria |
| Education | Lagos State University of Science and Technology |
| Alma mater | Lagos State University of Science and Technology |
| Occupation | Filmmaker, Screenwriter, Cinematographer and entrepreneur |
nch na Pulse Nigeria. Ọ bụkwa otu n’ime ndị nyere aka n’akwụkwọ uri dị ka Wreath for a Wayfarer[4][5]—[6]akwụkwọ uri maka onye nwụrụ anwụ Pius Adesanmi; Unbound[7]: An Anthology of New Nigerian Poets Under 40, nke Chibueze Darlington Anuonye na Nduka Otiono chịkọtara; 84 Delicious Bottles of Wine[8] for Wole Soyinka nke Shawa Odega na Onyeka Nwelue; nakwa Arrow of Words[9] for Chinua Achebe.
Ndụ Mbido na Agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Chizoba na 18 Mee 1990 ma too ya na Aba, ebe o biri na nne na nna ya. O jiri akụkụ nwata ya biri n’etiti Nkporo na Aba. Ọ malitere agụmakwụkwọ praịmarị ya obere oge na Owerri-Aba Community School, Ugwunagbo, mesịa kwaga His Image Nursery and Primary School, Aba, ebe o mezuru praịmarị ya. O mechara kwaga Lagos iji gaa sekọndrị obere oge na Jimbell High School, ma mesịa gaa Olorunfunmi Senior Grammar School, Idimu, Lagos, ebe o mezuru sekọndrị ya. O gụsịrị akwụkwọ na Lagos State University of Science and Technology, Ikorodu.
Oru
[dezie | dezie ebe o si]Site na 2009 ruo 2016, Chizoba[10] rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị dị iche iche n’ime Steeti Lagos. Mgbe o gụsịrị mahadum, ọ gara mụta ime ihe nkiri na Helen Paul Theatre and Film Academy na 2015.
Kemgbe 2013, Vincent[11] edewola ma bipụtakwa ihe karịrị akwụkwọ asaa, gụnyere: Good Mama, Hard Times, The Poet of Witness, The Grief Gallery, Don’t Call Us Water, There Are No Africans in Heaven, na For Boys of Tomorrow.
O dere ihe karịrị screenplays[12][13] iri atọ, nke emepụtara dị ka ihe nkiri. Ụfọdụ n’ime ihe nkiri o dere ma duzie gụnyere: Love in the Strangest Place, To Love a Street Girl, Love Birds, Pride and Seduction, Differences, Married to an Influencer, When Life Happens, Love and Respect, Sound of Hatred, Broad Amos, Resident 38, Daughtas, Don’t Call Us Water, Haunting Realities, na Lives and Personalities. Ihe nkiri mkpirikpi ya—Distraction, nke o duziri na Olamide—họpụtara ya n’otu emume ihe nkiri na São Paulo, Brazil. Ọrụ ya apụtala na Nantygreen, Opinion Nigeria, Vanguard, The Guardian, Punocracy, na ebe ndị ọzọ. Ọ bụ Onye Isi Okike nke The Philm Republic Picture[14], ụlọ ọrụ mgbasa ozi na mmepụta ihe nkiri dị na Lagos.
Ndeputa Fim
[dezie | dezie ebe o si]• Love In The Strangest Place 2024
• To Love A Street Girl 2024
• Love Birds 2024
• Pride and Seduction 2024
•Differences 2024
• Married To An Influencer 2023
• When Life Happens 2023
• Love and Respect 2022
• Broad Amos 2025[15]
• Resident 38 2022
• Haunting Realities 2023
• Daughtas 2022
• Don't Call Us Water 2023
• Lives and Personalities 2021
Ndepụta akwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]• Good Mama: Mainstream publishers, 2013
• Don't Call Us Water[16] Yagazie Books, 2025
• The Poet Of Witness[17] Yagazie Books, 2025
• Hard Times, Human Change Communication Company, 2015[18]
• The Grief Gallery[19] [20] Yagazie Books, 2025
• There Are No Africans In Heaven, Yagazie Books, 2025
• For Boys Of Tomorrow[21] Ace world Publishers, 2018
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Adedamola Adedayo (2025-01-13). My Life In Nollywood: John Chizoba Vincent (en-GB). The Culture Custodian (Est. 2014.). Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Casting: Rethinking Risk, Range, and Representation in Nigerian Films - Nollywood Reporter (en) (2025-10-13). Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ John Chizoba Vincent - Actor Website (en). ActorCV. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Toni Kan (2020-08-02). "Wreaths for a Wayfarer": Towering Testaments To Pius Adesanmi-Uzor Maxim Uzoatu (en-US). The Lagos Review. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Wreaths for a Wayfarer: An Anthology in Honour of Pius Adesanmi (en-US). Open Country Mag. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ New Poetry Anthology, Wreaths for a Wayfarer, Published in Honour of Pius Adesanmi (en-US). Brittle Paper (2020-02-18). Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Unbound (en-US). University of Toronto Press Distribution. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Toni Kan (2020-07-13). Thunder Strikes 86 Times In Celebration Of Wole Soyinka-Uzor Maxim Uzoatu (en-US). The Lagos Review. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Chioma Iwunze-Ibiam (2019-11-19). Publication of "Arrows of Words", an Anthology in Honor of the late Prof. Chinua Achebe. (en-US). Creative Writing News. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ By (2024-02-27). 5 Nigerian Indie Filmmakers Making Waves (en-GB). The Culture Custodian (Est. 2014.). Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ “Humanity inspires me to make films” — Filmmaker John Chizoba [Interview] (en). theradar.ng. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ 'I have never been starstruck', movie producer, John Chizoba Vincent. TIL Magazine. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Casting: Rethinking Risk, Range, and Representation in Nigerian Films - Nollywood Reporter (en) (2025-10-13). Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Adigun Temitope. Filmmaking in Nigeria needs stubbornness – Vincent - Africana Entrepreneur (en-US). africanaentrepreneur.com. Archived from the original on 2024-09-12. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ "Broda Amos" and Religious Fanaticisms in Nigeria. TIL Magazine. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ The Grief Gallery (en). Reimagine. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ John Chizoba Vincent (2025-10-10). The Grief Gallery (in en). Yagazie Books. ISBN 979-8-2748-8143-2.
- ↑ Fiction4All (2023-03-31). Hard Times by John Chizoba Vincent.
- ↑ The Grief Gallery (en). Reimagine. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Books by John Chizoba Vincent (Author of Goodmama). www.goodreads.com. Retrieved on 2025-12-29.
- ↑ Micheal Ace (2018-03-16). Book Review: John Chizoba Vincent; A God In His Own Creativity | A Review Of For Boys Of Tomorrow (en). ACEworld. Retrieved on 2025-12-29.