Gaa na ọdịnaya

K. Alexander Adelaar

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
K. Alexander Adelaar

 

Karl Alexander "Sander" Adelaar FAHA (amụrụ n'afọ 1953 na The Hague [1] bụ ọkachamara asụsụ nwere mmasị na asụsụ ndị Austronesian nke Borneo, Madagascar, na Taiwan, tinyere asụsụ Malay. Ọ na-emekwa nnyocha gbasara ọdịnala ọnụ na nke akwụkwọ nke Indonesia.) [2]

Adelaar nọ na Mahadum Palacky (Olomouc, Czech Republic) ugbu a ma soro Mahadum Melbourne rụkọọ ọrụ. Ọ bụ onye nchịkọta akụkọ ugbu a nke Pacific Linguistics.[3] na onye nchịkọta akụkọ Oceanic Linguistics. Ọ bụ onye otu Australian Academy of the Humanities kemgbe afọ 2008. [4]

Adelaar bụ onye gụsịrị akwụkwọ na Indonesian Studies na Mahadum Leiden . N'afọ 1977, ọ gbachitere thesis ya nke MA, na 1985 ọ nwetara nzere doctorate na asụsụ Austronesian.[5]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "Adelaar, Sander" (in Bekee ndị United Kingdom). NIAS. Archived from the original on 2020-04-30.
  2. ↑ "A/Prof Sander Adelaar" (in Bekee). University of Melbourne. Retrieved 2020-04-30.
  3. ↑ Editorial board, Pacific Linguistics
  4. ↑ "Fellow Profile: Alexander Adelaar". Australian Academy of the Humanities (in Bekee ndị Australia). Archived from the original on 2024-06-07. Retrieved 2024-06-07.
  5. ↑ "Fellows" (in Bekee ndị Australia). Australian Academy of the Humanities. Archived from the original on 2020-04-30.