Jumoke George

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jumoke George
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoJumoke George Dezie
Aha ọmụmụOlajumoke Amoke Olatunde George, Jumoke George Dezie
Aha enyereJumoke Dezie
aha ezinụlọ yaGeorge Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa, French language Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ihe nkiriLove Castle, The Ghost and the Tout, My Wife & I, The Wedding Party Dezie
Ihe nriteCity People Entertainment Awards Dezie
nnọchiaha nkeonweL485, L484 Dezie

Jumoke George bụ nwaafọ Naijiria onye na-eme ihe nkiri ma na-emepụta ihe nkiri. Aha ya niile bụ Olajumoke Amoke Olatunde George. Ọ meela ihe nkiri ihe karịrị afọ iri anọ ma meekwa ọtụtụ ihe nkiri di iche iche na Ngalaba Yoruba na Bekee nke Nollywood.

Mmalite Ndụ na Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Jumoke George n'abalị iri na asatọ nke onwa Febụwarị. O tolitere n'ezinụlọ siri ike, ebe ya na nna ya, onye so na ndị agha nakwa nne nne ya bụ Nọọsụ ndị agha bi. Ọ gara akwụkwọ na Command Children School Ann's Barracks Yaba, Lagos ; Army Children School Kano; Anglican Grammar School,Orita mefa, Ibadan ma mecha gaa n'ihu igụ na Government Technical College, Osogbo ebe ọ gụrụ Business Administration. Jumoke si n'ezinụlọ nwee nkewa. Nne ya na nna ya kewara mgbe ọ ka dị obere ma o kpebiri ibi na nke nna ya na nne nne ya. Ya na nne nne ya mechara nwee nsogbu nke mere ka nna ya jụ ya ma chụpụ ya n'ụlọ mgbe ọ ka na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nne ya anabataghi ya nke mere ka ọ ga biri na nke ndị enyi ya. [1] [ <span title="18 February of what year? (April 2019)">Mgbe?</span>

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Jumoke George malitere ime ihe nkiri mgbe o dị afọ asatọ site n'aka enyi nna ya. Ọ mere ihe nkiri na nkwago na National Television Authority ( NTA ), Ibadan. E debanyere aha ya na otu ihe nkiri na NTA Ibadan site n'aka otu nwoke aha otutu ya bụ 'Water Aqua'. O mechara zute onyeisi ya bụ Comrade Victor Ashaolu, onye kpọbatara ya n'ụlọ ọrụ ihe nkiri yoruba. Comrade Victor kụziiri ya ihe nkiri n'ihe dị ka afọ iri na otu. N'otu oge n'ọrụ ya, ọ gosighi n'ihe nkiri ọ bụla ihe dị ka afọ iri na anọ na-enwetaghi ọrụ ọ bụla n'aka ndị nduzi na mepụta ihe nkiri n'ihi na ya nwere oke nlezianya n'ebe ụmụ nwoke nke ndị ụlọ ọrụ ahụ nọ. N’oge ezumike a si n'ụlọ ọrụ ihe nkiri, Jumoke bụurụ onye otu Freelance and Independent Broadcasters Association of Nigeria; (FIBAN). Ọ kwadoro ihe omume ise nke mere ka ọ ghara inwe efe n'ime ihe nkiri. [2]

Ihe Nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Eekan soso, 2009[3]

The Wedding Party, 2016

Nrite[dezie | dezie ebe o si]

City People Movie Matriarch Recognition Award 2018[4]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "How I was disowned by my father, rejected by mum at 8 — Olajumoke George", Tribune, 2018-07-22. (in en-GB)
  2. "How I survived after movie producers abandoned me – Actress Olajumoke George | Nollywood Community", Nollywood Community, 2018-05-16. (in en-US)
  3. Jumoke George.
  4. "Winners Emerge @ 2018 City People Movie Awards | City People Magazine", City People Magazine, 2018-09-24. (in en-US)