Kate Omenugha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kate Azuka Omenugha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Jenụwarị 1965 Dezie
Ebe ọmụmụAnambra Steeti Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jicommissioner Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Mahadum nke Nigeria, University of Gloucestershire Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Kate Azuka Omenugha bu kọmishona nke mmụta isi,Anambra steeti, Nigeria. Amụru Kate na ụbọchị nke iri atọ na ọ nwa jenụwarị na afo 1965.

.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Kate Azuka Omenugha ,onye a mụrụ na ezinụlọ Nwagwu na Ubaha Nnobi, obodo dị na Idemmili South Local Government area, Anambra Steeti Nigeria. Nna ya Chief E. B. Nwagwu bụ onye nkuzi ma ọ tolitere site n'otu ụlọ akwụkwọ gaa na nke ọzọ ka a na-ebufe nna ya n'ihi ya ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na St. Maryãs Primary School, Neni site na afọ 1971rue na afọ 1972, O gukwara akwụkwọ na Girls Practising Skul Adazi Nnukwu site na afọ 1972 rue na afọ 1974. Guzikwa Community and Primary school, Adazi Ani na afọ 1975. Ọ malitere agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Ojiakor Memorial Secondary Skul, Adazi Ani site na afọ 1975 rue na afọ 1976 wee gụchaa ya na Maria Regina Comprehensive Secondary School

Ọ kụziri dị ka onye nkuzi enyemaka na Metuh Secondary School Onitsha na afọ 1980 rue na afọ 1981 tupu ọ banye na College of Education, Nsugbe (nke bụzi Nwafor-Orizu College of Education). N'afọ 1983, ọ nwetara asambodo mba na agụmakwụkwọ site na Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe, Anambra Steeti Nigeria, nzere bachelọ na agụmakmakwụkwọ / Bekee site na Mahadum Naịjirịa n'afọ 1987 na nzere masta na Mass Communication n'afọ 1998 site n'otu mahadum ahụ.[2] O nwekwara PhD na Gender, Media and Cultural Studies n'afo 2005 site na Mahadum Gloucestershire, United Kingdom.[3]

Kate Omenugha jere ozi dị ka onye nkuzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Queen of Rosary College, Onitsha obere oge n'afo 1988 tupu ọ gawaa Girls' Secondary School, Awka Etiti ebe ọ nọrọ afọ iri wee ghọọ osote onye isi tupu ọ banye na usoro Mahadum dị ka onye nkụzi na afọ 1998. Ọ bụ onye isi, Ngalaba Mass Communication, Mahadum Nnamdi Azikiwe site na afọ 2006 rue na afọ 2012. Ọ bụkwa onye isi ntuzi aka UNIZIK 94.1 FM, ụlọ ọrụ redio obodo nke Mahadum ya na-achịkwa.[2] E mere ya Kọmishọna, Ministri nke Mmụta site na afọ 2014 rue na afọ 2018, Anambra Steeti ma ghọọ Kọmishọna nke Mmụta Isi site na afọ 2014 ruo ugbu a n'otu Steeti ahụ.[4] Ọ bụ osote onye isi oche na South East, Association of Communication Scholars and Professionals, Nigeria (ACSPN).[5]

N'okpuru nlekọta ya dị ka onye kọmishọna na Ministry of Education na Anambra Steeti, ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi enwetala ọtụtụ nturu ugo niile sitere na idu ndú ya. Ndị a gụnyere;

  • Ụmụ akwụkwọ nke Regina Pacies Secondary School Onitsha, onye nọchitere anya Naijiria na Africa na World Technovation Challenge na Silicon Valley na San Francisco, wee merie Gold Medal na asọmpi na ọnwa nke asatọ na afọ 2018.)[6]
  • Ụmụ akwụkwọ Ọganihu Global Entrepreneurship (SAGE) asọmpi[7]
  • 2019 Onye isi ala na-enye ndị nkuzi na ụlọ akwụkwọ onyinye maka ịdị mma na agụmakwụkwọ nke gọọmentị etiti haziri site na Ministri Mmụta Federal[8]
  • ọla nchara na Tunisia na asọmpi sayensị na teknụzụ Afrịka (IFES)[9][10]
  • Ọnọdụ nke mbụ, nke abụọ, nke atọ na nke anọ na asompi edemede nke etítì obodo ana-kpo National [11]
  • Òtù Ndị Nkụzi Sayensị nke Nigeria (STAN) asọmpi oru ngo[12]

Kate Omenugha lụrụ Dr. Michael Omenugha, onye dọkịta onwe, onye si Umuru Ebenesi, Nnobi. Ha nwere ụmụ isii.[13]

Akwụkwọ ndị e bipụtara[dezie | dezie ebe o si]

  1. Anambra Basic Education Commissioner Omenugha Seeks Collaborations To Elevate Education To Enviable Heights (en-US). Heartbeat Of The East. Retrieved on 2020-05-26.
  2. 2.0 2.1 Students (2014-04-24). Prof. Kate Azuka Omenugha appointed Commissioner for Education in Anambra (en-CA). Students Nigeria. Archived from the original on 2014-04-26. Retrieved on 2020-05-26.
  3. Prof Kate Omenugha (Sponsor, Arm Our Youths Campaign, Anambra) (en-AU). Retrieved on 2020-05-26.
  4. Don appointed Anambra Commissioner for Education (en-US). Vanguard News (2014-04-23). Retrieved on 2020-05-26.
  5. Prof. Kate Omenugha, Vice President - South East (en-US). ACSPN. Retrieved on 2020-05-26.
  6. Anambra girls hit gold at World Technovation challenge (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2018-08-11). Retrieved on 2020-05-26.
  7. Anambra State Government - Light Of The Nation. anambrastate.gov.ng. Archived from the original on 2020-07-25. Retrieved on 2020-05-26.
  8. Anambra wins 4 national awards in education (en-US). The Sun Nigeria (2019-10-07). Retrieved on 2020-05-26.
  9. Anambra wins 4 national awards in education (en-US). The Sun Nigeria (2019-10-07). Retrieved on 2020-05-26.
  10. Anambra pupils win global prizes wave in technical education (en-US). National Light (2019-04-04). Archived from the original on 2021-05-04. Retrieved on 2020-05-26.
  11. Anambra Students Wins 1st, 2nd, 3rd & 4th Positions In a National Essay Competition (en). myschool.ng. Retrieved on 2020-05-26.
  12. Two Anambra students win STAN exhibition (en-US). Heartbeat Of The East. Retrieved on 2020-05-26.
  13. Prof. Kate Azuka Omenugha – The Hon Commissioner for Education, Anambra State (en-US). Nextzon Business Services Limited (2018-03-08). Retrieved on 2020-05-30.
  14. Prof. Kate Azuka Omenugha – The Hon Commissioner for Education, Anambra State (en-US). Nextzon Business Services Limited (2018-03-08). Retrieved on 2020-05-30.

Family[dezie | dezie ebe o si]

Ezinụlọ

Omenugha lụrụ Dr. Michael Omenugha, onye ahụ ike nnoro onwe si Umuru Ebenesi, Nnobi.

Ha nwere ụmụ isii. [1]

  1. Prof. Kate Azuka Omenugha – The Hon Commissioner for Education, Anambra State (en-US). Nextzon Business Services Limited (2018-03-08). Retrieved on 2020-05-30.