Gaa na ọdịnaya

John Walter Jones (Wales)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
John Walter Jones
Born
Died
CitizenshipBritish
OccupationLanguage activist, civil servant, radio presenter

John Walter Jones (28 Maachi 1946 – 24 Septemba 2020)[1][2] bụ onye ọrụ obodo na onye isi nchịkwa mbụ nke kọmitii Asụsụ Welsh, ọkwa nke o mere n'etiti 1993 na 2004.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ John Walter Jones na Anglesey" id="mwIA" rel="mw:WikiLink" title="Moelfre, Anglesey">Moelfre, Anglesey, ma gụọ akwụkwọ na Friars School, Bangor. Ọ gụrụ Economics na Mahadum nke Wales Institute, Cardiff.

Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ obodo n'etiti 1971 na 1988, na Welsh Office na Cardiff na London, ebe ọ bụ onye odeakwụkwọ nkeonwe nke ndị Minista Ọfịs Welsh atọ.

N'afọ 1981, John bụ onye na-ahụ maka ịmepụta ọchịchị enyemaka mbụ nke gọọmentị iji kwado Asụsụ Welsh na n'afọ 1988, e nyere ya aka iguzobe Ụlọ Ọrụ Asụsụ Welish na-abụghị nke iwu kwadoro. Ọ ghọrọ onye isi oche mbụ nke ụlọ ọrụ Welsh Language Board na 1993, ma nyere aka dee Iwu Asụsụ Welsh nke mere ka Welsh kwekọọ n'asụsụ Bekee na Wales.[3]

Jones lara ezumike nká na Welsh Language Board na 2004, na n'afọ ahụ ka a họpụtara ya na Order of the Bards na National Eisteddfod na Newport. Ọ nwetakwara OBE maka ọrụ ya na asụsụ Welsh n'otu afọ ahụ.[4]

N'ọnwa Eprel afọ 2006, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke ụlọ ọrụ telivishọn Welsh S4C . Ọ lara ezumike nká na mbido Disemba 2010 n'ọnọdụ esemokwu dịka o bu n'obi ịnọgide n'ọkwa ya ruo n'oge opupu ihe ubi 2011.

N'agbata afọ 2014 na 2018, o gosipụtara ihe ngosi mkparịta ụka n'oge nri ehihie na BBC Radio Cymru .

Na 24 Septemba 2020, a mara ọkwa na Jones anwụọla, ọ gbara afọ 74. [3]

Ndụ onwe onye

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Gaynor. Ha nwere otu nwa nwanyị, Beca, onye nwụrụ mgbe ọ dị afọ 32 na 2010. Na 2018 National Eisteddfod nke e mere na Cardiff, Jones na nwunye ya nyere ihe nrite ego enyere na oche maka ncheta nwa ha nwanyị.[5]

Ntụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. "Former Welsh language chief John Walter Jones dies", BBC News, 2020-09-24. Retrieved on 2020-09-24. (in en-GB)
  2. Funeral notice for Mr John Walter Jones (en). www.dignityfunerals.co.uk. Retrieved on 2020-10-03.
  3. 3.0 3.1 "Former Welsh language chief John Walter Jones dies", BBC News. Retrieved on 24 September 2020.
  4. The London Gazette. The Gazette (12 June 2004). Retrieved on 24 September 2020.
  5. Eisteddfod Chair inspired by traditional stick chairs (en-US). Art Scene in Wales (2018-07-30). Archived from the original on 2020-10-24. Retrieved on 2020-09-29.