Kabiru Ibrahim Gaya

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kabiru Ibrahim Gaya
Mmádu
Akụkụ nkeNigerian senators of the 9th National Assembly Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoKabiru Ibrahim Gaya Dezie
Aha ọmụmụKabiru Ibrahim Gaya Dezie
Aha enyereKabiru Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Jụn 1952 Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Kano State, onye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Government College, Birnin Kudu Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Nigeria People's Party, All Progressives Congress Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie

Kabiru Ibrahim Gaya (onye amụrụ n'ụbọchị nke iri n'isii nke ọnwa Juun afọ 1952) bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria nke jere ozi na Sineti nke Naịjirịa kemgbe 2007, na-anọchite anya mpaghara ndịda Kano nke Kano Steeti . O so n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) na-achị achị.

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kabiru Ibrahim Gaya N'ụbọchị iri n'isii nke ọnwa Juun afọ 1952 na Alkala quarters Gaya LG, na ezinụlọ Magajin Garin Gaya Sani. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Gaya site n'afọ 1961 ruo afọ 1964 na ụlọ akwụkwọ praịmarị Tsangaya ebe ọ gụsịrị ụlọ akwụkwọ praịmarị ya n'afọ 1968 nwanne ya nwoke nke okenye bụzi Onye isi ụlọ akwụkwọ naAbdullahi Aliyu Sumaila bụ onye na-enyere isi ụlọ akwụkwọ aka kụziiri ya mgbakọ na mwepụ na ụlọ akwụkwọ praịmarị.

Ọ gara ụlọ akwụkwọ gọọmentị, Birnin Kudu site n'afọ 1969 ruo afọ 1973 ebe ọ nwetara asambodo ụlọ akwụkwọ West Africa na kọleji nke agụmakwụkwụ ukwu site n'afọ 1974 ruo afọ 1975. O nwetere nzere bachelọ na ihe owuwu na Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria n'afọ 1977. Ọ nọgidere na mahadum a, ebe ọ mesịrị nweta akara ugo mmụta Master na ihe owuwu n'afọ 1980. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ gara akwụkwọ na ụlọ mmụta politekniki nke Kano Steeti. N’afọ 1985, ọ bụrụ onye isi oche nke Ụlọ ọrụ Atụmatụ na nchedo gburugburu ebe obibi nke Kano Steeti

Mbido Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị National Party of Nigeria (NPN) na Naịjirịa nke abụọ N'afọ 1992, n'oge mgbanwe nke obodo Naịjirịa nke atọ , ọ bụ onye otu etiti aka nri Republic National Convention (NRC) bụ onye a họpụtara n'okpuru otu a dịka gọvanọ Kano steeti site n'afo 1992 rue afọ 1993. [1] N'afọ 1997, n’oge mgbanwe General Sani Abacha, ọ banyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị United Nigeria Congress Party (UNCP) ọ bụ kwa onye otu Kọmitii mba Na-ahụ Maka Nlekọta Mba. UNCP gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka Atiku Abubakar, Emeka Ojukwu, Abdullahi Aliyu Sumaila, Mohammed Daggash, Ali Modu Sheriff, Ibrahim Saminu Turaki, Attahiru Bafarawa, Bello Matawalle, Hope Uzodinma, Adamu Aliero, Anyim Pius Anyim na ndị ọzọ. N’afọ 2003, Kabiru Ibrahim Gaya zọrọ ọkwa National Democratic Party (NDP) na ntuli aka gọvanọ steeti n'afọ 2003. [2]

Sịnetọ[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Kabiru Ibrahim Gaya na Sịneti nke ndịda Kano n'afọ 2007. A họpụtara ya na kọmitii maka ikuku mmanụ ala, Ụgwọ Obodo na mba Ofesi, Steeti na gọọmenti ime obodo na Akụrụngwa mmanụ ala elu ugwu na ọrụ [1] Na nyocha nke etiti oge nke arụmọrụ nke ndị Sịnetọ, akwụkwọ akụkọ ThisDay kwuru na ọ kwadoro Bill Management and Accountability Bill, 2009, na Millennium Development Agency Bill, 2009 . Ọ kwadoro nkwado ise ma nye aka nke ọma na arụmụka na nnọkọ ọnụ. [3]

N'ọnwa Mee afọ 2008, dịka onye isi oche kọmitii ndị omebe iwu sineti na-arụmọrụ, Kabiru Gaya kwara arịrị na ụfọdụ ọrụ na-aga nwayọ nwayọ, ma kwuo na Sineti agaghị ekwenye n'echiche nke ịtọzị ụzọ Naịjirịa . [4] N’ọnwa Nọvemba afọ 2009, ọ kwadoro mkpalite nke otu ANPP isi nke Kano iji nye gọvanọ steeti ahụ Ibrahim Shekarau, ikike ka ọ kpọpụta onye ga azọ ọkwa ọchịchị gọvanọ n’afọ 2011. Onye nhoputa ndi ochichi bu Sheikh Ibrahim Khaleel . [5] Kabiru Gaya zọrọ ọkwa dịka Sịnetọ na anọchite anya ndịda Kano n'oche ANPP n'ọnwa Eprel afọ 2011, ma bụrụkwa sịnetọ ọzọ. [6] Gaya bụ osote onye ụtarị ndị omeiwu ka dị obere n'ọnụ ọgụgụ nke sịnetị site na 2007 ruo 2011. [7] [8] A họputara ya ugboro atọ ịnọchite anya ndịda kano ntuli aka nke afọ 2011, 2015 na 2019.

Ukpono[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Kabiru Gaya dịka osote onye isi nke Inter-Parliamentary Union (IPU) maka Africa na ọgbakọ izugbe nke 135 nke njikọ na Geneva, Switzerland n'ọnwa Ọktoba nke afọ 2016. [1]

Ọ bụ onye otu Nigerian Institute of Architects (NIA) na Nigerian Large Scale Farmers Association (NLSFA). Ndi University of Science And Applied Management, Porto-Novo, Benin nyere ya nzere digiri ugwu. [9] Ọ bụkwa onye otu kọmitii na'ahụ maka ụgbọ mmiri. [10]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 1.2 Sen. Kabiru Ibrahim Gaya. National Assembly of Nigeria. Retrieved on December 18, 2009.
  2. Musa. "NDP Picks Gaya", ThisDay, 2003-01-13. Retrieved on December 18, 2009.
  3. "An Improved Senate, But Some Uninspiring Senators...", AallAfrica, AllAfrica, 24 May 2009. Retrieved on December 18, 2009.
  4. Yusuf. "Successful completion of fed roads obvious --Sen. Kabiru Gaya", Daily Triumph, Triumph Publishing, May 19, 2008. Retrieved on December 18, 2009.
  5. Jaafar. "Will Shekarau Anoint Sheikh Khaleel As Successor?", AllAfrica, AllAfrica, 19 November 2009. Retrieved on December 18, 2009.
  6. Rukkaya Idris Gwarzo (19 April 2011). Before ANPP loses Senator Kabiru Gaya. Nigerian Tribune. Retrieved on 2011-04-22.
  7. SEN. GAYA KABIRU IBRAHIM. The Senate, National Assembly of Nigeria.
  8. Deputy Minority Whip. Haaba.
  9. SEN. KABIRU IBRAHIM GAYA. The Senate Arm of the National Assembly. Archived from the original on 12 December 2012. Retrieved on 9 May 2012.
  10. http://www.premiumtimesng.com/news/170428-gunmen-in-military-uniform-attack-senator-snatch-car.html