Gaa na ọdịnaya

Juma Kaseja

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Juma Kaseja Juma (amụrụ n'abalị iri abụọ n'ọnwa Eprel n'afọ mateghete iri asatọ na ise) bụ onye Tanzania na-agba bọọlụ nke na-agba dịka onye na-eche goolu maka Kinondoni Municipal Council F.C (KMC FC). Ọ bụkwa onye otu egwuregwu mba Tanzania. Kaseja malitere ịsọ mpi na Simba na-ahapụ klọb ahụ n'oge na-adịghị anya mgbe ngwụcha oge ahụ gasịrị. N'afọ ndị mbụ ya, ọ gbara bọọlụ na Makongo Dar es Salaam na Serengeti Boys. Kaseja mechara debanye aha na Moro United n'afọ puku abụọ.

Ọrụ klọb

[dezie | dezie ebe o si]

Na mbido ọrụ ya, Kaseja gara Makongo Secondary School. O mechara gbaa bọọlụ maka otu egwuregwu bọọlụ ha, Makongo Dar es Salaam. Ọrụ ya na Makongo sochiri site n'ịnọ na otu Serengeti Boys Under-17 . [1]

Kaseja binyere aka na Moro United F.C. tupu oge 2000-2001 na bọọlụ Tanzania. Ọ gbara bọọlụ oge abụọ mbụ ya kpamkpam, mana ndị Tanzania Football Federation machibidoro ya mgbe ọ hapụrụ iji sonye na Gothia Cup, asọmpi bọọlụ ndị ntorobịa nke dị na Sweden. Mgbe ihe omume ndị mere na Morogoro gasịrị, Onye na-edebe goolu ahụ gafere na Simba S.C. na Tanzania Premier League. Ọ ghọrọ onye otu na-arụsi ọrụ ike malite na 2009. N'ụbọchi iri na otụ n'ọnwa Nọvemba 2013, ndị Young Africans S.C., bịanyere aka na Kaseja, bụ ndị na-egwuri egwu na ọkwa kachasị elu nke bọọlụ Tanzania.[2]

Ọrụ mba ụwa

[dezie | dezie ebe o si]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Okinyo. Up close with Simba keeper Juma Kaseja. SuperSport.com. Retrieved on 4 July 2014.
  2. Ayo. Unataka kuona picha za Juma Kaseja akisaini kujiunga Yanga na kiwango cha pesa kilichotolewa kumchukua?. MillardAyo.com. Archived from the original on 14 July 2014. Retrieved on 2 July 2014.