Josina Z. Machel
Josina Z. Machel | |
|---|---|
| Born | Josina Ziyaya Machel Templeeti:Birth month and age |
| Citizenship | Mozambique |
| Education | University of Cape Town |
| Alma mater | London School of Economics |
| Occupation | Activist |
| Organization | Kuhluka Movement |
| Parents |
|
| Relatives | Nelson Mandela (step-father) |
| Website | Templeeti:Url |
Josina Ziyaya Machel (amụrụ n'Eprel 1976) bụ onye Mozambique na-akwado ikike mmadụ. Aha ya gbara n'ime ụmụ nwanyị otu narị nke BBC n'afọ 2020.
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]
A mụrụ Machel na Maputo n'ọnwa Eprel afọ 1976. Ọ bụ nwa nwanyị nke onye bụbu onye isi ala Mozambik Samora Machel na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Mozambik na onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze Graça Machel, onye mechara lụọ onye ndọrọ ndọrọ nke South Africa Nelson Mandela . [1] Nna ya ahọrọla aha nwunye mbụ ya, onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị Josina Machel, dị ka ụtụ nye ya.[2] Nna Machel nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu, nke ụfọdụ na-eche na ọ bụ igbu ọchụ, mgbe ọ dị afọ iri.[3] Mgbe nne ya na Nelson Mandela malitere mmekọrịta, Machel kwagara South Africa ma, mgbe ha lụchara, ọ ghọrọ nwa nwanyị Mandela.[3]
Machel gụrụ Sociology na Political Science na Mahadum Cape Town, wee mụọ maka MSc site na London School of Economics, n'otu ọzụzụ ahụ.[4] Akwụkwọ edemede MSc ya bụ 'AIDS: Ọrịa nke ịda ogbenye ma ọ bụ ndị isi'. [5] Otu mmepụta nke nyocha ya bụ mbipụta nke isiokwu 'Akpukpọ mmekọahụ na-adịghị mma n'etiti ụmụ akwụkwọ nwanyị na Mozambique: ihe gbasara okike na klas', nke e bipụtara na akwụkwọ akụkọ Reproductive Health Matters . [5]
Onyinye na nsọpụrụ
[dezie | dezie ebe o si]A họpụtala Machel maka ọtụtụ onyinye na nsọpụrụ, gụnyere:
- P"Trailblazer Award", nke American SOHO (Saving Orphans through Healthcare and Outreach) nyere na 2016. [6]
- Onye mmeghe nke Mama Albertina Sisulu 100 Women of Fortitude Group . [7]
- 100 Women List, nke BBC họọrọ ma bipụta na 23 Nọvemba 2020. [4]
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Mas (2019-11-24). Josina Machel: "Ser filla del president de Moçambic i fillastra de Mandela no m'ha evitat ser una víctima" (ca-ES). Ara.cat. Retrieved on 2021-01-02.
- ↑ Samora Machel's daughter among the 100 most influential women in the world (en-US). Plataforma Media (2020-11-26). Retrieved on 2021-01-02.
- ↑ 3.0 3.1 Graça Machel on Mandela: 'I learned to separate the man from the myth' (en). The Guardian (2013-12-06). Retrieved on 2021-01-02.
- ↑ 4.0 4.1 "BBC 100 Women 2020: Who is on the list this year?", BBC News, 2020-11-23. Retrieved on 2021-01-02. (in en-GB)
- ↑ 5.0 5.1 Machel (2001-01-01). "Unsafe sexual behaviour among schoolgirls in Mozambique: a matter of gender and class". Reproductive Health Matters 9 (17): 82–90. DOI:10.1016/S0968-8080(01)90011-4. ISSN 0968-8080. PMID 11468850.
- ↑ "Trailblazer Award" 2016 for Josina Machel - AIM (en-US). Mozambique. Retrieved on 2021-01-02.
- ↑ Josina Z. Machel - Mozambique (en-US). One Billion Rising Revolution (2013-07-10). Archived from the original on 26 January 2021. Retrieved on 2021-01-02.