Gaa na ọdịnaya

Jules Bordet

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jules Bordet
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịBelgium Dezie
Aha n'asụsụ obodoJules Jean-Baptiste Vincent Bordet Dezie
Aha enyereJules Dezie
Aha ezinụlọ yaBordet Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Jụn 1870 Dezie
Ebe ọmụmụSoignies Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya6 Eprel 1961 Dezie
Ebe ọ nwụrụBrussels Dezie
Ebe oliliIxelles Cemetery Dezie
IkwuOctave Gengou Dezie
Asụsụ obodoFrench Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench Dezie
Ọrụ ọ na-arụbiologist, immunologist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, university teacher, dermatologist Dezie
Ụdị ọrụ yamicrobiology Dezie
Onye were ọrụUniversité libre de Bruxelles Dezie
Ọkwá o jiSenator of Belgium Dezie
Ebe agụmakwụkwọFree University of Brussels Dezie
Onye ndụmọdụ doctoralIlja Iljitsch Metschnikov Dezie
Onye òtùOctave Gengou Dezie
Interested inmicrobiology Dezie

Jules Jean Baptiste Vincent Bordet (/bɔːrˈdeɪ/ bor-DAY, [ʒyl ʒɑ̃ batist vɛ̃sɑ̃ bɔʁdɛ]; 13 Jun 1870 - 6 Eprel 1961) bụ onye Belgium na-ahụ maka ihe ndị na-emetụta ihe nchekwa ahụ mmadụ megide ọria yana onye gụrụ maka ụmụ njé. A na-akpọ Ụdị nje bacteria Bordetella aha ya. E nyere ya Ihe nrite Nobel na Physiology ma ọ bụ Medicine na 1919 maka nchọpụta ya metụtara usoro ahụ si alụso ọrịa ọgụ.

Agụmakwụkwọ na mmalite ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Bordet na Soignies, Belgium. Ọ gụsịrị akwụkwọ dị ka Dọkịta na Mahadum Free nke Brussels na 1892 wee malite ọrụ ya na Pasteur Institute na Paris na 1894, na ụlọ nnyocha nke Elie Metchnikoff, onye ka chọpụtara oriri njé bacteria site na ọbara ọcha, ngosipụta nke mkpụrụ ndụ ichekwa ahụ megide ọria.[1]

N'afọ 1895, Bordet chọpụtara na mmetụta nke ogbugbu njé n'ime ahụ sitere na ihe ndị na-egbochi ọrịa ịbanye n'ahụ a na-enweta enweta na-eme ka ọ dịkwuo mma na ndụ site na serum ọnatarachi dị n'ahụ nke ọ kpọrọ alexine (ma nke a maara ugbu a dị ka ihe mgbakwunye). Afọ anọ ka e mesịrị, na 1899, ọ kọwara usoro mbibi njé yiri nke ahụ nke gụnyere usoro enyemaka "hemolysis" , nke bụ na mkpụrụ ndụ ọbara uhie uhie nke e mere n'akụkụ ahụ ebe ọzọ ka a ga-agbapụ ma ọ bụ "lysed" mgbe ha na serum na-alụso ọrịa ọgụ nwere mmetụta. N'afọ 1900, ọ hapụrụ Paris iji guzobe ụlọ akwụkwọ na Brussels dị ka Pasteur, ma gaa n'ihu na-arụ ọrụ nke ọma na usoro ndị metụtara ọrụ nke mgbakwunye. Nnyocha ndị a ghọrọ ihe ndabere maka usoro nnyocha nke mgbakwunye nke mere ka amalite usoro ule serological maka syphilis (karịsịa, mmepe nke nnyocha Wassermann site na August von Wassermann). A na-eji otu usoro ahụ eme ihe taa na nnyocha serologic maka ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ.

Ya na Octave Gengou, kewapụrụ Bordetella pertussis na ọdịbendị dị ọcha na 1906 ma kwuo na ọ bụ ihe na-akpata ụkwara ọdịdọ. [2] Ọ ghọrọ Prọfesọ nke Bacteriology na Mahadum Libre de Bruxelles na 1907.

Ili Jules Bordet na Ixelles Cemetery

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù

[dezie | dezie ebe o si]

Na Machị 1916, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mba ọzọ so na Royal Society [3]e ruo na 1930, o nye nkụzi Croonian ha. [4] Na nkuzi a, Bordet kwubiri na nje bacteriophagea, nje bacteria na-egbu "njé vairọs ndị a na-adịghị ahụ anya" nke Felix d'Herelle chọpụtara adịghị adị nakwa na nje bacteria na'egbu onwe ha site na iji usoro a na-akpọ autolysis. Echiche a dara na 1941 site na mbipụta nke Ruska nke foto bacteriophages e gosiri na electron microscope nke mbụ ya. E nyere ya Ihe nrite Nobel n'isi ọmụmụ Physiology ma ọ bụ Medicine na 1919 maka nchọpụta ya metụtara nchekwa ahụ mmadụ megide ọrịa.

Bordet nwụrụ na 1961 we lie ya n'ebe olili ozu ọha bụ Ixelles dị na Brussels.

  • 1919: Onye òtù Royal Academy of Science, Letters and Fine Arts nke Belgium.
  • 1921: Ihe nrite Cameron maka Therapeutics like Mahadum Edinburgh.

Ọ́dụ̀ okporo ígwè Bordet dị na Brussels ka a kpọrọ aha ya.

Ụlọ ọgwụ ọrịa kansa Institut Jules Bordet ka a kpọkwara aha ya.

Ebemsidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. The American Association of Immunologists - Jules Bordet. www.aai.org. Retrieved on 2026-01-06.
  2. Ligon (April 1998). "Jules Bordet: Pioneer researcher in immunology and pertussis (1870-1961)". Seminars in Pediatric Infectious Diseases 9 (2): 165. 
  3. Oakley (1962). "Jules Jean Baptiste Vincent Bordet 1870-1961". Biographical Memoirs of Fellows of the Royal Society 8: 18–25. DOI:10.1098/rsbm.1962.0002. 
  4. Library and Archive Catalogue. Royal society. Retrieved on 18 December 2010.
  • Jules Bordet (Frederick P. Gay translator) (1909) Studies in Immunity, John Wiley & Sons, njikọ sitere na Internet Archive.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]

Templeeti:Nobel Prize in Physiology or Medicine Laureates 1901-1925Templeeti:1919 Nobel Prize winners