Gaa na ọdịnaya

Kanyin Eros

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Kanyinsola Busayo Erog Gideon, A maara ya nke ọma dịka Kanyin Eros, ọ bụ onye na-eme ihe nkiri Naịjirịa na Amerịka a ma ama maka ọrụ ya dịka Liya Hassan na usoro ihe nkiri Journey To Bloom na aha ya bụ Ireti . [1]

Ihe ndị mere n'oge gara aga

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kanyin na Lagos, Naịjirịa. Ọ gara Lagoon Sekọndrị ma nweta nzere bachelọ nke ịwa ahụ ezé na College of Medicine, Mahadum Lagos.

Kanyin gụrụ ime ihe nkiri na Blackbox Acting Studio na Chicago na Chicago Actors Studio. N'afọ 2021, ọ malitere dị ka Caro na Caro-Lina . N'afọ 2022, ọ pụtara dị ka Marjorie Joy na usoro, The Other Wife . N'ọnwa Juun afọ 2024, ọ pụtara na ihe nkiri Muri & Ko [2] nke Biodun Stephen duziri. N'otu afọ ahụ, ọ kpara Liya Hassan na usoro TV Journey To Bloom, na onye isi Ireti, nke onye na-eme ihe nkiri na onye nduzi FESPACO Temi Ami-Williams duziri.[3] Ihe nkiri ahụ, nke dabeere na njem Williams na-eti ọrịa kansa, bụ nke FilmLab Africa mepụtara (nke British Council kwadoro) ma gosipụta ya na Nigerian International Film and TV Summit (NIFS). E gosipụtakwara ya na mbipụta nke iri na atọ nke Africa Intertional Film Festival (AFRIFF) na Nọvemba 2024.[4] Kanyin gosipụtara n'otu ihe omume nke oge nke ise nke usoro ihe ọchị Visa On Arrival . N'ọnwa Disemba afọ 2024, Kanyin pụtara n'egwuregwu High, ọrụ nke abụọ ya nke Williams duziri. Ọ bụ Ade Laoye mepụtara egwuregwu ahụ, nke a maara maka ihe nkiri Netflix nke afọ 2023, The Black Book .

Kanyin Eros enwetala nlebara anya n'ofe mgbasa ozi soshal midia maka usoro monologue The Secret Lives Of Nigerian Women na-akọwapụta ndụ ọtụtụ ụmụ nwanyị Naijiria mara mma gụnyere Chioma Ajunwa, Margret Ekpo, Agbani Darego, Sandra Aguebor Ekperuoh, Funmilayo Ransome-Kuti na Ladi Dosei.[5]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 'Ireti' by Temi Ami-Williams Brings a Powerful Tale of Resilience and Community to AFRIFF 2024 - Nollywire (en-GB) (2024-10-31). Retrieved on 2025-01-27.
  2. Koiki (2024-08-29). Muri & Ko Makes Its Way To Prime Video After N135 Box Office Gross Cinema (en-US). ShockNG. Retrieved on 2025-01-27.
  3. Kanyin Eros | Actress (en-US). IMDb. Retrieved on 2025-01-27.
  4. 'Ireti' by Temi Ami-Williams Brings a Powerful Tale of Resilience and Community to AFRIFF 2024 - Nollywire (en-GB) (2024-10-31). Retrieved on 2025-01-27.
  5. Adegbola. Inside Kanyin Eros' Dramatic Reminder Of The Triumphs Of Nigerian Women (en). www.innollywood.com. Retrieved on 2025-01-27.